Joshua 6 (BOICB)

1 Ma e mechiri ọnụ ụzọ e si abata Jeriko nke ọma, nʼihi ụmụ Izrel. Ọ dịghị onye ọbụla na-apụ nʼezi, ọ dịghịkwa onye na-abata nʼime ya. 2 Ma ONYENWE ANYỊ gwara Joshua sị, “Lee, enyefela m obodo a bụ Jeriko, ya na eze ya, na ndị dị ike ibu agha nọ nʼime ya, nʼaka gị. 3 Gị na ndị agha gị zọọnụ ije gburugburu obodo a. Unu ga-ejegharị gburugburu mgbidi obodo a otu ugbo nʼụbọchị. Unu ga-esi otu a jegharịa ụbọchị isii. 4 Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha. 5 Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.” 6 Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.” 7 Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ.” 8 Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu ONYENWE ANYỊ, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ sochiri ha azụ. 9 Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a. 10 Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.” 11 Ya mere, e buuru igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ jegharịa obodo ahụ gburugburu otu ugboro nʼụbọchị ahụ. Mgbe ha mesịrị nke a, onye ọbụla laghachiri nʼebe ụlọ ikwu ya dị rahụ ụra abalị. 12 Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. 13 Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka. 14 Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii. 15 Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. 16 O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na ONYENWE ANYỊ enyela unu obodo a! 17 Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye ONYENWE ANYỊ. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ. 18 Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile. 19 Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye ONYENWE ANYỊ. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ ONYENWE ANYỊ.” 20 Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ. 21 Ha debere obodo a iche nye ONYENWE ANYỊ site nʼiji mma agha ha gbuchapụ ihe niile dị ndụ nʼobodo ahụ, ma nwoke, ma nwanyị, ma nwantakịrị, ma okenye, ma ehi, ma atụrụ, ma ịnyịnya ibu, ihe niile dị nʼime ya. 22 Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.” 23 Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel. 24 Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ ONYENWE ANYỊ. 25 Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa. 26 Mgbe ahụ, Joshua gbara obodo Jeriko iyi sị, “Ọbụbụ ọnụ ka a na-abụ nwoke ọbụla nʼihu ONYENWE ANYỊ nke ga-ebili wuokwa obodo Jeriko ọzọ.“Ndụ ọkpara ya ka ọ ga-ejitọọ ntọala ya niile,ndụ nwa ya nke nta,ka ọ ga-eji guzobe ọnụ ụzọ ama ya niile ọtọ.” 27 Ya mere, ONYENWE ANYỊ nọnyeere Joshua. Akụkọ a kọrọ banyere ya gbasara nke ukwuu nʼala ahụ niile.

In Other Versions

Joshua 6 in the ANGEFD

Joshua 6 in the ANTPNG2D

Joshua 6 in the AS21

Joshua 6 in the BAGH

Joshua 6 in the BBPNG

Joshua 6 in the BBT1E

Joshua 6 in the BDS

Joshua 6 in the BEV

Joshua 6 in the BHAD

Joshua 6 in the BIB

Joshua 6 in the BLPT

Joshua 6 in the BNT

Joshua 6 in the BNTABOOT

Joshua 6 in the BNTLV

Joshua 6 in the BOATCB

Joshua 6 in the BOATCB2

Joshua 6 in the BOBCV

Joshua 6 in the BOCNT

Joshua 6 in the BOECS

Joshua 6 in the BOGWICC

Joshua 6 in the BOHCB

Joshua 6 in the BOHCV

Joshua 6 in the BOHLNT

Joshua 6 in the BOHNTLTAL

Joshua 6 in the BOILNTAP

Joshua 6 in the BOITCV

Joshua 6 in the BOKCV

Joshua 6 in the BOKCV2

Joshua 6 in the BOKHWOG

Joshua 6 in the BOKSSV

Joshua 6 in the BOLCB

Joshua 6 in the BOLCB2

Joshua 6 in the BOMCV

Joshua 6 in the BONAV

Joshua 6 in the BONCB

Joshua 6 in the BONLT

Joshua 6 in the BONUT2

Joshua 6 in the BOPLNT

Joshua 6 in the BOSCB

Joshua 6 in the BOSNC

Joshua 6 in the BOTLNT

Joshua 6 in the BOVCB

Joshua 6 in the BOYCB

Joshua 6 in the BPBB

Joshua 6 in the BPH

Joshua 6 in the BSB

Joshua 6 in the CCB

Joshua 6 in the CUV

Joshua 6 in the CUVS

Joshua 6 in the DBT

Joshua 6 in the DGDNT

Joshua 6 in the DHNT

Joshua 6 in the DNT

Joshua 6 in the ELBE

Joshua 6 in the EMTV

Joshua 6 in the ESV

Joshua 6 in the FBV

Joshua 6 in the FEB

Joshua 6 in the GGMNT

Joshua 6 in the GNT

Joshua 6 in the HARY

Joshua 6 in the HNT

Joshua 6 in the IRVA

Joshua 6 in the IRVB

Joshua 6 in the IRVG

Joshua 6 in the IRVH

Joshua 6 in the IRVK

Joshua 6 in the IRVM

Joshua 6 in the IRVM2

Joshua 6 in the IRVO

Joshua 6 in the IRVP

Joshua 6 in the IRVT

Joshua 6 in the IRVT2

Joshua 6 in the IRVU

Joshua 6 in the ISVN

Joshua 6 in the JSNT

Joshua 6 in the KAPI

Joshua 6 in the KBT1ETNIK

Joshua 6 in the KBV

Joshua 6 in the KJV

Joshua 6 in the KNFD

Joshua 6 in the LBA

Joshua 6 in the LBLA

Joshua 6 in the LNT

Joshua 6 in the LSV

Joshua 6 in the MAAL

Joshua 6 in the MBV

Joshua 6 in the MBV2

Joshua 6 in the MHNT

Joshua 6 in the MKNFD

Joshua 6 in the MNG

Joshua 6 in the MNT

Joshua 6 in the MNT2

Joshua 6 in the MRS1T

Joshua 6 in the NAA

Joshua 6 in the NASB

Joshua 6 in the NBLA

Joshua 6 in the NBS

Joshua 6 in the NBVTP

Joshua 6 in the NET2

Joshua 6 in the NIV11

Joshua 6 in the NNT

Joshua 6 in the NNT2

Joshua 6 in the NNT3

Joshua 6 in the PDDPT

Joshua 6 in the PFNT

Joshua 6 in the RMNT

Joshua 6 in the SBIAS

Joshua 6 in the SBIBS

Joshua 6 in the SBIBS2

Joshua 6 in the SBICS

Joshua 6 in the SBIDS

Joshua 6 in the SBIGS

Joshua 6 in the SBIHS

Joshua 6 in the SBIIS

Joshua 6 in the SBIIS2

Joshua 6 in the SBIIS3

Joshua 6 in the SBIKS

Joshua 6 in the SBIKS2

Joshua 6 in the SBIMS

Joshua 6 in the SBIOS

Joshua 6 in the SBIPS

Joshua 6 in the SBISS

Joshua 6 in the SBITS

Joshua 6 in the SBITS2

Joshua 6 in the SBITS3

Joshua 6 in the SBITS4

Joshua 6 in the SBIUS

Joshua 6 in the SBIVS

Joshua 6 in the SBT

Joshua 6 in the SBT1E

Joshua 6 in the SCHL

Joshua 6 in the SNT

Joshua 6 in the SUSU

Joshua 6 in the SUSU2

Joshua 6 in the SYNO

Joshua 6 in the TBIAOTANT

Joshua 6 in the TBT1E

Joshua 6 in the TBT1E2

Joshua 6 in the TFTIP

Joshua 6 in the TFTU

Joshua 6 in the TGNTATF3T

Joshua 6 in the THAI

Joshua 6 in the TNFD

Joshua 6 in the TNT

Joshua 6 in the TNTIK

Joshua 6 in the TNTIL

Joshua 6 in the TNTIN

Joshua 6 in the TNTIP

Joshua 6 in the TNTIZ

Joshua 6 in the TOMA

Joshua 6 in the TTENT

Joshua 6 in the UBG

Joshua 6 in the UGV

Joshua 6 in the UGV2

Joshua 6 in the UGV3

Joshua 6 in the VBL

Joshua 6 in the VDCC

Joshua 6 in the YALU

Joshua 6 in the YAPE

Joshua 6 in the YBVTP

Joshua 6 in the ZBP