Leviticus 11 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn, sị, 2 “Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri. 3 Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ. 4 “ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha. 5 Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu. 6 Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu. 7 Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu. 8 Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu. 9 “ ‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha. 10 Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ. 11 Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha. 12 Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ. 13 “ ‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii, 14 ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche, 15 ugolọma ọbụla dị iche iche, 16 enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche, 17 okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu, 18 okwukwu nwere mpi, okwolo na udele, 19 ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ. 20 “ ‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya. 21 Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala, 22 ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche. 23 Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha. 24 “ ‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ. 25 Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi. 26 “ ‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ. 27 Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 28 Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ. 29 “ ‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị, 30 na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala. 31 Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ. 32 Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha. 33 Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ. 34 Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ. 35 Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ. 36 Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ. 37 Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha. 38 Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ. 39 “ ‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 40 Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri. 41 “ ‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha. 42 Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ. 43 Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha. 44 Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka. 45 Abụ m ONYENWE ANYỊ, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ. 46 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala. 47 Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’ ”

In Other Versions

Leviticus 11 in the ANGEFD

Leviticus 11 in the ANTPNG2D

Leviticus 11 in the AS21

Leviticus 11 in the BAGH

Leviticus 11 in the BBPNG

Leviticus 11 in the BBT1E

Leviticus 11 in the BDS

Leviticus 11 in the BEV

Leviticus 11 in the BHAD

Leviticus 11 in the BIB

Leviticus 11 in the BLPT

Leviticus 11 in the BNT

Leviticus 11 in the BNTABOOT

Leviticus 11 in the BNTLV

Leviticus 11 in the BOATCB

Leviticus 11 in the BOATCB2

Leviticus 11 in the BOBCV

Leviticus 11 in the BOCNT

Leviticus 11 in the BOECS

Leviticus 11 in the BOGWICC

Leviticus 11 in the BOHCB

Leviticus 11 in the BOHCV

Leviticus 11 in the BOHLNT

Leviticus 11 in the BOHNTLTAL

Leviticus 11 in the BOILNTAP

Leviticus 11 in the BOITCV

Leviticus 11 in the BOKCV

Leviticus 11 in the BOKCV2

Leviticus 11 in the BOKHWOG

Leviticus 11 in the BOKSSV

Leviticus 11 in the BOLCB

Leviticus 11 in the BOLCB2

Leviticus 11 in the BOMCV

Leviticus 11 in the BONAV

Leviticus 11 in the BONCB

Leviticus 11 in the BONLT

Leviticus 11 in the BONUT2

Leviticus 11 in the BOPLNT

Leviticus 11 in the BOSCB

Leviticus 11 in the BOSNC

Leviticus 11 in the BOTLNT

Leviticus 11 in the BOVCB

Leviticus 11 in the BOYCB

Leviticus 11 in the BPBB

Leviticus 11 in the BPH

Leviticus 11 in the BSB

Leviticus 11 in the CCB

Leviticus 11 in the CUV

Leviticus 11 in the CUVS

Leviticus 11 in the DBT

Leviticus 11 in the DGDNT

Leviticus 11 in the DHNT

Leviticus 11 in the DNT

Leviticus 11 in the ELBE

Leviticus 11 in the EMTV

Leviticus 11 in the ESV

Leviticus 11 in the FBV

Leviticus 11 in the FEB

Leviticus 11 in the GGMNT

Leviticus 11 in the GNT

Leviticus 11 in the HARY

Leviticus 11 in the HNT

Leviticus 11 in the IRVA

Leviticus 11 in the IRVB

Leviticus 11 in the IRVG

Leviticus 11 in the IRVH

Leviticus 11 in the IRVK

Leviticus 11 in the IRVM

Leviticus 11 in the IRVM2

Leviticus 11 in the IRVO

Leviticus 11 in the IRVP

Leviticus 11 in the IRVT

Leviticus 11 in the IRVT2

Leviticus 11 in the IRVU

Leviticus 11 in the ISVN

Leviticus 11 in the JSNT

Leviticus 11 in the KAPI

Leviticus 11 in the KBT1ETNIK

Leviticus 11 in the KBV

Leviticus 11 in the KJV

Leviticus 11 in the KNFD

Leviticus 11 in the LBA

Leviticus 11 in the LBLA

Leviticus 11 in the LNT

Leviticus 11 in the LSV

Leviticus 11 in the MAAL

Leviticus 11 in the MBV

Leviticus 11 in the MBV2

Leviticus 11 in the MHNT

Leviticus 11 in the MKNFD

Leviticus 11 in the MNG

Leviticus 11 in the MNT

Leviticus 11 in the MNT2

Leviticus 11 in the MRS1T

Leviticus 11 in the NAA

Leviticus 11 in the NASB

Leviticus 11 in the NBLA

Leviticus 11 in the NBS

Leviticus 11 in the NBVTP

Leviticus 11 in the NET2

Leviticus 11 in the NIV11

Leviticus 11 in the NNT

Leviticus 11 in the NNT2

Leviticus 11 in the NNT3

Leviticus 11 in the PDDPT

Leviticus 11 in the PFNT

Leviticus 11 in the RMNT

Leviticus 11 in the SBIAS

Leviticus 11 in the SBIBS

Leviticus 11 in the SBIBS2

Leviticus 11 in the SBICS

Leviticus 11 in the SBIDS

Leviticus 11 in the SBIGS

Leviticus 11 in the SBIHS

Leviticus 11 in the SBIIS

Leviticus 11 in the SBIIS2

Leviticus 11 in the SBIIS3

Leviticus 11 in the SBIKS

Leviticus 11 in the SBIKS2

Leviticus 11 in the SBIMS

Leviticus 11 in the SBIOS

Leviticus 11 in the SBIPS

Leviticus 11 in the SBISS

Leviticus 11 in the SBITS

Leviticus 11 in the SBITS2

Leviticus 11 in the SBITS3

Leviticus 11 in the SBITS4

Leviticus 11 in the SBIUS

Leviticus 11 in the SBIVS

Leviticus 11 in the SBT

Leviticus 11 in the SBT1E

Leviticus 11 in the SCHL

Leviticus 11 in the SNT

Leviticus 11 in the SUSU

Leviticus 11 in the SUSU2

Leviticus 11 in the SYNO

Leviticus 11 in the TBIAOTANT

Leviticus 11 in the TBT1E

Leviticus 11 in the TBT1E2

Leviticus 11 in the TFTIP

Leviticus 11 in the TFTU

Leviticus 11 in the TGNTATF3T

Leviticus 11 in the THAI

Leviticus 11 in the TNFD

Leviticus 11 in the TNT

Leviticus 11 in the TNTIK

Leviticus 11 in the TNTIL

Leviticus 11 in the TNTIN

Leviticus 11 in the TNTIP

Leviticus 11 in the TNTIZ

Leviticus 11 in the TOMA

Leviticus 11 in the TTENT

Leviticus 11 in the UBG

Leviticus 11 in the UGV

Leviticus 11 in the UGV2

Leviticus 11 in the UGV3

Leviticus 11 in the VBL

Leviticus 11 in the VDCC

Leviticus 11 in the YALU

Leviticus 11 in the YAPE

Leviticus 11 in the YBVTP

Leviticus 11 in the ZBP