Genesis 48 (BOICB)
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, a gwara Josef sị, “Lee nna gị na-arịa ọrịa.” Josef biliri duru ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Manase na Ifrem gawa ileta ya. 2 Mgbe a gwara Jekọb okwu sị ya, “Nwa gị nwoke Josef abịala ileta gị.” Izrel chịkọtara ume ya, jisie ike, nọdụ ala nʼelu akwa ya. 3 Mgbe ahụ, Jekọb sịrị Josef, “Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile gosiri m onwe ya na Luz, nʼala Kenan, ma gọziekwa m. 4 Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’ 5 “Ugbu a, ana m eme ụmụ gị ndị ikom abụọ ndị a, ndị a mụtaara gị nʼala Ijipt, ụmụ nke m. Ha abụọ, Ifrem na Manase, ga-abụ ụmụ m, dịka Ruben na Simiọn si bụrụ ụmụ m. 6 Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha. 7 Ana m eme nke a nʼihi na mgbe m si Padan Aram pụta, nne unu Rechel, nwụrụ nʼala Kenan mgbe anyị ka nọ nʼụzọ ije anyị nʼebe dịtụ anya site na Efrat. Nʼakụkụ ụzọ e si aga Efrat, ya bụ Betlehem, ka m likwara ya.” 8 Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?” 9 Josef zara nna ya sị, “Ha bụ ụmụ ndị ikom ndị Chineke nyere m nʼebe a.”Ya mere, Jekọb gwara ya sị, “Kpọtara m ha, ka m gọzie ha.” 10 Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha. 11 Izrel sịrị Josef, “O nweghị mgbe m lere anya na m ga-ahụ ihu gị ọzọ. Ma Chineke emeela ka m hụkwa ụmụ gị.” 12 Josef sitere nʼikpere Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a. 13 Josef kpọọrọ ha abụọ, Ifrem nʼaka nri ya nke bụ aka ekpe Izrel, na Manase nʼaka ekpe ya nke bụ aka nri Izrel, kpọta ha bịa nna ya nso. 14 Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara. 15 Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya.“Ka Chineke, onye nna m haEbraham na Aịzik jere ije nʼihu yaChineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụogologo ndụ m niile ruo taa, 16 Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile,ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a.Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha mna aha nna m ha Ebraham na Aịzik,ka ha mụbaahie nne nʼelu ụwa.” 17 O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase. 18 Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.” 19 Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.” 20 Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị,“Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a,‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ”Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase. 21 Mgbe ahụ, Izrel gwara Josef okwu sị ya, “Lee, mụ onwe m na-aga ịnwụ. Ma Chineke ga-anọnyere unu, kpọghachikwa unu azụ nʼala nna unu ha. 22 Mụ onwe m na-enye gị otu akụkụ ugwu karịa nke ụmụnne gị, bụ ala ugwu ahụ m sitere na mma agha m na ụta m napụta ndị Amọrait ka ọ bụrụ nke gị.”
In Other Versions
Genesis 48 in the ANGEFD
Genesis 48 in the ANTPNG2D
Genesis 48 in the AS21
Genesis 48 in the BAGH
Genesis 48 in the BBPNG
Genesis 48 in the BBT1E
Genesis 48 in the BDS
Genesis 48 in the BEV
Genesis 48 in the BHAD
Genesis 48 in the BIB
Genesis 48 in the BLPT
Genesis 48 in the BNT
Genesis 48 in the BNTABOOT
Genesis 48 in the BNTLV
Genesis 48 in the BOATCB
Genesis 48 in the BOATCB2
Genesis 48 in the BOBCV
Genesis 48 in the BOCNT
Genesis 48 in the BOECS
Genesis 48 in the BOGWICC
Genesis 48 in the BOHCB
Genesis 48 in the BOHCV
Genesis 48 in the BOHLNT
Genesis 48 in the BOHNTLTAL
Genesis 48 in the BOILNTAP
Genesis 48 in the BOITCV
Genesis 48 in the BOKCV
Genesis 48 in the BOKCV2
Genesis 48 in the BOKHWOG
Genesis 48 in the BOKSSV
Genesis 48 in the BOLCB
Genesis 48 in the BOLCB2
Genesis 48 in the BOMCV
Genesis 48 in the BONAV
Genesis 48 in the BONCB
Genesis 48 in the BONLT
Genesis 48 in the BONUT2
Genesis 48 in the BOPLNT
Genesis 48 in the BOSCB
Genesis 48 in the BOSNC
Genesis 48 in the BOTLNT
Genesis 48 in the BOVCB
Genesis 48 in the BOYCB
Genesis 48 in the BPBB
Genesis 48 in the BPH
Genesis 48 in the BSB
Genesis 48 in the CCB
Genesis 48 in the CUV
Genesis 48 in the CUVS
Genesis 48 in the DBT
Genesis 48 in the DGDNT
Genesis 48 in the DHNT
Genesis 48 in the DNT
Genesis 48 in the ELBE
Genesis 48 in the EMTV
Genesis 48 in the ESV
Genesis 48 in the FBV
Genesis 48 in the FEB
Genesis 48 in the GGMNT
Genesis 48 in the GNT
Genesis 48 in the HARY
Genesis 48 in the HNT
Genesis 48 in the IRVA
Genesis 48 in the IRVB
Genesis 48 in the IRVG
Genesis 48 in the IRVH
Genesis 48 in the IRVK
Genesis 48 in the IRVM
Genesis 48 in the IRVM2
Genesis 48 in the IRVO
Genesis 48 in the IRVP
Genesis 48 in the IRVT
Genesis 48 in the IRVT2
Genesis 48 in the IRVU
Genesis 48 in the ISVN
Genesis 48 in the JSNT
Genesis 48 in the KAPI
Genesis 48 in the KBT1ETNIK
Genesis 48 in the KBV
Genesis 48 in the KJV
Genesis 48 in the KNFD
Genesis 48 in the LBA
Genesis 48 in the LBLA
Genesis 48 in the LNT
Genesis 48 in the LSV
Genesis 48 in the MAAL
Genesis 48 in the MBV
Genesis 48 in the MBV2
Genesis 48 in the MHNT
Genesis 48 in the MKNFD
Genesis 48 in the MNG
Genesis 48 in the MNT
Genesis 48 in the MNT2
Genesis 48 in the MRS1T
Genesis 48 in the NAA
Genesis 48 in the NASB
Genesis 48 in the NBLA
Genesis 48 in the NBS
Genesis 48 in the NBVTP
Genesis 48 in the NET2
Genesis 48 in the NIV11
Genesis 48 in the NNT
Genesis 48 in the NNT2
Genesis 48 in the NNT3
Genesis 48 in the PDDPT
Genesis 48 in the PFNT
Genesis 48 in the RMNT
Genesis 48 in the SBIAS
Genesis 48 in the SBIBS
Genesis 48 in the SBIBS2
Genesis 48 in the SBICS
Genesis 48 in the SBIDS
Genesis 48 in the SBIGS
Genesis 48 in the SBIHS
Genesis 48 in the SBIIS
Genesis 48 in the SBIIS2
Genesis 48 in the SBIIS3
Genesis 48 in the SBIKS
Genesis 48 in the SBIKS2
Genesis 48 in the SBIMS
Genesis 48 in the SBIOS
Genesis 48 in the SBIPS
Genesis 48 in the SBISS
Genesis 48 in the SBITS
Genesis 48 in the SBITS2
Genesis 48 in the SBITS3
Genesis 48 in the SBITS4
Genesis 48 in the SBIUS
Genesis 48 in the SBIVS
Genesis 48 in the SBT
Genesis 48 in the SBT1E
Genesis 48 in the SCHL
Genesis 48 in the SNT
Genesis 48 in the SUSU
Genesis 48 in the SUSU2
Genesis 48 in the SYNO
Genesis 48 in the TBIAOTANT
Genesis 48 in the TBT1E
Genesis 48 in the TBT1E2
Genesis 48 in the TFTIP
Genesis 48 in the TFTU
Genesis 48 in the TGNTATF3T
Genesis 48 in the THAI
Genesis 48 in the TNFD
Genesis 48 in the TNT
Genesis 48 in the TNTIK
Genesis 48 in the TNTIL
Genesis 48 in the TNTIN
Genesis 48 in the TNTIP
Genesis 48 in the TNTIZ
Genesis 48 in the TOMA
Genesis 48 in the TTENT
Genesis 48 in the UBG
Genesis 48 in the UGV
Genesis 48 in the UGV2
Genesis 48 in the UGV3
Genesis 48 in the VBL
Genesis 48 in the VDCC
Genesis 48 in the YALU
Genesis 48 in the YAPE
Genesis 48 in the YBVTP
Genesis 48 in the ZBP