Genesis 43 (BOICB)

1 Ma ụnwụ a siri oke ike nʼala ahụ nʼoge a. 2 O ruo, mgbe ha richara nri ha zụtara nʼIjipt, nna ha gwara ha sị, “Jeghachinụ, zụtara anyị ntakịrị nri.” 3 Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’ 4 Ọ bụrụ na ị ga-edunyere anyị nwanne anyị, anyị ga-agbada gaa zụtara gị nri. 5 Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ” 6 Mgbe ahụ Izrel sịrị, “Gịnị mere unu ji wetara m nsogbu dị otu a, site nʼịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ.” 7 Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.” 8 Mgbe ahụ, Juda sịrị nna ya Izrel, “Dunye m nwantakịrị a ka anyị bilie gawa, ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ, ma anyị onwe anyị, ma gị, ma ụmụntakịrị anyị. 9 Aga m eji onwe m gbaa ebe nʼihi ya. I nwere ike itife ya nʼaka m. Ọ bụrụ na m akpọtaghachighị ya, kpọbata ya nʼihu gị, mgbe ahụ, ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị, nʼụbọchị ndụ m niile. 10 A sị nnọọ na anyị egbughị oge niile a, anyị gaara aga ma lọtakwarị ugboro abụọ.” 11 Mgbe ahụ nna ha Izrel gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-adịrịrị otu a, gịnị ọzọ ka anyị ga-eme. Kama mgbe unu na-aga, werenụ nʼakpa unu onyinye ịnata ihuọma nke bụ ihe niile kachasị mma nke si nʼala a welaara nwoke a. Werenụ nwantịntị mmanụ otite, na nwantịntị mmanụ aṅụ, ha na ụda dị iche iche, na eso osisi máá, na akụ, na alụmọnd. 12 Werekwanụ ego okpukpu abụọ nʼaka unu. Weghachirinụ ya ego ahụ e tinyere nʼọnụ akpa unu, eleghị anya ọ bụ nʼohihie anya ka ha ji tinye ya. 13 Ngwa, kpọrọnụ nwanne unu nwoke bilienụ laghachikwurunụ nwoke ahụ. 14 Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, mee ka nwoke ahụ nwee obi ebere nʼebe unu nọ. Ya meekwa ka o nwee ike ịhapụrụ unu nwanne unu Simiọn na Benjamin ka ha soro unu lọta. Ọ bụrụkwanụ uche Chineke na m ga-agbara aka ụmụ, ya mee dịka o si chọọ.” 15 Ya mere, ndị ikom ahụ weere onyinye ndị a, na okpukpu ego abụọ nʼaka, ma kpọrọkwa Benjamin. Ha biliri ije. Garuo Ijipt, ma guzo nʼihu Josef. 16 Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.” 17 Odibo a mere dịka Josef ziri ya. O duuru ndị ikom ndị ahụ gaa nʼụlọ Josef. 18 Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.” 19 Ha bịaruru odibo Josef ahụ nso gwa ya okwu nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ. 20 Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, anyị bịara ebe a nʼoge mbụ ịzụ ihe oriri. 21 Ma, mgbe anyị rutere ebe anyị nọrọ ọnọdụ abalị, anyị meghere akpa anyị, chọpụta ego anyị kwụrụ nʼihi nri ahụ anyị zụrụ ka ọ dị nʼọnụ akpa anyị nʼotu na otu. E sepụkwaghị ya ihe ọ bụla. Ya mere, anyị weghachiri ya nʼoge a. 22 Anyị jikwa ego ọzọ anyị ga-eji zụọ ihe oriri. Ma anyị amaghị onye tinyere ego ahụ nʼime akpa anyị.” 23 Odibo ahụ zara sị ha, “Udo dịrị unu, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu, na Chineke nna unu enyela unu akụ zoro ezo nʼime akpa unu. Ego unu kwụrụ ruru m aka.” Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ha gaa kpọpụta Simiọn. 24 Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri. 25 Mgbe ahụ, ụmụ Jekọb kwadoro onyinye ịnata ihuọma ha ji bịa, nke ha ga-enye Josef ma ọ bata nʼetiti ehihie, nʼihi na ha anụla na ha ga-eri nri nʼebe ahụ. 26 Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya. 27 Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.” 28 Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya. 29 Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.” 30 Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa. 31 Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ. 32 Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ. 33 Ma mgbe e nyere ha ọnọdụ nʼihu Josef, e mere ka ha nọdụ dịka ha si tọọ ibe ha. Nke ọkpara buru ụzọ nọdụ, onye na-eso ya anọdụkwa. Otu a ka ha niile siri nọdụ ruo nʼonye ikpeazụ nʼime ha. Ha lerịtara onwe ha anya nʼihi na o juru ha anya. 34 O sitekwara na nri e doziri ya nyebinye ha nri. Nri e nyere Benjamin dị ukwuu okpukpu ise karịa nri nke e nyere ha niile. Ha na ya riri, ṅụọkwa nʼuju.

In Other Versions

Genesis 43 in the ANGEFD

Genesis 43 in the ANTPNG2D

Genesis 43 in the AS21

Genesis 43 in the BAGH

Genesis 43 in the BBPNG

Genesis 43 in the BBT1E

Genesis 43 in the BDS

Genesis 43 in the BEV

Genesis 43 in the BHAD

Genesis 43 in the BIB

Genesis 43 in the BLPT

Genesis 43 in the BNT

Genesis 43 in the BNTABOOT

Genesis 43 in the BNTLV

Genesis 43 in the BOATCB

Genesis 43 in the BOATCB2

Genesis 43 in the BOBCV

Genesis 43 in the BOCNT

Genesis 43 in the BOECS

Genesis 43 in the BOGWICC

Genesis 43 in the BOHCB

Genesis 43 in the BOHCV

Genesis 43 in the BOHLNT

Genesis 43 in the BOHNTLTAL

Genesis 43 in the BOILNTAP

Genesis 43 in the BOITCV

Genesis 43 in the BOKCV

Genesis 43 in the BOKCV2

Genesis 43 in the BOKHWOG

Genesis 43 in the BOKSSV

Genesis 43 in the BOLCB

Genesis 43 in the BOLCB2

Genesis 43 in the BOMCV

Genesis 43 in the BONAV

Genesis 43 in the BONCB

Genesis 43 in the BONLT

Genesis 43 in the BONUT2

Genesis 43 in the BOPLNT

Genesis 43 in the BOSCB

Genesis 43 in the BOSNC

Genesis 43 in the BOTLNT

Genesis 43 in the BOVCB

Genesis 43 in the BOYCB

Genesis 43 in the BPBB

Genesis 43 in the BPH

Genesis 43 in the BSB

Genesis 43 in the CCB

Genesis 43 in the CUV

Genesis 43 in the CUVS

Genesis 43 in the DBT

Genesis 43 in the DGDNT

Genesis 43 in the DHNT

Genesis 43 in the DNT

Genesis 43 in the ELBE

Genesis 43 in the EMTV

Genesis 43 in the ESV

Genesis 43 in the FBV

Genesis 43 in the FEB

Genesis 43 in the GGMNT

Genesis 43 in the GNT

Genesis 43 in the HARY

Genesis 43 in the HNT

Genesis 43 in the IRVA

Genesis 43 in the IRVB

Genesis 43 in the IRVG

Genesis 43 in the IRVH

Genesis 43 in the IRVK

Genesis 43 in the IRVM

Genesis 43 in the IRVM2

Genesis 43 in the IRVO

Genesis 43 in the IRVP

Genesis 43 in the IRVT

Genesis 43 in the IRVT2

Genesis 43 in the IRVU

Genesis 43 in the ISVN

Genesis 43 in the JSNT

Genesis 43 in the KAPI

Genesis 43 in the KBT1ETNIK

Genesis 43 in the KBV

Genesis 43 in the KJV

Genesis 43 in the KNFD

Genesis 43 in the LBA

Genesis 43 in the LBLA

Genesis 43 in the LNT

Genesis 43 in the LSV

Genesis 43 in the MAAL

Genesis 43 in the MBV

Genesis 43 in the MBV2

Genesis 43 in the MHNT

Genesis 43 in the MKNFD

Genesis 43 in the MNG

Genesis 43 in the MNT

Genesis 43 in the MNT2

Genesis 43 in the MRS1T

Genesis 43 in the NAA

Genesis 43 in the NASB

Genesis 43 in the NBLA

Genesis 43 in the NBS

Genesis 43 in the NBVTP

Genesis 43 in the NET2

Genesis 43 in the NIV11

Genesis 43 in the NNT

Genesis 43 in the NNT2

Genesis 43 in the NNT3

Genesis 43 in the PDDPT

Genesis 43 in the PFNT

Genesis 43 in the RMNT

Genesis 43 in the SBIAS

Genesis 43 in the SBIBS

Genesis 43 in the SBIBS2

Genesis 43 in the SBICS

Genesis 43 in the SBIDS

Genesis 43 in the SBIGS

Genesis 43 in the SBIHS

Genesis 43 in the SBIIS

Genesis 43 in the SBIIS2

Genesis 43 in the SBIIS3

Genesis 43 in the SBIKS

Genesis 43 in the SBIKS2

Genesis 43 in the SBIMS

Genesis 43 in the SBIOS

Genesis 43 in the SBIPS

Genesis 43 in the SBISS

Genesis 43 in the SBITS

Genesis 43 in the SBITS2

Genesis 43 in the SBITS3

Genesis 43 in the SBITS4

Genesis 43 in the SBIUS

Genesis 43 in the SBIVS

Genesis 43 in the SBT

Genesis 43 in the SBT1E

Genesis 43 in the SCHL

Genesis 43 in the SNT

Genesis 43 in the SUSU

Genesis 43 in the SUSU2

Genesis 43 in the SYNO

Genesis 43 in the TBIAOTANT

Genesis 43 in the TBT1E

Genesis 43 in the TBT1E2

Genesis 43 in the TFTIP

Genesis 43 in the TFTU

Genesis 43 in the TGNTATF3T

Genesis 43 in the THAI

Genesis 43 in the TNFD

Genesis 43 in the TNT

Genesis 43 in the TNTIK

Genesis 43 in the TNTIL

Genesis 43 in the TNTIN

Genesis 43 in the TNTIP

Genesis 43 in the TNTIZ

Genesis 43 in the TOMA

Genesis 43 in the TTENT

Genesis 43 in the UBG

Genesis 43 in the UGV

Genesis 43 in the UGV2

Genesis 43 in the UGV3

Genesis 43 in the VBL

Genesis 43 in the VDCC

Genesis 43 in the YALU

Genesis 43 in the YAPE

Genesis 43 in the YBVTP

Genesis 43 in the ZBP