Genesis 32 (BOICB)

1 Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ. 2 Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim. 3 Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm. 4 O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a. 5 Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ” 6 Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.” 7 Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya. 8 O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.” 9 Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, ONYENWE ANYỊ, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’ 10 Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ. 11 Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha. 12 Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ” 13 Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ. 14 Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20) 15 Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10). 16 O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.” 17 O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’ 18 Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’ ” 19 Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya. 20 Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’ ” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.” 21 Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ. 22 Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha. 23 Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere. 24 Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ. 25 Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya. 26 Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.”Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.” 27 Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?”Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.” 28 Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.” 29 Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.”Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ. 30 Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.” 31 Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije. 32 Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.

In Other Versions

Genesis 32 in the ANGEFD

Genesis 32 in the ANTPNG2D

Genesis 32 in the AS21

Genesis 32 in the BAGH

Genesis 32 in the BBPNG

Genesis 32 in the BBT1E

Genesis 32 in the BDS

Genesis 32 in the BEV

Genesis 32 in the BHAD

Genesis 32 in the BIB

Genesis 32 in the BLPT

Genesis 32 in the BNT

Genesis 32 in the BNTABOOT

Genesis 32 in the BNTLV

Genesis 32 in the BOATCB

Genesis 32 in the BOATCB2

Genesis 32 in the BOBCV

Genesis 32 in the BOCNT

Genesis 32 in the BOECS

Genesis 32 in the BOGWICC

Genesis 32 in the BOHCB

Genesis 32 in the BOHCV

Genesis 32 in the BOHLNT

Genesis 32 in the BOHNTLTAL

Genesis 32 in the BOILNTAP

Genesis 32 in the BOITCV

Genesis 32 in the BOKCV

Genesis 32 in the BOKCV2

Genesis 32 in the BOKHWOG

Genesis 32 in the BOKSSV

Genesis 32 in the BOLCB

Genesis 32 in the BOLCB2

Genesis 32 in the BOMCV

Genesis 32 in the BONAV

Genesis 32 in the BONCB

Genesis 32 in the BONLT

Genesis 32 in the BONUT2

Genesis 32 in the BOPLNT

Genesis 32 in the BOSCB

Genesis 32 in the BOSNC

Genesis 32 in the BOTLNT

Genesis 32 in the BOVCB

Genesis 32 in the BOYCB

Genesis 32 in the BPBB

Genesis 32 in the BPH

Genesis 32 in the BSB

Genesis 32 in the CCB

Genesis 32 in the CUV

Genesis 32 in the CUVS

Genesis 32 in the DBT

Genesis 32 in the DGDNT

Genesis 32 in the DHNT

Genesis 32 in the DNT

Genesis 32 in the ELBE

Genesis 32 in the EMTV

Genesis 32 in the ESV

Genesis 32 in the FBV

Genesis 32 in the FEB

Genesis 32 in the GGMNT

Genesis 32 in the GNT

Genesis 32 in the HARY

Genesis 32 in the HNT

Genesis 32 in the IRVA

Genesis 32 in the IRVB

Genesis 32 in the IRVG

Genesis 32 in the IRVH

Genesis 32 in the IRVK

Genesis 32 in the IRVM

Genesis 32 in the IRVM2

Genesis 32 in the IRVO

Genesis 32 in the IRVP

Genesis 32 in the IRVT

Genesis 32 in the IRVT2

Genesis 32 in the IRVU

Genesis 32 in the ISVN

Genesis 32 in the JSNT

Genesis 32 in the KAPI

Genesis 32 in the KBT1ETNIK

Genesis 32 in the KBV

Genesis 32 in the KJV

Genesis 32 in the KNFD

Genesis 32 in the LBA

Genesis 32 in the LBLA

Genesis 32 in the LNT

Genesis 32 in the LSV

Genesis 32 in the MAAL

Genesis 32 in the MBV

Genesis 32 in the MBV2

Genesis 32 in the MHNT

Genesis 32 in the MKNFD

Genesis 32 in the MNG

Genesis 32 in the MNT

Genesis 32 in the MNT2

Genesis 32 in the MRS1T

Genesis 32 in the NAA

Genesis 32 in the NASB

Genesis 32 in the NBLA

Genesis 32 in the NBS

Genesis 32 in the NBVTP

Genesis 32 in the NET2

Genesis 32 in the NIV11

Genesis 32 in the NNT

Genesis 32 in the NNT2

Genesis 32 in the NNT3

Genesis 32 in the PDDPT

Genesis 32 in the PFNT

Genesis 32 in the RMNT

Genesis 32 in the SBIAS

Genesis 32 in the SBIBS

Genesis 32 in the SBIBS2

Genesis 32 in the SBICS

Genesis 32 in the SBIDS

Genesis 32 in the SBIGS

Genesis 32 in the SBIHS

Genesis 32 in the SBIIS

Genesis 32 in the SBIIS2

Genesis 32 in the SBIIS3

Genesis 32 in the SBIKS

Genesis 32 in the SBIKS2

Genesis 32 in the SBIMS

Genesis 32 in the SBIOS

Genesis 32 in the SBIPS

Genesis 32 in the SBISS

Genesis 32 in the SBITS

Genesis 32 in the SBITS2

Genesis 32 in the SBITS3

Genesis 32 in the SBITS4

Genesis 32 in the SBIUS

Genesis 32 in the SBIVS

Genesis 32 in the SBT

Genesis 32 in the SBT1E

Genesis 32 in the SCHL

Genesis 32 in the SNT

Genesis 32 in the SUSU

Genesis 32 in the SUSU2

Genesis 32 in the SYNO

Genesis 32 in the TBIAOTANT

Genesis 32 in the TBT1E

Genesis 32 in the TBT1E2

Genesis 32 in the TFTIP

Genesis 32 in the TFTU

Genesis 32 in the TGNTATF3T

Genesis 32 in the THAI

Genesis 32 in the TNFD

Genesis 32 in the TNT

Genesis 32 in the TNTIK

Genesis 32 in the TNTIL

Genesis 32 in the TNTIN

Genesis 32 in the TNTIP

Genesis 32 in the TNTIZ

Genesis 32 in the TOMA

Genesis 32 in the TTENT

Genesis 32 in the UBG

Genesis 32 in the UGV

Genesis 32 in the UGV2

Genesis 32 in the UGV3

Genesis 32 in the VBL

Genesis 32 in the VDCC

Genesis 32 in the YALU

Genesis 32 in the YAPE

Genesis 32 in the YBVTP

Genesis 32 in the ZBP