Jeremiah 42 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere 2 Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo ONYENWE ANYỊ Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole. 3 Kpee ekpere ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.” 4 Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere ONYENWE ANYỊ Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile ONYENWE ANYỊ kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.” 5 Ha sịrị Jeremaya, “Ka ONYENWE ANYỊ bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị. 6 Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere ONYENWE ANYỊ Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.” 7 Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị. 8 Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. 9 Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị: 10 ‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu. 11 Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya. 12 Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’ 13 “Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe ONYENWE ANYỊ Chineke unu nọ; 14 ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’ 15 mgbe ahụ, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị fọdụrụ na Juda. Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike na mkpebi unu ịga Ijipt ibiri nʼebe ahụ, ọ bụrụkwa na unu agaa biri nʼIjipt nʼeziokwu, 16 mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ. 17 Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’ 18 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’ 19 “Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na ONYENWE ANYỊ agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị, 20 na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta ONYENWE ANYỊ Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị ONYENWE ANYỊ Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’ 21 Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile ONYENWE ANYỊ Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru. 22 Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”

In Other Versions

Jeremiah 42 in the ANGEFD

Jeremiah 42 in the ANTPNG2D

Jeremiah 42 in the AS21

Jeremiah 42 in the BAGH

Jeremiah 42 in the BBPNG

Jeremiah 42 in the BBT1E

Jeremiah 42 in the BDS

Jeremiah 42 in the BEV

Jeremiah 42 in the BHAD

Jeremiah 42 in the BIB

Jeremiah 42 in the BLPT

Jeremiah 42 in the BNT

Jeremiah 42 in the BNTABOOT

Jeremiah 42 in the BNTLV

Jeremiah 42 in the BOATCB

Jeremiah 42 in the BOATCB2

Jeremiah 42 in the BOBCV

Jeremiah 42 in the BOCNT

Jeremiah 42 in the BOECS

Jeremiah 42 in the BOGWICC

Jeremiah 42 in the BOHCB

Jeremiah 42 in the BOHCV

Jeremiah 42 in the BOHLNT

Jeremiah 42 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 42 in the BOILNTAP

Jeremiah 42 in the BOITCV

Jeremiah 42 in the BOKCV

Jeremiah 42 in the BOKCV2

Jeremiah 42 in the BOKHWOG

Jeremiah 42 in the BOKSSV

Jeremiah 42 in the BOLCB

Jeremiah 42 in the BOLCB2

Jeremiah 42 in the BOMCV

Jeremiah 42 in the BONAV

Jeremiah 42 in the BONCB

Jeremiah 42 in the BONLT

Jeremiah 42 in the BONUT2

Jeremiah 42 in the BOPLNT

Jeremiah 42 in the BOSCB

Jeremiah 42 in the BOSNC

Jeremiah 42 in the BOTLNT

Jeremiah 42 in the BOVCB

Jeremiah 42 in the BOYCB

Jeremiah 42 in the BPBB

Jeremiah 42 in the BPH

Jeremiah 42 in the BSB

Jeremiah 42 in the CCB

Jeremiah 42 in the CUV

Jeremiah 42 in the CUVS

Jeremiah 42 in the DBT

Jeremiah 42 in the DGDNT

Jeremiah 42 in the DHNT

Jeremiah 42 in the DNT

Jeremiah 42 in the ELBE

Jeremiah 42 in the EMTV

Jeremiah 42 in the ESV

Jeremiah 42 in the FBV

Jeremiah 42 in the FEB

Jeremiah 42 in the GGMNT

Jeremiah 42 in the GNT

Jeremiah 42 in the HARY

Jeremiah 42 in the HNT

Jeremiah 42 in the IRVA

Jeremiah 42 in the IRVB

Jeremiah 42 in the IRVG

Jeremiah 42 in the IRVH

Jeremiah 42 in the IRVK

Jeremiah 42 in the IRVM

Jeremiah 42 in the IRVM2

Jeremiah 42 in the IRVO

Jeremiah 42 in the IRVP

Jeremiah 42 in the IRVT

Jeremiah 42 in the IRVT2

Jeremiah 42 in the IRVU

Jeremiah 42 in the ISVN

Jeremiah 42 in the JSNT

Jeremiah 42 in the KAPI

Jeremiah 42 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 42 in the KBV

Jeremiah 42 in the KJV

Jeremiah 42 in the KNFD

Jeremiah 42 in the LBA

Jeremiah 42 in the LBLA

Jeremiah 42 in the LNT

Jeremiah 42 in the LSV

Jeremiah 42 in the MAAL

Jeremiah 42 in the MBV

Jeremiah 42 in the MBV2

Jeremiah 42 in the MHNT

Jeremiah 42 in the MKNFD

Jeremiah 42 in the MNG

Jeremiah 42 in the MNT

Jeremiah 42 in the MNT2

Jeremiah 42 in the MRS1T

Jeremiah 42 in the NAA

Jeremiah 42 in the NASB

Jeremiah 42 in the NBLA

Jeremiah 42 in the NBS

Jeremiah 42 in the NBVTP

Jeremiah 42 in the NET2

Jeremiah 42 in the NIV11

Jeremiah 42 in the NNT

Jeremiah 42 in the NNT2

Jeremiah 42 in the NNT3

Jeremiah 42 in the PDDPT

Jeremiah 42 in the PFNT

Jeremiah 42 in the RMNT

Jeremiah 42 in the SBIAS

Jeremiah 42 in the SBIBS

Jeremiah 42 in the SBIBS2

Jeremiah 42 in the SBICS

Jeremiah 42 in the SBIDS

Jeremiah 42 in the SBIGS

Jeremiah 42 in the SBIHS

Jeremiah 42 in the SBIIS

Jeremiah 42 in the SBIIS2

Jeremiah 42 in the SBIIS3

Jeremiah 42 in the SBIKS

Jeremiah 42 in the SBIKS2

Jeremiah 42 in the SBIMS

Jeremiah 42 in the SBIOS

Jeremiah 42 in the SBIPS

Jeremiah 42 in the SBISS

Jeremiah 42 in the SBITS

Jeremiah 42 in the SBITS2

Jeremiah 42 in the SBITS3

Jeremiah 42 in the SBITS4

Jeremiah 42 in the SBIUS

Jeremiah 42 in the SBIVS

Jeremiah 42 in the SBT

Jeremiah 42 in the SBT1E

Jeremiah 42 in the SCHL

Jeremiah 42 in the SNT

Jeremiah 42 in the SUSU

Jeremiah 42 in the SUSU2

Jeremiah 42 in the SYNO

Jeremiah 42 in the TBIAOTANT

Jeremiah 42 in the TBT1E

Jeremiah 42 in the TBT1E2

Jeremiah 42 in the TFTIP

Jeremiah 42 in the TFTU

Jeremiah 42 in the TGNTATF3T

Jeremiah 42 in the THAI

Jeremiah 42 in the TNFD

Jeremiah 42 in the TNT

Jeremiah 42 in the TNTIK

Jeremiah 42 in the TNTIL

Jeremiah 42 in the TNTIN

Jeremiah 42 in the TNTIP

Jeremiah 42 in the TNTIZ

Jeremiah 42 in the TOMA

Jeremiah 42 in the TTENT

Jeremiah 42 in the UBG

Jeremiah 42 in the UGV

Jeremiah 42 in the UGV2

Jeremiah 42 in the UGV3

Jeremiah 42 in the VBL

Jeremiah 42 in the VDCC

Jeremiah 42 in the YALU

Jeremiah 42 in the YAPE

Jeremiah 42 in the YBVTP

Jeremiah 42 in the ZBP