Leviticus 26 (BOICB)

1 “ ‘Unu emerela onwe unu arụsị ọbụla, maọbụ guzobe oyiyi apịrị apị, maọbụ ogidi nkume ọbụla ọtọ, nye onwe unu. Unu edokwala nkume a pịrị apị ọbụla nʼala unu maka ịkpọ isiala nye ya. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 2 “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị Izuike m, sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 3 “ ‘Ọ bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile, 4 aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile. 5 Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu. 6 “ ‘Aga m eme ka udo dịrị nʼala ahụ, unu ga-edina ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka unu tụọ egwu ọbụla. Aga m ewezuga site nʼetiti unu ajọ anụ ọhịa, mma agha agaghị esitekwa nʼala unu bi nʼime ya gafee. 7 Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha. 8 Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha. 9 “ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide. 10 Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ. 11 Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi. 12 Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m. 13 Nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị. 14 “ ‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya, 15 ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m, 16 mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha. 17 Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu. 18 “ ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu. 19 Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz. 20 Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya. 21 “ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu. 22 Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole. 23 “ ‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m, 24 mụ onwe m ga-ebu agha megide unu. Aga m eti unu ugbo ihe otiti asaa, nʼihi mmehie unu. 25 Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu. 26 Aga m eme ka unu hapụ inwe ihe oriri ga-ezuru unu. Otu ite nri naanị ka ndị inyom iri ga-eji sie nri ha nwere. Ha ga-eji ihe ọtụtụ tụọ ya mgbe ha na-eke ya. Unu ga-eri ya, ma afọ agaghị eju unu. 27 “ ‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m, 28 mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu. 29 Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom. 30 Aga m ebibikwa ụlọ arụsị unu niile dị nʼelu ugwu, gbutuo ebe ịchụ aja niile unu na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi. Aga m atụkọta ozu unu nʼelu arụsị unu na-enweghị ume ndụ, ka unu bụrụ ihe m na-asọ oyi. 31 Aga m eme ka obodo unu niile tọgbọrọ nʼefu, kụdasịakwa ebe nsọ unu niile. Agaghị m anabatakwa isisi ụtọ nke aja unu. 32 Aga m eme ka ala unu tọgbọrọ nʼefu, mee ka ọnọdụ ịdị ala unu bụrụ ihe ga-eju ndị iro unu ga-ebi nʼime ya anya. 33 Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile. 34 Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile. 35 Ogologo oge niile ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ala ahụ ga-ezu ike, ụdị izuike ọ na-enweghị nʼafọ izuike ndị ahụ unu bi nʼime ya. 36 “ ‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. 37 Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu. 38 Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu. 39 Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha. 40 “ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m, 41 nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha 42 aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ. 43 Ma ala ahụ aghaghị ịtọgbọrọ nʼefu. Ọ ghakwaghị inwezu izuike ruuru ya, oge ndị ahụ ọ tọgbọrọ nʼefu, mgbe ha na-ebighị nʼime ya. Ha ga-anata ntaramahụhụ ruuru ha nʼihi na ha jụrụ iwu m, sọọkwa ụkpụrụ m oyi. 44 Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha, maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha. 45 Kama nʼihi ha, aga m echeta ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, ịbụ Chineke ha, ndị ahụ m kpọpụtara site nʼala Ijipt nʼihu mba niile. Abụ m ONYENWE ANYỊ.’ ” 46 Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ na ndụmọdụ ONYENWE ANYỊ guzobere nʼugwu Saịnaị, nʼetiti ya onwe ya, na ụmụ Izrel, site nʼaka Mosis.

In Other Versions

Leviticus 26 in the ANGEFD

Leviticus 26 in the ANTPNG2D

Leviticus 26 in the AS21

Leviticus 26 in the BAGH

Leviticus 26 in the BBPNG

Leviticus 26 in the BBT1E

Leviticus 26 in the BDS

Leviticus 26 in the BEV

Leviticus 26 in the BHAD

Leviticus 26 in the BIB

Leviticus 26 in the BLPT

Leviticus 26 in the BNT

Leviticus 26 in the BNTABOOT

Leviticus 26 in the BNTLV

Leviticus 26 in the BOATCB

Leviticus 26 in the BOATCB2

Leviticus 26 in the BOBCV

Leviticus 26 in the BOCNT

Leviticus 26 in the BOECS

Leviticus 26 in the BOGWICC

Leviticus 26 in the BOHCB

Leviticus 26 in the BOHCV

Leviticus 26 in the BOHLNT

Leviticus 26 in the BOHNTLTAL

Leviticus 26 in the BOILNTAP

Leviticus 26 in the BOITCV

Leviticus 26 in the BOKCV

Leviticus 26 in the BOKCV2

Leviticus 26 in the BOKHWOG

Leviticus 26 in the BOKSSV

Leviticus 26 in the BOLCB

Leviticus 26 in the BOLCB2

Leviticus 26 in the BOMCV

Leviticus 26 in the BONAV

Leviticus 26 in the BONCB

Leviticus 26 in the BONLT

Leviticus 26 in the BONUT2

Leviticus 26 in the BOPLNT

Leviticus 26 in the BOSCB

Leviticus 26 in the BOSNC

Leviticus 26 in the BOTLNT

Leviticus 26 in the BOVCB

Leviticus 26 in the BOYCB

Leviticus 26 in the BPBB

Leviticus 26 in the BPH

Leviticus 26 in the BSB

Leviticus 26 in the CCB

Leviticus 26 in the CUV

Leviticus 26 in the CUVS

Leviticus 26 in the DBT

Leviticus 26 in the DGDNT

Leviticus 26 in the DHNT

Leviticus 26 in the DNT

Leviticus 26 in the ELBE

Leviticus 26 in the EMTV

Leviticus 26 in the ESV

Leviticus 26 in the FBV

Leviticus 26 in the FEB

Leviticus 26 in the GGMNT

Leviticus 26 in the GNT

Leviticus 26 in the HARY

Leviticus 26 in the HNT

Leviticus 26 in the IRVA

Leviticus 26 in the IRVB

Leviticus 26 in the IRVG

Leviticus 26 in the IRVH

Leviticus 26 in the IRVK

Leviticus 26 in the IRVM

Leviticus 26 in the IRVM2

Leviticus 26 in the IRVO

Leviticus 26 in the IRVP

Leviticus 26 in the IRVT

Leviticus 26 in the IRVT2

Leviticus 26 in the IRVU

Leviticus 26 in the ISVN

Leviticus 26 in the JSNT

Leviticus 26 in the KAPI

Leviticus 26 in the KBT1ETNIK

Leviticus 26 in the KBV

Leviticus 26 in the KJV

Leviticus 26 in the KNFD

Leviticus 26 in the LBA

Leviticus 26 in the LBLA

Leviticus 26 in the LNT

Leviticus 26 in the LSV

Leviticus 26 in the MAAL

Leviticus 26 in the MBV

Leviticus 26 in the MBV2

Leviticus 26 in the MHNT

Leviticus 26 in the MKNFD

Leviticus 26 in the MNG

Leviticus 26 in the MNT

Leviticus 26 in the MNT2

Leviticus 26 in the MRS1T

Leviticus 26 in the NAA

Leviticus 26 in the NASB

Leviticus 26 in the NBLA

Leviticus 26 in the NBS

Leviticus 26 in the NBVTP

Leviticus 26 in the NET2

Leviticus 26 in the NIV11

Leviticus 26 in the NNT

Leviticus 26 in the NNT2

Leviticus 26 in the NNT3

Leviticus 26 in the PDDPT

Leviticus 26 in the PFNT

Leviticus 26 in the RMNT

Leviticus 26 in the SBIAS

Leviticus 26 in the SBIBS

Leviticus 26 in the SBIBS2

Leviticus 26 in the SBICS

Leviticus 26 in the SBIDS

Leviticus 26 in the SBIGS

Leviticus 26 in the SBIHS

Leviticus 26 in the SBIIS

Leviticus 26 in the SBIIS2

Leviticus 26 in the SBIIS3

Leviticus 26 in the SBIKS

Leviticus 26 in the SBIKS2

Leviticus 26 in the SBIMS

Leviticus 26 in the SBIOS

Leviticus 26 in the SBIPS

Leviticus 26 in the SBISS

Leviticus 26 in the SBITS

Leviticus 26 in the SBITS2

Leviticus 26 in the SBITS3

Leviticus 26 in the SBITS4

Leviticus 26 in the SBIUS

Leviticus 26 in the SBIVS

Leviticus 26 in the SBT

Leviticus 26 in the SBT1E

Leviticus 26 in the SCHL

Leviticus 26 in the SNT

Leviticus 26 in the SUSU

Leviticus 26 in the SUSU2

Leviticus 26 in the SYNO

Leviticus 26 in the TBIAOTANT

Leviticus 26 in the TBT1E

Leviticus 26 in the TBT1E2

Leviticus 26 in the TFTIP

Leviticus 26 in the TFTU

Leviticus 26 in the TGNTATF3T

Leviticus 26 in the THAI

Leviticus 26 in the TNFD

Leviticus 26 in the TNT

Leviticus 26 in the TNTIK

Leviticus 26 in the TNTIL

Leviticus 26 in the TNTIN

Leviticus 26 in the TNTIP

Leviticus 26 in the TNTIZ

Leviticus 26 in the TOMA

Leviticus 26 in the TTENT

Leviticus 26 in the UBG

Leviticus 26 in the UGV

Leviticus 26 in the UGV2

Leviticus 26 in the UGV3

Leviticus 26 in the VBL

Leviticus 26 in the VDCC

Leviticus 26 in the YALU

Leviticus 26 in the YAPE

Leviticus 26 in the YBVTP

Leviticus 26 in the ZBP