Genesis 50 (BOICB)
1 Josef dakwasịrị nʼihu nna ya, kwaa akwa, sutukwa ya ọnụ. 2 Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel. 3 O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa. 4 Mgbe oge iru ụjụ gafesịrị, Josef gwara ndị ụlọ Fero sị ha, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu unu, biko, gwaranụ m Fero otu a, sị ya, 5 ‘Nna m mere ka m ṅụọra ya iyi mgbe ọ na-anwụ, sị, “Lee, agala m ịnwụ, ị ga-eli m nʼili m, nke m gwuuru onwe m nʼala Kenan.” Ugbu a, biko ka m gaa lie nna m, ma lọghachikwa.’ ” 6 Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.” 7 Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt. 8 Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen. 9 Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu. 10 Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ. 11 Mgbe ndị bi nʼala Kenan hụrụ oke iru ụjụ nke ebe ịzọcha ọka nke Atad ahụ, ha sịrị, “Nke a bụụrụ ndị Ijipt iru ụjụ dị ukwuu.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ dị nso na Jọdan Ebel-Mizraim. 12 Ụmụ Jekọb mere dịka nna ha gwara ha. 13 Nʼihi na ha buuru ozu ya laa nʼala Kenan, lie ya nʼọgba ahụ dị nʼọhịa Makipela, nke bụ ala ubi Ebraham zụrụ dịka ala olili ozu, site nʼaka Efrọn, onye Het; nʼakụkụ Mamre. 14 Emesịa, Josef laghachiri Ijipt ya na ụmụnne ya, na ndị niile sooro ya gaa olili ozu nna ya, ngwangwa elichara nna ya. 15 Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?” 16 Nʼihi nke a, ha zipụrụ Josef ozi sị, “Nna gị nyere iwu a tupu ọ nwụọ. 17 ‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa. 18 Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.” 19 Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ? 20 Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa. 21 Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi. 22 Josef biri nʼIjipt, ya na ụmụnne ya, na ndị ụlọ ha. Josef gbara narị afọ na iri. 23 Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya. 24 Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Agala m ịnwụ, ma Chineke ga-abịa ileta unu. Ọ ga-esi nʼala a kpọpụta unu kpọgakwa unu nʼala ahụ ọ ṅụụrụ Ebraham na Aịzik na Jekọb iyi, na ọ ga-enye ha.” 25 Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.” 26 Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.
In Other Versions
Genesis 50 in the ANGEFD
Genesis 50 in the ANTPNG2D
Genesis 50 in the AS21
Genesis 50 in the BAGH
Genesis 50 in the BBPNG
Genesis 50 in the BBT1E
Genesis 50 in the BDS
Genesis 50 in the BEV
Genesis 50 in the BHAD
Genesis 50 in the BIB
Genesis 50 in the BLPT
Genesis 50 in the BNT
Genesis 50 in the BNTABOOT
Genesis 50 in the BNTLV
Genesis 50 in the BOATCB
Genesis 50 in the BOATCB2
Genesis 50 in the BOBCV
Genesis 50 in the BOCNT
Genesis 50 in the BOECS
Genesis 50 in the BOGWICC
Genesis 50 in the BOHCB
Genesis 50 in the BOHCV
Genesis 50 in the BOHLNT
Genesis 50 in the BOHNTLTAL
Genesis 50 in the BOILNTAP
Genesis 50 in the BOITCV
Genesis 50 in the BOKCV
Genesis 50 in the BOKCV2
Genesis 50 in the BOKHWOG
Genesis 50 in the BOKSSV
Genesis 50 in the BOLCB
Genesis 50 in the BOLCB2
Genesis 50 in the BOMCV
Genesis 50 in the BONAV
Genesis 50 in the BONCB
Genesis 50 in the BONLT
Genesis 50 in the BONUT2
Genesis 50 in the BOPLNT
Genesis 50 in the BOSCB
Genesis 50 in the BOSNC
Genesis 50 in the BOTLNT
Genesis 50 in the BOVCB
Genesis 50 in the BOYCB
Genesis 50 in the BPBB
Genesis 50 in the BPH
Genesis 50 in the BSB
Genesis 50 in the CCB
Genesis 50 in the CUV
Genesis 50 in the CUVS
Genesis 50 in the DBT
Genesis 50 in the DGDNT
Genesis 50 in the DHNT
Genesis 50 in the DNT
Genesis 50 in the ELBE
Genesis 50 in the EMTV
Genesis 50 in the ESV
Genesis 50 in the FBV
Genesis 50 in the FEB
Genesis 50 in the GGMNT
Genesis 50 in the GNT
Genesis 50 in the HARY
Genesis 50 in the HNT
Genesis 50 in the IRVA
Genesis 50 in the IRVB
Genesis 50 in the IRVG
Genesis 50 in the IRVH
Genesis 50 in the IRVK
Genesis 50 in the IRVM
Genesis 50 in the IRVM2
Genesis 50 in the IRVO
Genesis 50 in the IRVP
Genesis 50 in the IRVT
Genesis 50 in the IRVT2
Genesis 50 in the IRVU
Genesis 50 in the ISVN
Genesis 50 in the JSNT
Genesis 50 in the KAPI
Genesis 50 in the KBT1ETNIK
Genesis 50 in the KBV
Genesis 50 in the KJV
Genesis 50 in the KNFD
Genesis 50 in the LBA
Genesis 50 in the LBLA
Genesis 50 in the LNT
Genesis 50 in the LSV
Genesis 50 in the MAAL
Genesis 50 in the MBV
Genesis 50 in the MBV2
Genesis 50 in the MHNT
Genesis 50 in the MKNFD
Genesis 50 in the MNG
Genesis 50 in the MNT
Genesis 50 in the MNT2
Genesis 50 in the MRS1T
Genesis 50 in the NAA
Genesis 50 in the NASB
Genesis 50 in the NBLA
Genesis 50 in the NBS
Genesis 50 in the NBVTP
Genesis 50 in the NET2
Genesis 50 in the NIV11
Genesis 50 in the NNT
Genesis 50 in the NNT2
Genesis 50 in the NNT3
Genesis 50 in the PDDPT
Genesis 50 in the PFNT
Genesis 50 in the RMNT
Genesis 50 in the SBIAS
Genesis 50 in the SBIBS
Genesis 50 in the SBIBS2
Genesis 50 in the SBICS
Genesis 50 in the SBIDS
Genesis 50 in the SBIGS
Genesis 50 in the SBIHS
Genesis 50 in the SBIIS
Genesis 50 in the SBIIS2
Genesis 50 in the SBIIS3
Genesis 50 in the SBIKS
Genesis 50 in the SBIKS2
Genesis 50 in the SBIMS
Genesis 50 in the SBIOS
Genesis 50 in the SBIPS
Genesis 50 in the SBISS
Genesis 50 in the SBITS
Genesis 50 in the SBITS2
Genesis 50 in the SBITS3
Genesis 50 in the SBITS4
Genesis 50 in the SBIUS
Genesis 50 in the SBIVS
Genesis 50 in the SBT
Genesis 50 in the SBT1E
Genesis 50 in the SCHL
Genesis 50 in the SNT
Genesis 50 in the SUSU
Genesis 50 in the SUSU2
Genesis 50 in the SYNO
Genesis 50 in the TBIAOTANT
Genesis 50 in the TBT1E
Genesis 50 in the TBT1E2
Genesis 50 in the TFTIP
Genesis 50 in the TFTU
Genesis 50 in the TGNTATF3T
Genesis 50 in the THAI
Genesis 50 in the TNFD
Genesis 50 in the TNT
Genesis 50 in the TNTIK
Genesis 50 in the TNTIL
Genesis 50 in the TNTIN
Genesis 50 in the TNTIP
Genesis 50 in the TNTIZ
Genesis 50 in the TOMA
Genesis 50 in the TTENT
Genesis 50 in the UBG
Genesis 50 in the UGV
Genesis 50 in the UGV2
Genesis 50 in the UGV3
Genesis 50 in the VBL
Genesis 50 in the VDCC
Genesis 50 in the YALU
Genesis 50 in the YAPE
Genesis 50 in the YBVTP
Genesis 50 in the ZBP