Jeremiah 34 (BOICB)

1 Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị, 2 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ. 3 Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze Babilọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa Babilọn. 4 “ ‘Ma nụrụkwa nkwa ONYENWE ANYỊ na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha; 5 ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.’ ” 6 Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa Zedekaya eze Juda ihe ndị a niile na Jerusalem. 7 Nʼoge a, ndị agha eze Babilọn na-ebuso Jerusalem agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo Lakish na Azeka. Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala Juda nke ndị agha Babilọn na-emeribeghị. 8 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha. 9 Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ. 10 Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo. 11 Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ. 12 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị ya, 13 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị, 14 ‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha. 15 Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. 16 Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ. 17 “Nʼihi nke a, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa. 18 Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike. 19 Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga 20 ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa. 21 “Aga m enyefe Zedekaya eze Juda na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze Babilọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha. 22 Aga m enye iwu, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”

In Other Versions

Jeremiah 34 in the ANGEFD

Jeremiah 34 in the ANTPNG2D

Jeremiah 34 in the AS21

Jeremiah 34 in the BAGH

Jeremiah 34 in the BBPNG

Jeremiah 34 in the BBT1E

Jeremiah 34 in the BDS

Jeremiah 34 in the BEV

Jeremiah 34 in the BHAD

Jeremiah 34 in the BIB

Jeremiah 34 in the BLPT

Jeremiah 34 in the BNT

Jeremiah 34 in the BNTABOOT

Jeremiah 34 in the BNTLV

Jeremiah 34 in the BOATCB

Jeremiah 34 in the BOATCB2

Jeremiah 34 in the BOBCV

Jeremiah 34 in the BOCNT

Jeremiah 34 in the BOECS

Jeremiah 34 in the BOGWICC

Jeremiah 34 in the BOHCB

Jeremiah 34 in the BOHCV

Jeremiah 34 in the BOHLNT

Jeremiah 34 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 34 in the BOILNTAP

Jeremiah 34 in the BOITCV

Jeremiah 34 in the BOKCV

Jeremiah 34 in the BOKCV2

Jeremiah 34 in the BOKHWOG

Jeremiah 34 in the BOKSSV

Jeremiah 34 in the BOLCB

Jeremiah 34 in the BOLCB2

Jeremiah 34 in the BOMCV

Jeremiah 34 in the BONAV

Jeremiah 34 in the BONCB

Jeremiah 34 in the BONLT

Jeremiah 34 in the BONUT2

Jeremiah 34 in the BOPLNT

Jeremiah 34 in the BOSCB

Jeremiah 34 in the BOSNC

Jeremiah 34 in the BOTLNT

Jeremiah 34 in the BOVCB

Jeremiah 34 in the BOYCB

Jeremiah 34 in the BPBB

Jeremiah 34 in the BPH

Jeremiah 34 in the BSB

Jeremiah 34 in the CCB

Jeremiah 34 in the CUV

Jeremiah 34 in the CUVS

Jeremiah 34 in the DBT

Jeremiah 34 in the DGDNT

Jeremiah 34 in the DHNT

Jeremiah 34 in the DNT

Jeremiah 34 in the ELBE

Jeremiah 34 in the EMTV

Jeremiah 34 in the ESV

Jeremiah 34 in the FBV

Jeremiah 34 in the FEB

Jeremiah 34 in the GGMNT

Jeremiah 34 in the GNT

Jeremiah 34 in the HARY

Jeremiah 34 in the HNT

Jeremiah 34 in the IRVA

Jeremiah 34 in the IRVB

Jeremiah 34 in the IRVG

Jeremiah 34 in the IRVH

Jeremiah 34 in the IRVK

Jeremiah 34 in the IRVM

Jeremiah 34 in the IRVM2

Jeremiah 34 in the IRVO

Jeremiah 34 in the IRVP

Jeremiah 34 in the IRVT

Jeremiah 34 in the IRVT2

Jeremiah 34 in the IRVU

Jeremiah 34 in the ISVN

Jeremiah 34 in the JSNT

Jeremiah 34 in the KAPI

Jeremiah 34 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 34 in the KBV

Jeremiah 34 in the KJV

Jeremiah 34 in the KNFD

Jeremiah 34 in the LBA

Jeremiah 34 in the LBLA

Jeremiah 34 in the LNT

Jeremiah 34 in the LSV

Jeremiah 34 in the MAAL

Jeremiah 34 in the MBV

Jeremiah 34 in the MBV2

Jeremiah 34 in the MHNT

Jeremiah 34 in the MKNFD

Jeremiah 34 in the MNG

Jeremiah 34 in the MNT

Jeremiah 34 in the MNT2

Jeremiah 34 in the MRS1T

Jeremiah 34 in the NAA

Jeremiah 34 in the NASB

Jeremiah 34 in the NBLA

Jeremiah 34 in the NBS

Jeremiah 34 in the NBVTP

Jeremiah 34 in the NET2

Jeremiah 34 in the NIV11

Jeremiah 34 in the NNT

Jeremiah 34 in the NNT2

Jeremiah 34 in the NNT3

Jeremiah 34 in the PDDPT

Jeremiah 34 in the PFNT

Jeremiah 34 in the RMNT

Jeremiah 34 in the SBIAS

Jeremiah 34 in the SBIBS

Jeremiah 34 in the SBIBS2

Jeremiah 34 in the SBICS

Jeremiah 34 in the SBIDS

Jeremiah 34 in the SBIGS

Jeremiah 34 in the SBIHS

Jeremiah 34 in the SBIIS

Jeremiah 34 in the SBIIS2

Jeremiah 34 in the SBIIS3

Jeremiah 34 in the SBIKS

Jeremiah 34 in the SBIKS2

Jeremiah 34 in the SBIMS

Jeremiah 34 in the SBIOS

Jeremiah 34 in the SBIPS

Jeremiah 34 in the SBISS

Jeremiah 34 in the SBITS

Jeremiah 34 in the SBITS2

Jeremiah 34 in the SBITS3

Jeremiah 34 in the SBITS4

Jeremiah 34 in the SBIUS

Jeremiah 34 in the SBIVS

Jeremiah 34 in the SBT

Jeremiah 34 in the SBT1E

Jeremiah 34 in the SCHL

Jeremiah 34 in the SNT

Jeremiah 34 in the SUSU

Jeremiah 34 in the SUSU2

Jeremiah 34 in the SYNO

Jeremiah 34 in the TBIAOTANT

Jeremiah 34 in the TBT1E

Jeremiah 34 in the TBT1E2

Jeremiah 34 in the TFTIP

Jeremiah 34 in the TFTU

Jeremiah 34 in the TGNTATF3T

Jeremiah 34 in the THAI

Jeremiah 34 in the TNFD

Jeremiah 34 in the TNT

Jeremiah 34 in the TNTIK

Jeremiah 34 in the TNTIL

Jeremiah 34 in the TNTIN

Jeremiah 34 in the TNTIP

Jeremiah 34 in the TNTIZ

Jeremiah 34 in the TOMA

Jeremiah 34 in the TTENT

Jeremiah 34 in the UBG

Jeremiah 34 in the UGV

Jeremiah 34 in the UGV2

Jeremiah 34 in the UGV3

Jeremiah 34 in the VBL

Jeremiah 34 in the VDCC

Jeremiah 34 in the YALU

Jeremiah 34 in the YAPE

Jeremiah 34 in the YBVTP

Jeremiah 34 in the ZBP