Jeremiah 22 (BOICB)

1 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a. 2 ‘Nụrụ okwu ONYENWE ANYỊ, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa. 3 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a. 4 Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị. 5 Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ” 6 Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru banyere ụlọeze Juda,“Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m,dịka elu ugwu ukwu Lebanọn,aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa,dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. 7 Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,tụnye ha niile nʼime ọkụ. 8 “Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ONYENWE ANYỊ ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’ 9 Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ” 10 Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu,kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ.Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ;ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ. 11 Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ. 12 Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.” 13 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. 14 Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,jirikwa osisi sida machie elu ya,werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma. 15 “Ị ga-abụ ezenʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?O mere ihe dị mma na ihe ziri ezinʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma. 16 O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,nke a mere na ihe niile gara nke ọma.Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?Ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara 17 Ma anya unu na obi unuadịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezinʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.” 18 Ya mere, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:“Ha agaghị eruru ya uju sị,‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’Ha agaghị eruru ya uju sị,‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’ 19 A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo yanʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.” 20 “Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwanʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma. 21 Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,ma ị jụrụ ige ntị.Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.Ị jụkwara irubere m isi. 22 Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼalanʼihi ajọ omume gị niile. 23 Gị onye na-ebi na Lebanọn,onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme. 24 “Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị, 25 were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa. 26 Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ. 27 Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.” 28 Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị,ihe onye ọbụla na-achọghị?Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya,tụga ha na mba ha na-amaghị? 29 Ala, ala, ala,nụrụ okwu ONYENWE ANYỊ. 30 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru:“Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa,nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile,nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma,o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid,maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”

In Other Versions

Jeremiah 22 in the ANGEFD

Jeremiah 22 in the ANTPNG2D

Jeremiah 22 in the AS21

Jeremiah 22 in the BAGH

Jeremiah 22 in the BBPNG

Jeremiah 22 in the BBT1E

Jeremiah 22 in the BDS

Jeremiah 22 in the BEV

Jeremiah 22 in the BHAD

Jeremiah 22 in the BIB

Jeremiah 22 in the BLPT

Jeremiah 22 in the BNT

Jeremiah 22 in the BNTABOOT

Jeremiah 22 in the BNTLV

Jeremiah 22 in the BOATCB

Jeremiah 22 in the BOATCB2

Jeremiah 22 in the BOBCV

Jeremiah 22 in the BOCNT

Jeremiah 22 in the BOECS

Jeremiah 22 in the BOGWICC

Jeremiah 22 in the BOHCB

Jeremiah 22 in the BOHCV

Jeremiah 22 in the BOHLNT

Jeremiah 22 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 22 in the BOILNTAP

Jeremiah 22 in the BOITCV

Jeremiah 22 in the BOKCV

Jeremiah 22 in the BOKCV2

Jeremiah 22 in the BOKHWOG

Jeremiah 22 in the BOKSSV

Jeremiah 22 in the BOLCB

Jeremiah 22 in the BOLCB2

Jeremiah 22 in the BOMCV

Jeremiah 22 in the BONAV

Jeremiah 22 in the BONCB

Jeremiah 22 in the BONLT

Jeremiah 22 in the BONUT2

Jeremiah 22 in the BOPLNT

Jeremiah 22 in the BOSCB

Jeremiah 22 in the BOSNC

Jeremiah 22 in the BOTLNT

Jeremiah 22 in the BOVCB

Jeremiah 22 in the BOYCB

Jeremiah 22 in the BPBB

Jeremiah 22 in the BPH

Jeremiah 22 in the BSB

Jeremiah 22 in the CCB

Jeremiah 22 in the CUV

Jeremiah 22 in the CUVS

Jeremiah 22 in the DBT

Jeremiah 22 in the DGDNT

Jeremiah 22 in the DHNT

Jeremiah 22 in the DNT

Jeremiah 22 in the ELBE

Jeremiah 22 in the EMTV

Jeremiah 22 in the ESV

Jeremiah 22 in the FBV

Jeremiah 22 in the FEB

Jeremiah 22 in the GGMNT

Jeremiah 22 in the GNT

Jeremiah 22 in the HARY

Jeremiah 22 in the HNT

Jeremiah 22 in the IRVA

Jeremiah 22 in the IRVB

Jeremiah 22 in the IRVG

Jeremiah 22 in the IRVH

Jeremiah 22 in the IRVK

Jeremiah 22 in the IRVM

Jeremiah 22 in the IRVM2

Jeremiah 22 in the IRVO

Jeremiah 22 in the IRVP

Jeremiah 22 in the IRVT

Jeremiah 22 in the IRVT2

Jeremiah 22 in the IRVU

Jeremiah 22 in the ISVN

Jeremiah 22 in the JSNT

Jeremiah 22 in the KAPI

Jeremiah 22 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 22 in the KBV

Jeremiah 22 in the KJV

Jeremiah 22 in the KNFD

Jeremiah 22 in the LBA

Jeremiah 22 in the LBLA

Jeremiah 22 in the LNT

Jeremiah 22 in the LSV

Jeremiah 22 in the MAAL

Jeremiah 22 in the MBV

Jeremiah 22 in the MBV2

Jeremiah 22 in the MHNT

Jeremiah 22 in the MKNFD

Jeremiah 22 in the MNG

Jeremiah 22 in the MNT

Jeremiah 22 in the MNT2

Jeremiah 22 in the MRS1T

Jeremiah 22 in the NAA

Jeremiah 22 in the NASB

Jeremiah 22 in the NBLA

Jeremiah 22 in the NBS

Jeremiah 22 in the NBVTP

Jeremiah 22 in the NET2

Jeremiah 22 in the NIV11

Jeremiah 22 in the NNT

Jeremiah 22 in the NNT2

Jeremiah 22 in the NNT3

Jeremiah 22 in the PDDPT

Jeremiah 22 in the PFNT

Jeremiah 22 in the RMNT

Jeremiah 22 in the SBIAS

Jeremiah 22 in the SBIBS

Jeremiah 22 in the SBIBS2

Jeremiah 22 in the SBICS

Jeremiah 22 in the SBIDS

Jeremiah 22 in the SBIGS

Jeremiah 22 in the SBIHS

Jeremiah 22 in the SBIIS

Jeremiah 22 in the SBIIS2

Jeremiah 22 in the SBIIS3

Jeremiah 22 in the SBIKS

Jeremiah 22 in the SBIKS2

Jeremiah 22 in the SBIMS

Jeremiah 22 in the SBIOS

Jeremiah 22 in the SBIPS

Jeremiah 22 in the SBISS

Jeremiah 22 in the SBITS

Jeremiah 22 in the SBITS2

Jeremiah 22 in the SBITS3

Jeremiah 22 in the SBITS4

Jeremiah 22 in the SBIUS

Jeremiah 22 in the SBIVS

Jeremiah 22 in the SBT

Jeremiah 22 in the SBT1E

Jeremiah 22 in the SCHL

Jeremiah 22 in the SNT

Jeremiah 22 in the SUSU

Jeremiah 22 in the SUSU2

Jeremiah 22 in the SYNO

Jeremiah 22 in the TBIAOTANT

Jeremiah 22 in the TBT1E

Jeremiah 22 in the TBT1E2

Jeremiah 22 in the TFTIP

Jeremiah 22 in the TFTU

Jeremiah 22 in the TGNTATF3T

Jeremiah 22 in the THAI

Jeremiah 22 in the TNFD

Jeremiah 22 in the TNT

Jeremiah 22 in the TNTIK

Jeremiah 22 in the TNTIL

Jeremiah 22 in the TNTIN

Jeremiah 22 in the TNTIP

Jeremiah 22 in the TNTIZ

Jeremiah 22 in the TOMA

Jeremiah 22 in the TTENT

Jeremiah 22 in the UBG

Jeremiah 22 in the UGV

Jeremiah 22 in the UGV2

Jeremiah 22 in the UGV3

Jeremiah 22 in the VBL

Jeremiah 22 in the VDCC

Jeremiah 22 in the YALU

Jeremiah 22 in the YAPE

Jeremiah 22 in the YBVTP

Jeremiah 22 in the ZBP