Jeremiah 38 (BOICB)

1 Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha, 2 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’ 3 Ihe ndị a kwa ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ” 4 Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.” 5 Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.” 6 Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya. 7 Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, 8 Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya, 9 “Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.” 10 Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.” 11 Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. 12 Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya. 13 Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche. 14 Mgbe ahụ, Zedekaya bụ eze, ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, ka ọ bịakwute ya nʼọnụ ụzọ nke atọ, nke ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Mgbe ọ bịara, eze gwara ya okwu sị ya, “Achọrọ m ịjụ gị ajụjụ. Ezonarịla m ihe ọbụla.” 15 Ma Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ọ bụrụ na m enye gị ọsịsa, ị gaghị egbu m? A sịkwa na m adụọ gị ọdụ, ị gaghị ege m ntị.” 16 Ma Zedekaya bụ eze ṅụrụ iyi na nzuzo nye Jeremaya sị ya, “Dịka ONYENWE ANYỊ onye nyere anyị ume anyị na-eku si adị ndụ, agaghị m egbu gị, maọbụ nyefee gị nʼaka ndị na-achọsi ndụ gị ike.” 17 Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ. 18 Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ” 19 Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.” 20 “Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere ONYENWE ANYỊ isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị. 21 Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe ONYENWE ANYỊ mere ka m hụ: 22 A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị,“ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị,mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri.Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị,ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’ 23 “A ga-akpụpụtara ndị Babilọn ndị nwunye gị niile na ụmụ gị niile. Gị onwe gị agaghị agbanarị ha, ma eze Babilọn ga-ejidekwa gị, a ga-esurekwa obodo a ọkụ.” 24 Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ. 25 Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’ 26 mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’ ” 27 Ndịisi ọchịchị ahụ niile bịakwutere Jeremaya jụọ ya ajụjụ. Ọ gwakwara ha ihe ahụ niile eze nyere ya nʼiwu. Ha hapụrụ ịjụ ya ihe ọzọ, nʼihi o nwekwaghị onye ọzọ nụrụ okwu niile ya na eze kwuru. 28 Jeremaya nọgidekwara nʼogige ndị nche tutu ruo ụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.Otu a ka esi were Jerusalem.

In Other Versions

Jeremiah 38 in the ANGEFD

Jeremiah 38 in the ANTPNG2D

Jeremiah 38 in the AS21

Jeremiah 38 in the BAGH

Jeremiah 38 in the BBPNG

Jeremiah 38 in the BBT1E

Jeremiah 38 in the BDS

Jeremiah 38 in the BEV

Jeremiah 38 in the BHAD

Jeremiah 38 in the BIB

Jeremiah 38 in the BLPT

Jeremiah 38 in the BNT

Jeremiah 38 in the BNTABOOT

Jeremiah 38 in the BNTLV

Jeremiah 38 in the BOATCB

Jeremiah 38 in the BOATCB2

Jeremiah 38 in the BOBCV

Jeremiah 38 in the BOCNT

Jeremiah 38 in the BOECS

Jeremiah 38 in the BOGWICC

Jeremiah 38 in the BOHCB

Jeremiah 38 in the BOHCV

Jeremiah 38 in the BOHLNT

Jeremiah 38 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 38 in the BOILNTAP

Jeremiah 38 in the BOITCV

Jeremiah 38 in the BOKCV

Jeremiah 38 in the BOKCV2

Jeremiah 38 in the BOKHWOG

Jeremiah 38 in the BOKSSV

Jeremiah 38 in the BOLCB

Jeremiah 38 in the BOLCB2

Jeremiah 38 in the BOMCV

Jeremiah 38 in the BONAV

Jeremiah 38 in the BONCB

Jeremiah 38 in the BONLT

Jeremiah 38 in the BONUT2

Jeremiah 38 in the BOPLNT

Jeremiah 38 in the BOSCB

Jeremiah 38 in the BOSNC

Jeremiah 38 in the BOTLNT

Jeremiah 38 in the BOVCB

Jeremiah 38 in the BOYCB

Jeremiah 38 in the BPBB

Jeremiah 38 in the BPH

Jeremiah 38 in the BSB

Jeremiah 38 in the CCB

Jeremiah 38 in the CUV

Jeremiah 38 in the CUVS

Jeremiah 38 in the DBT

Jeremiah 38 in the DGDNT

Jeremiah 38 in the DHNT

Jeremiah 38 in the DNT

Jeremiah 38 in the ELBE

Jeremiah 38 in the EMTV

Jeremiah 38 in the ESV

Jeremiah 38 in the FBV

Jeremiah 38 in the FEB

Jeremiah 38 in the GGMNT

Jeremiah 38 in the GNT

Jeremiah 38 in the HARY

Jeremiah 38 in the HNT

Jeremiah 38 in the IRVA

Jeremiah 38 in the IRVB

Jeremiah 38 in the IRVG

Jeremiah 38 in the IRVH

Jeremiah 38 in the IRVK

Jeremiah 38 in the IRVM

Jeremiah 38 in the IRVM2

Jeremiah 38 in the IRVO

Jeremiah 38 in the IRVP

Jeremiah 38 in the IRVT

Jeremiah 38 in the IRVT2

Jeremiah 38 in the IRVU

Jeremiah 38 in the ISVN

Jeremiah 38 in the JSNT

Jeremiah 38 in the KAPI

Jeremiah 38 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 38 in the KBV

Jeremiah 38 in the KJV

Jeremiah 38 in the KNFD

Jeremiah 38 in the LBA

Jeremiah 38 in the LBLA

Jeremiah 38 in the LNT

Jeremiah 38 in the LSV

Jeremiah 38 in the MAAL

Jeremiah 38 in the MBV

Jeremiah 38 in the MBV2

Jeremiah 38 in the MHNT

Jeremiah 38 in the MKNFD

Jeremiah 38 in the MNG

Jeremiah 38 in the MNT

Jeremiah 38 in the MNT2

Jeremiah 38 in the MRS1T

Jeremiah 38 in the NAA

Jeremiah 38 in the NASB

Jeremiah 38 in the NBLA

Jeremiah 38 in the NBS

Jeremiah 38 in the NBVTP

Jeremiah 38 in the NET2

Jeremiah 38 in the NIV11

Jeremiah 38 in the NNT

Jeremiah 38 in the NNT2

Jeremiah 38 in the NNT3

Jeremiah 38 in the PDDPT

Jeremiah 38 in the PFNT

Jeremiah 38 in the RMNT

Jeremiah 38 in the SBIAS

Jeremiah 38 in the SBIBS

Jeremiah 38 in the SBIBS2

Jeremiah 38 in the SBICS

Jeremiah 38 in the SBIDS

Jeremiah 38 in the SBIGS

Jeremiah 38 in the SBIHS

Jeremiah 38 in the SBIIS

Jeremiah 38 in the SBIIS2

Jeremiah 38 in the SBIIS3

Jeremiah 38 in the SBIKS

Jeremiah 38 in the SBIKS2

Jeremiah 38 in the SBIMS

Jeremiah 38 in the SBIOS

Jeremiah 38 in the SBIPS

Jeremiah 38 in the SBISS

Jeremiah 38 in the SBITS

Jeremiah 38 in the SBITS2

Jeremiah 38 in the SBITS3

Jeremiah 38 in the SBITS4

Jeremiah 38 in the SBIUS

Jeremiah 38 in the SBIVS

Jeremiah 38 in the SBT

Jeremiah 38 in the SBT1E

Jeremiah 38 in the SCHL

Jeremiah 38 in the SNT

Jeremiah 38 in the SUSU

Jeremiah 38 in the SUSU2

Jeremiah 38 in the SYNO

Jeremiah 38 in the TBIAOTANT

Jeremiah 38 in the TBT1E

Jeremiah 38 in the TBT1E2

Jeremiah 38 in the TFTIP

Jeremiah 38 in the TFTU

Jeremiah 38 in the TGNTATF3T

Jeremiah 38 in the THAI

Jeremiah 38 in the TNFD

Jeremiah 38 in the TNT

Jeremiah 38 in the TNTIK

Jeremiah 38 in the TNTIL

Jeremiah 38 in the TNTIN

Jeremiah 38 in the TNTIP

Jeremiah 38 in the TNTIZ

Jeremiah 38 in the TOMA

Jeremiah 38 in the TTENT

Jeremiah 38 in the UBG

Jeremiah 38 in the UGV

Jeremiah 38 in the UGV2

Jeremiah 38 in the UGV3

Jeremiah 38 in the VBL

Jeremiah 38 in the VDCC

Jeremiah 38 in the YALU

Jeremiah 38 in the YAPE

Jeremiah 38 in the YBVTP

Jeremiah 38 in the ZBP