Genesis 44 (BOICB)

1 Mgbe ahụ Josef nyere odibo nọ nʼụlọ ya iwu sị, “Gbajuo akpa ndị ikom ndị a nri. Tinyere ha nri nke onye ọbụla nʼime ha nwere ike ibu, tinyekwa ego nke onye ọbụla nʼime ha kwụrụ nʼọnụ akpa ya. 2 Ma tinye iko ọlaọcha m nʼime ọnụ akpa onye nke nta nʼime ha. Tinyekwa ego ọ kwụrụ nʼihi nri ọ zụrụ nʼime akpa ya.” Odibo a mere dịka Josef gwara ya. 3 Mgbe chi bọrọ, ha zipụrụ ndị ikom ndị a, ha na ịnyịnya ibu ha. 4 Mgbe ha ji naanị ihe nta gafee obodo ahụ, Josef gwara odibo ya sị, “Bilie, chụso ndị ikom ndị ahụ ọsọ. I zute ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji were ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọma? 5 Gịnị mere unu ji zuru iko ọlaọcha nna m ukwu, iko o ji aṅụ ihe ọṅụṅụ na nke o ji ajụ ase? Unu emeela ihe ọjọọ nʼihi ihe a unu mere.’ ” 6 Mgbe odibo ahụ zutere ha, ọ gwara ha ihe ndị a. 7 Ma ha zara sị ya, “Nna anyị ukwu, gịnị mere i ji ekwu ụdị okwu ndị a? Ihe arụ ka ọ bụ anyị ime ihe dị otu a. 8 Lee, ego anyị chọtara nʼọnụ akpa anyị ka anyị sitere nʼala Kenan weghachi. Olee otu anyị ga-esi zuru ọlaedo maọbụ ọlaọcha site nʼụlọ nna gị ukwu? 9 Onye ọbụla nʼime anyị a chọtara iko a nʼaka ya ga-anwụ. Anyị onwe anyị ga-aghọrọ nna anyị ukwu ndị ohu.” 10 Odibo ahụ zara sị ha, “Ka ọ dịrị dịka unu kwuru. Onye ọbụla a chọtara ya nʼaka ga-abụ ohu m. Ma ndị a na-achọtaghị ya nʼaka ha enweghị ịta ụta ọbụla.” 11 Ha mere ngwangwa, onye ọbụla tọdatara akpa ya. Onye ọbụla kwa meghere akpa ya. 12 Odibo ahụ malitere nʼonye ukwu nʼetiti ha chọọ rute nʼonye nta. Ọ bụ nʼakpa Benjamin ka a chọtara iko ahụ. 13 Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta. 14 Mgbe Juda na ụmụnne ya lọghachiri nʼụlọ Josef, ha hụrụ Josef ka ọ nọ nʼebe ahụ. Ha dara nʼala nʼihu ya. 15 Ma Josef jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe a unu mere? Ọ bụ na unu amataghị na onye dịka m nwere ike ịmata onye zuru iko m?” 16 Ya mere Juda sị ya, “Gịnị ka anyị ga-ekwu? Olee otu anyị ga-esi gosi nʼaka anyị dị ọcha? Chineke ekpugheela ikpe ọmụma ndị ohu gị. Lee, anyị bụkwa ndị ohu onyenwe m. Anyị onwe anyị, tinyekwara onye a chọtara iko ahụ nʼaka ya.” 17 Ma Josef sịrị, “Ọ ga-abụrụ m ajọ omume ime ihe dị otu ahụ. Naanị nwoke ahụ a chọpụtara iko ahụ nʼakpa ya bụ onye ga-abụ ohu m. Ma unu onwe unu nwere ike laa nʼudo jekwuru nna unu nʼudo.” 18 Juda jekwuuru ya, sị, “Biko, onyenwe m, kwere ka ohu gị gwa gị okwu. Ewesola mụ bụ ohu gị iwe nʼihi na ị nọ ọnọdụ dị ka Fero. 19 Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’ 20 Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’ 21 “Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’ 22 Ma anyị gwara onyenwe m sị na ‘Nwata a apụghị ịhapụ nna ya, nʼihi na nna ya ga-anwụ ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya.’ 23 Ma ị gwara ndị ohu gị sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m anya ọzọ, ma ọ bụrụ na nwanne unu a esoghị unu gbadata.’ 24 Mgbe anyị lakwuuru ohu gị bụ nna anyị, anyị gwara ya okwu onyenwe m kwuru. 25 “Mgbe nna anyị gwara anyị sị, ‘Laghachi gaa zụta nri,’ 26 anyị gwara ya na, ‘Anyị agaghị agbada ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta agaghị eso anyị. Nʼihi na anyị enweghị ike ịhụ nwoke ahụ anya, ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta esoghị anyị.’ 27 “Oge ahụ, ohu gị bụ nna anyị sịrị anyị, ‘Unu maara na nwunye m mụụrụ m ụmụ nwoke abụọ. 28 Otu nʼime ha funarịrị m, mgbe anụ ọhịa dọkasịrị ya iperipe na iperipe. Ruo ugbu a, ahụbeghị m ya anya. 29 Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’ 30 “Ya mere, ọ bụrụ na m alaghachikwute ohu gị, bụ nna anyị, ma nwantakịrị a esoghị anyị, ebe ọ bụ na e kekọtara ndụ nna anyị na ndụ nwantakịrị a, 31 mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ. 32 Biko, onyenwe m, eji m ndụ m zọọrọ nna m ebe na m ga-elezi nwantakịrị a anya. Asị m ya, ‘Ọ bụrụ na m akpọghachighị nwantakịrị a nye gị, ka ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị bụ nna m nʼụbọchị niile nke ndu m.’ 33 “Ya mere ugbu a, biko, ka ohu gị nọdụ dịka ohu onyenwe m nʼọnọdụ nwantakịrị a, ka nwantakịrị a soro ụmụnne ya laghachikwuru nna anyị. 34 Aga m esi aṅaa laghachikwuru nna m ma ọ bụrụ na mụ na nwantakịrị a esoghị? Enweghị m ike ilekwasị ihe ọjọọ ga-adakwasị nna m anya.”

In Other Versions

Genesis 44 in the ANGEFD

Genesis 44 in the ANTPNG2D

Genesis 44 in the AS21

Genesis 44 in the BAGH

Genesis 44 in the BBPNG

Genesis 44 in the BBT1E

Genesis 44 in the BDS

Genesis 44 in the BEV

Genesis 44 in the BHAD

Genesis 44 in the BIB

Genesis 44 in the BLPT

Genesis 44 in the BNT

Genesis 44 in the BNTABOOT

Genesis 44 in the BNTLV

Genesis 44 in the BOATCB

Genesis 44 in the BOATCB2

Genesis 44 in the BOBCV

Genesis 44 in the BOCNT

Genesis 44 in the BOECS

Genesis 44 in the BOGWICC

Genesis 44 in the BOHCB

Genesis 44 in the BOHCV

Genesis 44 in the BOHLNT

Genesis 44 in the BOHNTLTAL

Genesis 44 in the BOILNTAP

Genesis 44 in the BOITCV

Genesis 44 in the BOKCV

Genesis 44 in the BOKCV2

Genesis 44 in the BOKHWOG

Genesis 44 in the BOKSSV

Genesis 44 in the BOLCB

Genesis 44 in the BOLCB2

Genesis 44 in the BOMCV

Genesis 44 in the BONAV

Genesis 44 in the BONCB

Genesis 44 in the BONLT

Genesis 44 in the BONUT2

Genesis 44 in the BOPLNT

Genesis 44 in the BOSCB

Genesis 44 in the BOSNC

Genesis 44 in the BOTLNT

Genesis 44 in the BOVCB

Genesis 44 in the BOYCB

Genesis 44 in the BPBB

Genesis 44 in the BPH

Genesis 44 in the BSB

Genesis 44 in the CCB

Genesis 44 in the CUV

Genesis 44 in the CUVS

Genesis 44 in the DBT

Genesis 44 in the DGDNT

Genesis 44 in the DHNT

Genesis 44 in the DNT

Genesis 44 in the ELBE

Genesis 44 in the EMTV

Genesis 44 in the ESV

Genesis 44 in the FBV

Genesis 44 in the FEB

Genesis 44 in the GGMNT

Genesis 44 in the GNT

Genesis 44 in the HARY

Genesis 44 in the HNT

Genesis 44 in the IRVA

Genesis 44 in the IRVB

Genesis 44 in the IRVG

Genesis 44 in the IRVH

Genesis 44 in the IRVK

Genesis 44 in the IRVM

Genesis 44 in the IRVM2

Genesis 44 in the IRVO

Genesis 44 in the IRVP

Genesis 44 in the IRVT

Genesis 44 in the IRVT2

Genesis 44 in the IRVU

Genesis 44 in the ISVN

Genesis 44 in the JSNT

Genesis 44 in the KAPI

Genesis 44 in the KBT1ETNIK

Genesis 44 in the KBV

Genesis 44 in the KJV

Genesis 44 in the KNFD

Genesis 44 in the LBA

Genesis 44 in the LBLA

Genesis 44 in the LNT

Genesis 44 in the LSV

Genesis 44 in the MAAL

Genesis 44 in the MBV

Genesis 44 in the MBV2

Genesis 44 in the MHNT

Genesis 44 in the MKNFD

Genesis 44 in the MNG

Genesis 44 in the MNT

Genesis 44 in the MNT2

Genesis 44 in the MRS1T

Genesis 44 in the NAA

Genesis 44 in the NASB

Genesis 44 in the NBLA

Genesis 44 in the NBS

Genesis 44 in the NBVTP

Genesis 44 in the NET2

Genesis 44 in the NIV11

Genesis 44 in the NNT

Genesis 44 in the NNT2

Genesis 44 in the NNT3

Genesis 44 in the PDDPT

Genesis 44 in the PFNT

Genesis 44 in the RMNT

Genesis 44 in the SBIAS

Genesis 44 in the SBIBS

Genesis 44 in the SBIBS2

Genesis 44 in the SBICS

Genesis 44 in the SBIDS

Genesis 44 in the SBIGS

Genesis 44 in the SBIHS

Genesis 44 in the SBIIS

Genesis 44 in the SBIIS2

Genesis 44 in the SBIIS3

Genesis 44 in the SBIKS

Genesis 44 in the SBIKS2

Genesis 44 in the SBIMS

Genesis 44 in the SBIOS

Genesis 44 in the SBIPS

Genesis 44 in the SBISS

Genesis 44 in the SBITS

Genesis 44 in the SBITS2

Genesis 44 in the SBITS3

Genesis 44 in the SBITS4

Genesis 44 in the SBIUS

Genesis 44 in the SBIVS

Genesis 44 in the SBT

Genesis 44 in the SBT1E

Genesis 44 in the SCHL

Genesis 44 in the SNT

Genesis 44 in the SUSU

Genesis 44 in the SUSU2

Genesis 44 in the SYNO

Genesis 44 in the TBIAOTANT

Genesis 44 in the TBT1E

Genesis 44 in the TBT1E2

Genesis 44 in the TFTIP

Genesis 44 in the TFTU

Genesis 44 in the TGNTATF3T

Genesis 44 in the THAI

Genesis 44 in the TNFD

Genesis 44 in the TNT

Genesis 44 in the TNTIK

Genesis 44 in the TNTIL

Genesis 44 in the TNTIN

Genesis 44 in the TNTIP

Genesis 44 in the TNTIZ

Genesis 44 in the TOMA

Genesis 44 in the TTENT

Genesis 44 in the UBG

Genesis 44 in the UGV

Genesis 44 in the UGV2

Genesis 44 in the UGV3

Genesis 44 in the VBL

Genesis 44 in the VDCC

Genesis 44 in the YALU

Genesis 44 in the YAPE

Genesis 44 in the YBVTP

Genesis 44 in the ZBP