Jeremiah 37 (BOICB)

1 Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn mere Zedekaya nwa Josaya eze Juda, nʼọnọdụ Konaya nwa Jehoiakim. 2 Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu ONYENWE ANYỊ nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha. 3 Zedekaya bụ eze, ziri Jehukal nwa Shelemaya, na Zefanaya onye nchụaja, bụ nwa Maaseia ozi sị ha, jekwuru Jeremaya onye amụma gwa ya okwu sị, “Biko, kpeere anyị ekpere, rịọrọ anyị ONYENWE ANYỊ Chineke anyị arịrịọ.” 4 Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ. 5 Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha. 6 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya, 7 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt. 8 Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’ 9 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ. 10 A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.” 11 Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa, 12 Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ. 13 Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!” 14 Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị. 15 Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a. 16 E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge. 17 Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka ONYENWE ANYỊ?”Jeremaya zara sị ya, “E, lee, a ga-arara gị nyefee gị nʼaka eze Babilọn.” 18 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ? 19 Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’ 20 Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.” 21 Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.

In Other Versions

Jeremiah 37 in the ANGEFD

Jeremiah 37 in the ANTPNG2D

Jeremiah 37 in the AS21

Jeremiah 37 in the BAGH

Jeremiah 37 in the BBPNG

Jeremiah 37 in the BBT1E

Jeremiah 37 in the BDS

Jeremiah 37 in the BEV

Jeremiah 37 in the BHAD

Jeremiah 37 in the BIB

Jeremiah 37 in the BLPT

Jeremiah 37 in the BNT

Jeremiah 37 in the BNTABOOT

Jeremiah 37 in the BNTLV

Jeremiah 37 in the BOATCB

Jeremiah 37 in the BOATCB2

Jeremiah 37 in the BOBCV

Jeremiah 37 in the BOCNT

Jeremiah 37 in the BOECS

Jeremiah 37 in the BOGWICC

Jeremiah 37 in the BOHCB

Jeremiah 37 in the BOHCV

Jeremiah 37 in the BOHLNT

Jeremiah 37 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 37 in the BOILNTAP

Jeremiah 37 in the BOITCV

Jeremiah 37 in the BOKCV

Jeremiah 37 in the BOKCV2

Jeremiah 37 in the BOKHWOG

Jeremiah 37 in the BOKSSV

Jeremiah 37 in the BOLCB

Jeremiah 37 in the BOLCB2

Jeremiah 37 in the BOMCV

Jeremiah 37 in the BONAV

Jeremiah 37 in the BONCB

Jeremiah 37 in the BONLT

Jeremiah 37 in the BONUT2

Jeremiah 37 in the BOPLNT

Jeremiah 37 in the BOSCB

Jeremiah 37 in the BOSNC

Jeremiah 37 in the BOTLNT

Jeremiah 37 in the BOVCB

Jeremiah 37 in the BOYCB

Jeremiah 37 in the BPBB

Jeremiah 37 in the BPH

Jeremiah 37 in the BSB

Jeremiah 37 in the CCB

Jeremiah 37 in the CUV

Jeremiah 37 in the CUVS

Jeremiah 37 in the DBT

Jeremiah 37 in the DGDNT

Jeremiah 37 in the DHNT

Jeremiah 37 in the DNT

Jeremiah 37 in the ELBE

Jeremiah 37 in the EMTV

Jeremiah 37 in the ESV

Jeremiah 37 in the FBV

Jeremiah 37 in the FEB

Jeremiah 37 in the GGMNT

Jeremiah 37 in the GNT

Jeremiah 37 in the HARY

Jeremiah 37 in the HNT

Jeremiah 37 in the IRVA

Jeremiah 37 in the IRVB

Jeremiah 37 in the IRVG

Jeremiah 37 in the IRVH

Jeremiah 37 in the IRVK

Jeremiah 37 in the IRVM

Jeremiah 37 in the IRVM2

Jeremiah 37 in the IRVO

Jeremiah 37 in the IRVP

Jeremiah 37 in the IRVT

Jeremiah 37 in the IRVT2

Jeremiah 37 in the IRVU

Jeremiah 37 in the ISVN

Jeremiah 37 in the JSNT

Jeremiah 37 in the KAPI

Jeremiah 37 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 37 in the KBV

Jeremiah 37 in the KJV

Jeremiah 37 in the KNFD

Jeremiah 37 in the LBA

Jeremiah 37 in the LBLA

Jeremiah 37 in the LNT

Jeremiah 37 in the LSV

Jeremiah 37 in the MAAL

Jeremiah 37 in the MBV

Jeremiah 37 in the MBV2

Jeremiah 37 in the MHNT

Jeremiah 37 in the MKNFD

Jeremiah 37 in the MNG

Jeremiah 37 in the MNT

Jeremiah 37 in the MNT2

Jeremiah 37 in the MRS1T

Jeremiah 37 in the NAA

Jeremiah 37 in the NASB

Jeremiah 37 in the NBLA

Jeremiah 37 in the NBS

Jeremiah 37 in the NBVTP

Jeremiah 37 in the NET2

Jeremiah 37 in the NIV11

Jeremiah 37 in the NNT

Jeremiah 37 in the NNT2

Jeremiah 37 in the NNT3

Jeremiah 37 in the PDDPT

Jeremiah 37 in the PFNT

Jeremiah 37 in the RMNT

Jeremiah 37 in the SBIAS

Jeremiah 37 in the SBIBS

Jeremiah 37 in the SBIBS2

Jeremiah 37 in the SBICS

Jeremiah 37 in the SBIDS

Jeremiah 37 in the SBIGS

Jeremiah 37 in the SBIHS

Jeremiah 37 in the SBIIS

Jeremiah 37 in the SBIIS2

Jeremiah 37 in the SBIIS3

Jeremiah 37 in the SBIKS

Jeremiah 37 in the SBIKS2

Jeremiah 37 in the SBIMS

Jeremiah 37 in the SBIOS

Jeremiah 37 in the SBIPS

Jeremiah 37 in the SBISS

Jeremiah 37 in the SBITS

Jeremiah 37 in the SBITS2

Jeremiah 37 in the SBITS3

Jeremiah 37 in the SBITS4

Jeremiah 37 in the SBIUS

Jeremiah 37 in the SBIVS

Jeremiah 37 in the SBT

Jeremiah 37 in the SBT1E

Jeremiah 37 in the SCHL

Jeremiah 37 in the SNT

Jeremiah 37 in the SUSU

Jeremiah 37 in the SUSU2

Jeremiah 37 in the SYNO

Jeremiah 37 in the TBIAOTANT

Jeremiah 37 in the TBT1E

Jeremiah 37 in the TBT1E2

Jeremiah 37 in the TFTIP

Jeremiah 37 in the TFTU

Jeremiah 37 in the TGNTATF3T

Jeremiah 37 in the THAI

Jeremiah 37 in the TNFD

Jeremiah 37 in the TNT

Jeremiah 37 in the TNTIK

Jeremiah 37 in the TNTIL

Jeremiah 37 in the TNTIN

Jeremiah 37 in the TNTIP

Jeremiah 37 in the TNTIZ

Jeremiah 37 in the TOMA

Jeremiah 37 in the TTENT

Jeremiah 37 in the UBG

Jeremiah 37 in the UGV

Jeremiah 37 in the UGV2

Jeremiah 37 in the UGV3

Jeremiah 37 in the VBL

Jeremiah 37 in the VDCC

Jeremiah 37 in the YALU

Jeremiah 37 in the YAPE

Jeremiah 37 in the YBVTP

Jeremiah 37 in the ZBP