Joshua 9 (BOICB)

1 Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, 2 ha niile zukọtara ibu agha megide Joshua na ụmụ Izrel. 3 Ma mgbe ndị Gibiọn nụrụ ihe Joshua mere Jeriko na Ai, 4 ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha. 5 Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu. 6 Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.” 7 Ndị ikom Izrel zaghachiri sị ndị Hiv ahụ, “Olee otu anyị si amata na unu ebighị anyị nso? Ma eleghị anya unu bi anyị nso, anyị na unu ọ ga-esi aṅaa gbaa ndụ?” 8 Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.”Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?” 9 Ha zara ya sị, “Ala anyị, ebe ndị ohu gị si bịa dị anya nke ukwuu. Anyị bịara nʼihi na anyị anụla akụkọ banyere ONYENWE ANYỊ Chineke unu, na ihe niile o mere nʼIjipt. 10 Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọrait, ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, Saịhọn eze Heshbọn, na Ọg eze Bashan, onye chịrị nʼAshtarọt. 11 Ndị okenye anyị na ndị niile bi nʼala anyị sịrị anyị, ‘Werenụ ihe unu ji aga njem, jekwurunụ ndị Izrel sị ha, “Anyị bụ ndị ohu unu, kwerenụ ka anyị na unu gbaa ndụ.” ’ 12 Lee achịcha ndị a bụ nke anyị ji mgbe anyị hapụrụ ala anyị. Ha dị ọkụ mgbe anyị hapụrụ ụlọ anyị ịbịa njem a, nʼihi na e si nʼebe a na-eghe ya wepụta ya, ma ugbu a, dịka unu hụrụ, ha akpọọla nkụ, bidokwa ịma ebu. 13 A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.” 14 Ndị ikom Izrel ritụrụ ụfọdụ nʼime ihe oriri ha ji bịa, ma ha ajụtaghị ihe bụ uche ONYENWE ANYỊ. 15 Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi. 16 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso. 17 Ya mere, ndị Izrel buliri ije gaa ịchọpụta ebe ndị a si bịa, si otu a bịaruo obodo ha niile nʼụbọchị nke atọ. Aha obodo ha bụ Gibiọn, Kefira, Beerọt na Kiriat Jearim. 18 Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ.Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a. 19 Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla. 20 Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe ONYENWE ANYỊ ga-adakwasị anyị niile.” 21 Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ. 22 Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso? 23 Ugbu a, unu ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, unu aghọọla ndị ohu anyị, ndị ga na-awara anyị nkụ mgbe niile, na ndị ga na-ekutere anyị mmiri nke anyị ga-eji rụọ ọrụ nʼụlọnsọ Chineke m.” 24 Ha zara Joshua sị, “Anyị mere nke a nʼihi na agwala anyị na ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere Mosis iwu sị ya merie ala ndị a niile, ma kpochapụ ndị niile bi nʼime ya. Ọ bụ nke a mere ụjọ ji tụọ anyị. Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe dị otu a, nʼihi ichebe ndụ anyị. 25 Ma ugbu a, anyị dị unu nʼaka. Unu nwere ike ime anyị ihe dị unu mma.” 26 Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha. 27 Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ, nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.

In Other Versions

Joshua 9 in the ANGEFD

Joshua 9 in the ANTPNG2D

Joshua 9 in the AS21

Joshua 9 in the BAGH

Joshua 9 in the BBPNG

Joshua 9 in the BBT1E

Joshua 9 in the BDS

Joshua 9 in the BEV

Joshua 9 in the BHAD

Joshua 9 in the BIB

Joshua 9 in the BLPT

Joshua 9 in the BNT

Joshua 9 in the BNTABOOT

Joshua 9 in the BNTLV

Joshua 9 in the BOATCB

Joshua 9 in the BOATCB2

Joshua 9 in the BOBCV

Joshua 9 in the BOCNT

Joshua 9 in the BOECS

Joshua 9 in the BOGWICC

Joshua 9 in the BOHCB

Joshua 9 in the BOHCV

Joshua 9 in the BOHLNT

Joshua 9 in the BOHNTLTAL

Joshua 9 in the BOILNTAP

Joshua 9 in the BOITCV

Joshua 9 in the BOKCV

Joshua 9 in the BOKCV2

Joshua 9 in the BOKHWOG

Joshua 9 in the BOKSSV

Joshua 9 in the BOLCB

Joshua 9 in the BOLCB2

Joshua 9 in the BOMCV

Joshua 9 in the BONAV

Joshua 9 in the BONCB

Joshua 9 in the BONLT

Joshua 9 in the BONUT2

Joshua 9 in the BOPLNT

Joshua 9 in the BOSCB

Joshua 9 in the BOSNC

Joshua 9 in the BOTLNT

Joshua 9 in the BOVCB

Joshua 9 in the BOYCB

Joshua 9 in the BPBB

Joshua 9 in the BPH

Joshua 9 in the BSB

Joshua 9 in the CCB

Joshua 9 in the CUV

Joshua 9 in the CUVS

Joshua 9 in the DBT

Joshua 9 in the DGDNT

Joshua 9 in the DHNT

Joshua 9 in the DNT

Joshua 9 in the ELBE

Joshua 9 in the EMTV

Joshua 9 in the ESV

Joshua 9 in the FBV

Joshua 9 in the FEB

Joshua 9 in the GGMNT

Joshua 9 in the GNT

Joshua 9 in the HARY

Joshua 9 in the HNT

Joshua 9 in the IRVA

Joshua 9 in the IRVB

Joshua 9 in the IRVG

Joshua 9 in the IRVH

Joshua 9 in the IRVK

Joshua 9 in the IRVM

Joshua 9 in the IRVM2

Joshua 9 in the IRVO

Joshua 9 in the IRVP

Joshua 9 in the IRVT

Joshua 9 in the IRVT2

Joshua 9 in the IRVU

Joshua 9 in the ISVN

Joshua 9 in the JSNT

Joshua 9 in the KAPI

Joshua 9 in the KBT1ETNIK

Joshua 9 in the KBV

Joshua 9 in the KJV

Joshua 9 in the KNFD

Joshua 9 in the LBA

Joshua 9 in the LBLA

Joshua 9 in the LNT

Joshua 9 in the LSV

Joshua 9 in the MAAL

Joshua 9 in the MBV

Joshua 9 in the MBV2

Joshua 9 in the MHNT

Joshua 9 in the MKNFD

Joshua 9 in the MNG

Joshua 9 in the MNT

Joshua 9 in the MNT2

Joshua 9 in the MRS1T

Joshua 9 in the NAA

Joshua 9 in the NASB

Joshua 9 in the NBLA

Joshua 9 in the NBS

Joshua 9 in the NBVTP

Joshua 9 in the NET2

Joshua 9 in the NIV11

Joshua 9 in the NNT

Joshua 9 in the NNT2

Joshua 9 in the NNT3

Joshua 9 in the PDDPT

Joshua 9 in the PFNT

Joshua 9 in the RMNT

Joshua 9 in the SBIAS

Joshua 9 in the SBIBS

Joshua 9 in the SBIBS2

Joshua 9 in the SBICS

Joshua 9 in the SBIDS

Joshua 9 in the SBIGS

Joshua 9 in the SBIHS

Joshua 9 in the SBIIS

Joshua 9 in the SBIIS2

Joshua 9 in the SBIIS3

Joshua 9 in the SBIKS

Joshua 9 in the SBIKS2

Joshua 9 in the SBIMS

Joshua 9 in the SBIOS

Joshua 9 in the SBIPS

Joshua 9 in the SBISS

Joshua 9 in the SBITS

Joshua 9 in the SBITS2

Joshua 9 in the SBITS3

Joshua 9 in the SBITS4

Joshua 9 in the SBIUS

Joshua 9 in the SBIVS

Joshua 9 in the SBT

Joshua 9 in the SBT1E

Joshua 9 in the SCHL

Joshua 9 in the SNT

Joshua 9 in the SUSU

Joshua 9 in the SUSU2

Joshua 9 in the SYNO

Joshua 9 in the TBIAOTANT

Joshua 9 in the TBT1E

Joshua 9 in the TBT1E2

Joshua 9 in the TFTIP

Joshua 9 in the TFTU

Joshua 9 in the TGNTATF3T

Joshua 9 in the THAI

Joshua 9 in the TNFD

Joshua 9 in the TNT

Joshua 9 in the TNTIK

Joshua 9 in the TNTIL

Joshua 9 in the TNTIN

Joshua 9 in the TNTIP

Joshua 9 in the TNTIZ

Joshua 9 in the TOMA

Joshua 9 in the TTENT

Joshua 9 in the UBG

Joshua 9 in the UGV

Joshua 9 in the UGV2

Joshua 9 in the UGV3

Joshua 9 in the VBL

Joshua 9 in the VDCC

Joshua 9 in the YALU

Joshua 9 in the YAPE

Joshua 9 in the YBVTP

Joshua 9 in the ZBP