Joshua 24 (BOICB)

1 Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke. 2 Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe. 3 Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik. 4 Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt. 5 “ ‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt. 6 Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ. 7 Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo ONYENWE ANYỊ. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ. 8 “ ‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha. 9 Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ. 10 Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya. 11 “ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka. 12 E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a. 13 Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’ 14 “Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu ONYENWE ANYỊ, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị ONYENWE ANYỊ ofufe. 15 Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife ONYENWE ANYỊ, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe ONYENWE ANYỊ.” 16 Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ ONYENWE ANYỊ fee chi ndị ọzọ! 17 Ọ bụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. 18 Ọ bụ ONYENWE ANYỊ chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.” 19 Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife ONYENWE ANYỊ ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. 20 Ọ bụrụ na unu agbakụta ONYENWE ANYỊ azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.” 21 Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama ONYENWE ANYỊ ka anyị ga-efe ofufe.” 22 Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife ONYENWE ANYỊ ofufe.”Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.” 23 Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere ONYENWE ANYỊ Chineke Izrel isi.” 24 Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe ONYENWE ANYỊ Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.” 25 Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe. 26 Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ ONYENWE ANYỊ. 27 Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke ONYENWE ANYỊ gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.” 28 Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha. 29 Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo ONYENWE ANYỊ nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri. 30 E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash. 31 Ndị Izrel fere ONYENWE ANYỊ ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke ONYENWE ANYỊ rụụrụ ndị Izrel. 32 Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef. 33 Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz.

In Other Versions

Joshua 24 in the ANGEFD

Joshua 24 in the ANTPNG2D

Joshua 24 in the AS21

Joshua 24 in the BAGH

Joshua 24 in the BBPNG

Joshua 24 in the BBT1E

Joshua 24 in the BDS

Joshua 24 in the BEV

Joshua 24 in the BHAD

Joshua 24 in the BIB

Joshua 24 in the BLPT

Joshua 24 in the BNT

Joshua 24 in the BNTABOOT

Joshua 24 in the BNTLV

Joshua 24 in the BOATCB

Joshua 24 in the BOATCB2

Joshua 24 in the BOBCV

Joshua 24 in the BOCNT

Joshua 24 in the BOECS

Joshua 24 in the BOGWICC

Joshua 24 in the BOHCB

Joshua 24 in the BOHCV

Joshua 24 in the BOHLNT

Joshua 24 in the BOHNTLTAL

Joshua 24 in the BOILNTAP

Joshua 24 in the BOITCV

Joshua 24 in the BOKCV

Joshua 24 in the BOKCV2

Joshua 24 in the BOKHWOG

Joshua 24 in the BOKSSV

Joshua 24 in the BOLCB

Joshua 24 in the BOLCB2

Joshua 24 in the BOMCV

Joshua 24 in the BONAV

Joshua 24 in the BONCB

Joshua 24 in the BONLT

Joshua 24 in the BONUT2

Joshua 24 in the BOPLNT

Joshua 24 in the BOSCB

Joshua 24 in the BOSNC

Joshua 24 in the BOTLNT

Joshua 24 in the BOVCB

Joshua 24 in the BOYCB

Joshua 24 in the BPBB

Joshua 24 in the BPH

Joshua 24 in the BSB

Joshua 24 in the CCB

Joshua 24 in the CUV

Joshua 24 in the CUVS

Joshua 24 in the DBT

Joshua 24 in the DGDNT

Joshua 24 in the DHNT

Joshua 24 in the DNT

Joshua 24 in the ELBE

Joshua 24 in the EMTV

Joshua 24 in the ESV

Joshua 24 in the FBV

Joshua 24 in the FEB

Joshua 24 in the GGMNT

Joshua 24 in the GNT

Joshua 24 in the HARY

Joshua 24 in the HNT

Joshua 24 in the IRVA

Joshua 24 in the IRVB

Joshua 24 in the IRVG

Joshua 24 in the IRVH

Joshua 24 in the IRVK

Joshua 24 in the IRVM

Joshua 24 in the IRVM2

Joshua 24 in the IRVO

Joshua 24 in the IRVP

Joshua 24 in the IRVT

Joshua 24 in the IRVT2

Joshua 24 in the IRVU

Joshua 24 in the ISVN

Joshua 24 in the JSNT

Joshua 24 in the KAPI

Joshua 24 in the KBT1ETNIK

Joshua 24 in the KBV

Joshua 24 in the KJV

Joshua 24 in the KNFD

Joshua 24 in the LBA

Joshua 24 in the LBLA

Joshua 24 in the LNT

Joshua 24 in the LSV

Joshua 24 in the MAAL

Joshua 24 in the MBV

Joshua 24 in the MBV2

Joshua 24 in the MHNT

Joshua 24 in the MKNFD

Joshua 24 in the MNG

Joshua 24 in the MNT

Joshua 24 in the MNT2

Joshua 24 in the MRS1T

Joshua 24 in the NAA

Joshua 24 in the NASB

Joshua 24 in the NBLA

Joshua 24 in the NBS

Joshua 24 in the NBVTP

Joshua 24 in the NET2

Joshua 24 in the NIV11

Joshua 24 in the NNT

Joshua 24 in the NNT2

Joshua 24 in the NNT3

Joshua 24 in the PDDPT

Joshua 24 in the PFNT

Joshua 24 in the RMNT

Joshua 24 in the SBIAS

Joshua 24 in the SBIBS

Joshua 24 in the SBIBS2

Joshua 24 in the SBICS

Joshua 24 in the SBIDS

Joshua 24 in the SBIGS

Joshua 24 in the SBIHS

Joshua 24 in the SBIIS

Joshua 24 in the SBIIS2

Joshua 24 in the SBIIS3

Joshua 24 in the SBIKS

Joshua 24 in the SBIKS2

Joshua 24 in the SBIMS

Joshua 24 in the SBIOS

Joshua 24 in the SBIPS

Joshua 24 in the SBISS

Joshua 24 in the SBITS

Joshua 24 in the SBITS2

Joshua 24 in the SBITS3

Joshua 24 in the SBITS4

Joshua 24 in the SBIUS

Joshua 24 in the SBIVS

Joshua 24 in the SBT

Joshua 24 in the SBT1E

Joshua 24 in the SCHL

Joshua 24 in the SNT

Joshua 24 in the SUSU

Joshua 24 in the SUSU2

Joshua 24 in the SYNO

Joshua 24 in the TBIAOTANT

Joshua 24 in the TBT1E

Joshua 24 in the TBT1E2

Joshua 24 in the TFTIP

Joshua 24 in the TFTU

Joshua 24 in the TGNTATF3T

Joshua 24 in the THAI

Joshua 24 in the TNFD

Joshua 24 in the TNT

Joshua 24 in the TNTIK

Joshua 24 in the TNTIL

Joshua 24 in the TNTIN

Joshua 24 in the TNTIP

Joshua 24 in the TNTIZ

Joshua 24 in the TOMA

Joshua 24 in the TTENT

Joshua 24 in the UBG

Joshua 24 in the UGV

Joshua 24 in the UGV2

Joshua 24 in the UGV3

Joshua 24 in the VBL

Joshua 24 in the VDCC

Joshua 24 in the YALU

Joshua 24 in the YAPE

Joshua 24 in the YBVTP

Joshua 24 in the ZBP