Joshua 14 (BOICB)
1 Otu a ka esi kenye ndị Izrel ala Kenan, bụ nke Elieza onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndị ndu ikwu niile dị nʼebo Izrel kere. 2 Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya Mosis nʼiwu. 3 Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha. 4 Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem. Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. 5 Ndị Izrel keere ala ahụ nʼusoro dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 6 Nʼoge a, ụmụ Juda zipụrụ ndị ozi ndị jekwuuru Joshua na Gilgal. Kaleb, nwa Jefune, onye Keniz so ha nʼije a. Mgbe ha bịarutere, Kaleb gwara Joshua okwu sị ya, “I chetakwara okwu ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Mosis onye nke Chineke banyere gị na banyere mụ onwe m, mgbe anyị nọ na Kadesh Banea? 7 Agbara m iri afọ anọ nʼoge ahụ Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ si na Kadesh Banea zipụ anyị ịga iledo ala ndị Kenan anya. Mgbe anyị lọghachiri, agwara m ya okwu, kọwaara ya ihe m chere nʼobi m bụ eziokwu. 8 Ma ụmụnna anyị, ndị anyị na ha so gaa, menyere ụmụ Izrel egwu, mee ka obi ha daa mba ịchọ ịbanye nʼala ahụ e kwere anyị na nkwa. Ma ebe m nọgidere jiri obi m niile soro ONYENWE ANYỊ Chineke m, 9 Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro ONYENWE ANYỊ Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’ 10 “Ugbu a, dịka ONYENWE ANYỊ kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa. 11 M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa 12 Ya mere, nye m ala ugwu ugwu ahụ ONYENWE ANYỊ kwere m nkwa nʼụbọchị ahụ. Gị onwe gị nụrụ nʼoge ahụ na ụmụ Anak bi nʼebe ahụ, na obodo ha bukwara ibu, na e jikwa mgbidi e wusiri ike gbaa ha gburugburu. Ma site nʼinyeaka ONYENWE ANYỊ, aga m achụpụ ha dịka ONYENWE ANYỊ kwuru.” 13 Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya. 14 Ya mere, obodo Hebrọn ghọrọ ihe nketa Kaleb nwa Jefune onye Keniz bido mgbe ahụ, nʼihi na o ji obi ya niile soro ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel. 15 Tupu oge a, aha a na-akpọ Hebrọn bụ Kiriat Aaba, nke pụtara Obodo Aaba. Aaba bụkwa aha nwoke kachasị ịdị ukwuu nʼetiti ndị Anak niile.Site nʼoge a gaa nʼihu, e nwere udo nʼala ahụ niile.
In Other Versions
Joshua 14 in the ANGEFD
Joshua 14 in the ANTPNG2D
Joshua 14 in the AS21
Joshua 14 in the BAGH
Joshua 14 in the BBPNG
Joshua 14 in the BBT1E
Joshua 14 in the BDS
Joshua 14 in the BEV
Joshua 14 in the BHAD
Joshua 14 in the BIB
Joshua 14 in the BLPT
Joshua 14 in the BNT
Joshua 14 in the BNTABOOT
Joshua 14 in the BNTLV
Joshua 14 in the BOATCB
Joshua 14 in the BOATCB2
Joshua 14 in the BOBCV
Joshua 14 in the BOCNT
Joshua 14 in the BOECS
Joshua 14 in the BOGWICC
Joshua 14 in the BOHCB
Joshua 14 in the BOHCV
Joshua 14 in the BOHLNT
Joshua 14 in the BOHNTLTAL
Joshua 14 in the BOILNTAP
Joshua 14 in the BOITCV
Joshua 14 in the BOKCV
Joshua 14 in the BOKCV2
Joshua 14 in the BOKHWOG
Joshua 14 in the BOKSSV
Joshua 14 in the BOLCB
Joshua 14 in the BOLCB2
Joshua 14 in the BOMCV
Joshua 14 in the BONAV
Joshua 14 in the BONCB
Joshua 14 in the BONLT
Joshua 14 in the BONUT2
Joshua 14 in the BOPLNT
Joshua 14 in the BOSCB
Joshua 14 in the BOSNC
Joshua 14 in the BOTLNT
Joshua 14 in the BOVCB
Joshua 14 in the BOYCB
Joshua 14 in the BPBB
Joshua 14 in the BPH
Joshua 14 in the BSB
Joshua 14 in the CCB
Joshua 14 in the CUV
Joshua 14 in the CUVS
Joshua 14 in the DBT
Joshua 14 in the DGDNT
Joshua 14 in the DHNT
Joshua 14 in the DNT
Joshua 14 in the ELBE
Joshua 14 in the EMTV
Joshua 14 in the ESV
Joshua 14 in the FBV
Joshua 14 in the FEB
Joshua 14 in the GGMNT
Joshua 14 in the GNT
Joshua 14 in the HARY
Joshua 14 in the HNT
Joshua 14 in the IRVA
Joshua 14 in the IRVB
Joshua 14 in the IRVG
Joshua 14 in the IRVH
Joshua 14 in the IRVK
Joshua 14 in the IRVM
Joshua 14 in the IRVM2
Joshua 14 in the IRVO
Joshua 14 in the IRVP
Joshua 14 in the IRVT
Joshua 14 in the IRVT2
Joshua 14 in the IRVU
Joshua 14 in the ISVN
Joshua 14 in the JSNT
Joshua 14 in the KAPI
Joshua 14 in the KBT1ETNIK
Joshua 14 in the KBV
Joshua 14 in the KJV
Joshua 14 in the KNFD
Joshua 14 in the LBA
Joshua 14 in the LBLA
Joshua 14 in the LNT
Joshua 14 in the LSV
Joshua 14 in the MAAL
Joshua 14 in the MBV
Joshua 14 in the MBV2
Joshua 14 in the MHNT
Joshua 14 in the MKNFD
Joshua 14 in the MNG
Joshua 14 in the MNT
Joshua 14 in the MNT2
Joshua 14 in the MRS1T
Joshua 14 in the NAA
Joshua 14 in the NASB
Joshua 14 in the NBLA
Joshua 14 in the NBS
Joshua 14 in the NBVTP
Joshua 14 in the NET2
Joshua 14 in the NIV11
Joshua 14 in the NNT
Joshua 14 in the NNT2
Joshua 14 in the NNT3
Joshua 14 in the PDDPT
Joshua 14 in the PFNT
Joshua 14 in the RMNT
Joshua 14 in the SBIAS
Joshua 14 in the SBIBS
Joshua 14 in the SBIBS2
Joshua 14 in the SBICS
Joshua 14 in the SBIDS
Joshua 14 in the SBIGS
Joshua 14 in the SBIHS
Joshua 14 in the SBIIS
Joshua 14 in the SBIIS2
Joshua 14 in the SBIIS3
Joshua 14 in the SBIKS
Joshua 14 in the SBIKS2
Joshua 14 in the SBIMS
Joshua 14 in the SBIOS
Joshua 14 in the SBIPS
Joshua 14 in the SBISS
Joshua 14 in the SBITS
Joshua 14 in the SBITS2
Joshua 14 in the SBITS3
Joshua 14 in the SBITS4
Joshua 14 in the SBIUS
Joshua 14 in the SBIVS
Joshua 14 in the SBT
Joshua 14 in the SBT1E
Joshua 14 in the SCHL
Joshua 14 in the SNT
Joshua 14 in the SUSU
Joshua 14 in the SUSU2
Joshua 14 in the SYNO
Joshua 14 in the TBIAOTANT
Joshua 14 in the TBT1E
Joshua 14 in the TBT1E2
Joshua 14 in the TFTIP
Joshua 14 in the TFTU
Joshua 14 in the TGNTATF3T
Joshua 14 in the THAI
Joshua 14 in the TNFD
Joshua 14 in the TNT
Joshua 14 in the TNTIK
Joshua 14 in the TNTIL
Joshua 14 in the TNTIN
Joshua 14 in the TNTIP
Joshua 14 in the TNTIZ
Joshua 14 in the TOMA
Joshua 14 in the TTENT
Joshua 14 in the UBG
Joshua 14 in the UGV
Joshua 14 in the UGV2
Joshua 14 in the UGV3
Joshua 14 in the VBL
Joshua 14 in the VDCC
Joshua 14 in the YALU
Joshua 14 in the YAPE
Joshua 14 in the YBVTP
Joshua 14 in the ZBP