Judges 20 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu ONYENWE ANYỊ na Mizpa. 2 Ndị ndu ebo Izrel niile weere ọnọdụ na nzukọ nke ndị Chineke, ọnụọgụgụ ha bụ narị puku ndị agha anọ, ndị na-ebu mma agha. 3 Mgbe na-adịghị anya, nzukọ ụmụ Izrel niile na Mizpa ruru ụmụ Benjamin ntị. Mgbe ahụ, ndịisi Izrel niile kpọrọ nwoke ahụ e gburu iko ya nwanyị sị ya, “Kọọrọ anyị otu ihe ọjọọ a si mee.” 4 Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị. 5 Nʼoge abalị, ndị ikom Gibea bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. 6 Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel. 7 Ugbu a, unu ụmụ Izrel niile, unu onwe unu tụleenụ okwu a, nyekwanụ ndụmọdụ ihe a ga-eme ebe a.” 8 Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya. 9 Ma ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme ndị Gibea. Anyị ga-efe nza chọpụta ndị ga-aga lụso ndị Gibea agha. 10 Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.” 11 Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ. 12 Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu? 13 Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.”Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị. 14 Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na Gibea maka ibuso ndị Izrel agha. 15 Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea. 16 Nʼime ndị agha ndị a, e nwere narị ndị agha asaa, ndị a maara nke ọma dịka ndị na-agbata ụta nke ọma. Ha bụ ndị na-eme aka ekpe, onye ọbụla nʼime ha nwere ike iji okwute mata otu agịrị isi, ghara ịmahie ya. 17 Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ. 18 Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?” ONYENWE ANYỊ zara sị ha na ọ bụ Juda ga-ebu ụzọ. 19 Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea. 20 Emesịa, ndị Izrel pụrụ izute ndị Benjamin, doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Gibea. 21 Ma nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin si Gibea nupụta nʼigwe gbuo ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ. 22 Ndị agha Izrel gbarịtara onwe ha ume, ma werekwa ọnọdụ ibu agha dịka ha mere nʼụbọchị mbụ. 23 Ndị agha Izrel kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ ONYENWE ANYỊ ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị Benjamin ọgụ?” ONYENWE ANYỊ zara sị ha, “Gaanụ ga lụso ha agha.” 24 Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya. 25 Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha. 26 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu ONYENWE ANYỊ Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu ONYENWE ANYỊ onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ. 27 Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka ONYENWE ANYỊ. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ. 28 Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ ONYENWE ANYỊ ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?” ONYENWE ANYỊ zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha Benjamin echi.” 29 Nʼihi nke a, ụmụ Izrel kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo Gibea. 30 Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị Benjamin, ha were ọnọdụ ha imegide ndị Gibea dịka ha mere nʼoge gara aga. 31 Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea. 32 Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.” 33 Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta. 34 Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha. 35 ONYENWE ANYỊ meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha. 36 Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha.Ugbu a, ndị ikom Izrel nyere ndị Benjamin ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ Gibea. 37 Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ. 38 Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ, 39 ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha.Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.” 40 Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ. 41 Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha. 42 Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ. 43 Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ. 44 Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ. 45 Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ. 46 Ya mere, ndị Benjamin e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha. 47 Naanị narị ndị agha isii nʼime ha tụgharịrị gbapụ ọsọ gbalaga nʼọzara, nʼebe nkume Rimọn dị. Ha nọgidere nʼebe ahụ ọnwa anọ. 48 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel hapụrụ ha, laghachi azụ, gaa nʼobodo ndị Benjamin niile gbuo ndị niile nọ nʼime ha, igwe anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ niile dị nʼime ha. Obodo niile ha ruru, ha kpọrọ ha ọkụ.

In Other Versions

Judges 20 in the ANGEFD

Judges 20 in the ANTPNG2D

Judges 20 in the AS21

Judges 20 in the BAGH

Judges 20 in the BBPNG

Judges 20 in the BBT1E

Judges 20 in the BDS

Judges 20 in the BEV

Judges 20 in the BHAD

Judges 20 in the BIB

Judges 20 in the BLPT

Judges 20 in the BNT

Judges 20 in the BNTABOOT

Judges 20 in the BNTLV

Judges 20 in the BOATCB

Judges 20 in the BOATCB2

Judges 20 in the BOBCV

Judges 20 in the BOCNT

Judges 20 in the BOECS

Judges 20 in the BOGWICC

Judges 20 in the BOHCB

Judges 20 in the BOHCV

Judges 20 in the BOHLNT

Judges 20 in the BOHNTLTAL

Judges 20 in the BOILNTAP

Judges 20 in the BOITCV

Judges 20 in the BOKCV

Judges 20 in the BOKCV2

Judges 20 in the BOKHWOG

Judges 20 in the BOKSSV

Judges 20 in the BOLCB

Judges 20 in the BOLCB2

Judges 20 in the BOMCV

Judges 20 in the BONAV

Judges 20 in the BONCB

Judges 20 in the BONLT

Judges 20 in the BONUT2

Judges 20 in the BOPLNT

Judges 20 in the BOSCB

Judges 20 in the BOSNC

Judges 20 in the BOTLNT

Judges 20 in the BOVCB

Judges 20 in the BOYCB

Judges 20 in the BPBB

Judges 20 in the BPH

Judges 20 in the BSB

Judges 20 in the CCB

Judges 20 in the CUV

Judges 20 in the CUVS

Judges 20 in the DBT

Judges 20 in the DGDNT

Judges 20 in the DHNT

Judges 20 in the DNT

Judges 20 in the ELBE

Judges 20 in the EMTV

Judges 20 in the ESV

Judges 20 in the FBV

Judges 20 in the FEB

Judges 20 in the GGMNT

Judges 20 in the GNT

Judges 20 in the HARY

Judges 20 in the HNT

Judges 20 in the IRVA

Judges 20 in the IRVB

Judges 20 in the IRVG

Judges 20 in the IRVH

Judges 20 in the IRVK

Judges 20 in the IRVM

Judges 20 in the IRVM2

Judges 20 in the IRVO

Judges 20 in the IRVP

Judges 20 in the IRVT

Judges 20 in the IRVT2

Judges 20 in the IRVU

Judges 20 in the ISVN

Judges 20 in the JSNT

Judges 20 in the KAPI

Judges 20 in the KBT1ETNIK

Judges 20 in the KBV

Judges 20 in the KJV

Judges 20 in the KNFD

Judges 20 in the LBA

Judges 20 in the LBLA

Judges 20 in the LNT

Judges 20 in the LSV

Judges 20 in the MAAL

Judges 20 in the MBV

Judges 20 in the MBV2

Judges 20 in the MHNT

Judges 20 in the MKNFD

Judges 20 in the MNG

Judges 20 in the MNT

Judges 20 in the MNT2

Judges 20 in the MRS1T

Judges 20 in the NAA

Judges 20 in the NASB

Judges 20 in the NBLA

Judges 20 in the NBS

Judges 20 in the NBVTP

Judges 20 in the NET2

Judges 20 in the NIV11

Judges 20 in the NNT

Judges 20 in the NNT2

Judges 20 in the NNT3

Judges 20 in the PDDPT

Judges 20 in the PFNT

Judges 20 in the RMNT

Judges 20 in the SBIAS

Judges 20 in the SBIBS

Judges 20 in the SBIBS2

Judges 20 in the SBICS

Judges 20 in the SBIDS

Judges 20 in the SBIGS

Judges 20 in the SBIHS

Judges 20 in the SBIIS

Judges 20 in the SBIIS2

Judges 20 in the SBIIS3

Judges 20 in the SBIKS

Judges 20 in the SBIKS2

Judges 20 in the SBIMS

Judges 20 in the SBIOS

Judges 20 in the SBIPS

Judges 20 in the SBISS

Judges 20 in the SBITS

Judges 20 in the SBITS2

Judges 20 in the SBITS3

Judges 20 in the SBITS4

Judges 20 in the SBIUS

Judges 20 in the SBIVS

Judges 20 in the SBT

Judges 20 in the SBT1E

Judges 20 in the SCHL

Judges 20 in the SNT

Judges 20 in the SUSU

Judges 20 in the SUSU2

Judges 20 in the SYNO

Judges 20 in the TBIAOTANT

Judges 20 in the TBT1E

Judges 20 in the TBT1E2

Judges 20 in the TFTIP

Judges 20 in the TFTU

Judges 20 in the TGNTATF3T

Judges 20 in the THAI

Judges 20 in the TNFD

Judges 20 in the TNT

Judges 20 in the TNTIK

Judges 20 in the TNTIL

Judges 20 in the TNTIN

Judges 20 in the TNTIP

Judges 20 in the TNTIZ

Judges 20 in the TOMA

Judges 20 in the TTENT

Judges 20 in the UBG

Judges 20 in the UGV

Judges 20 in the UGV2

Judges 20 in the UGV3

Judges 20 in the VBL

Judges 20 in the VDCC

Judges 20 in the YALU

Judges 20 in the YAPE

Judges 20 in the YBVTP

Judges 20 in the ZBP