Leviticus 5 (BOICB)

1 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na ọ jụrụ ikwupụta mgbe ọ nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe ọ hụrụ maọbụ ihe ọ maara, ọ bụ onye ikpe mara. 2 “ ‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara. 3 Ma ọ bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka ọ hapụ ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ha amaghị na ọ bụ ihe rụrụ arụ, mgbe ọ matara ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara. 4 Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara. 5 Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya, dịka o si dị. 6 Ọ ga-ewetara ONYENWE ANYỊ nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha. 7 “ ‘Ọ bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ọ ga-ewetara ONYENWE ANYỊ nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ. 8 Ọ ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. Ọ ga-atụbipụ olu ya, kama ọ gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya. 9 Ọ ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie. 10 Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha. 11 “ ‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie. 12 Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu ONYENWE ANYỊ. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya. 13 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ ” 14 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 15 “Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke ONYENWE ANYỊ, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ. Ọ ga-ewetara ONYENWE ANYỊ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma. 16 Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya. 17 “Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla ONYENWE ANYỊ nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya. 18 Ọ ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya. 19 Ọ bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide ONYENWE ANYỊ ka ọ bụ.”

In Other Versions

Leviticus 5 in the ANGEFD

Leviticus 5 in the ANTPNG2D

Leviticus 5 in the AS21

Leviticus 5 in the BAGH

Leviticus 5 in the BBPNG

Leviticus 5 in the BBT1E

Leviticus 5 in the BDS

Leviticus 5 in the BEV

Leviticus 5 in the BHAD

Leviticus 5 in the BIB

Leviticus 5 in the BLPT

Leviticus 5 in the BNT

Leviticus 5 in the BNTABOOT

Leviticus 5 in the BNTLV

Leviticus 5 in the BOATCB

Leviticus 5 in the BOATCB2

Leviticus 5 in the BOBCV

Leviticus 5 in the BOCNT

Leviticus 5 in the BOECS

Leviticus 5 in the BOGWICC

Leviticus 5 in the BOHCB

Leviticus 5 in the BOHCV

Leviticus 5 in the BOHLNT

Leviticus 5 in the BOHNTLTAL

Leviticus 5 in the BOILNTAP

Leviticus 5 in the BOITCV

Leviticus 5 in the BOKCV

Leviticus 5 in the BOKCV2

Leviticus 5 in the BOKHWOG

Leviticus 5 in the BOKSSV

Leviticus 5 in the BOLCB

Leviticus 5 in the BOLCB2

Leviticus 5 in the BOMCV

Leviticus 5 in the BONAV

Leviticus 5 in the BONCB

Leviticus 5 in the BONLT

Leviticus 5 in the BONUT2

Leviticus 5 in the BOPLNT

Leviticus 5 in the BOSCB

Leviticus 5 in the BOSNC

Leviticus 5 in the BOTLNT

Leviticus 5 in the BOVCB

Leviticus 5 in the BOYCB

Leviticus 5 in the BPBB

Leviticus 5 in the BPH

Leviticus 5 in the BSB

Leviticus 5 in the CCB

Leviticus 5 in the CUV

Leviticus 5 in the CUVS

Leviticus 5 in the DBT

Leviticus 5 in the DGDNT

Leviticus 5 in the DHNT

Leviticus 5 in the DNT

Leviticus 5 in the ELBE

Leviticus 5 in the EMTV

Leviticus 5 in the ESV

Leviticus 5 in the FBV

Leviticus 5 in the FEB

Leviticus 5 in the GGMNT

Leviticus 5 in the GNT

Leviticus 5 in the HARY

Leviticus 5 in the HNT

Leviticus 5 in the IRVA

Leviticus 5 in the IRVB

Leviticus 5 in the IRVG

Leviticus 5 in the IRVH

Leviticus 5 in the IRVK

Leviticus 5 in the IRVM

Leviticus 5 in the IRVM2

Leviticus 5 in the IRVO

Leviticus 5 in the IRVP

Leviticus 5 in the IRVT

Leviticus 5 in the IRVT2

Leviticus 5 in the IRVU

Leviticus 5 in the ISVN

Leviticus 5 in the JSNT

Leviticus 5 in the KAPI

Leviticus 5 in the KBT1ETNIK

Leviticus 5 in the KBV

Leviticus 5 in the KJV

Leviticus 5 in the KNFD

Leviticus 5 in the LBA

Leviticus 5 in the LBLA

Leviticus 5 in the LNT

Leviticus 5 in the LSV

Leviticus 5 in the MAAL

Leviticus 5 in the MBV

Leviticus 5 in the MBV2

Leviticus 5 in the MHNT

Leviticus 5 in the MKNFD

Leviticus 5 in the MNG

Leviticus 5 in the MNT

Leviticus 5 in the MNT2

Leviticus 5 in the MRS1T

Leviticus 5 in the NAA

Leviticus 5 in the NASB

Leviticus 5 in the NBLA

Leviticus 5 in the NBS

Leviticus 5 in the NBVTP

Leviticus 5 in the NET2

Leviticus 5 in the NIV11

Leviticus 5 in the NNT

Leviticus 5 in the NNT2

Leviticus 5 in the NNT3

Leviticus 5 in the PDDPT

Leviticus 5 in the PFNT

Leviticus 5 in the RMNT

Leviticus 5 in the SBIAS

Leviticus 5 in the SBIBS

Leviticus 5 in the SBIBS2

Leviticus 5 in the SBICS

Leviticus 5 in the SBIDS

Leviticus 5 in the SBIGS

Leviticus 5 in the SBIHS

Leviticus 5 in the SBIIS

Leviticus 5 in the SBIIS2

Leviticus 5 in the SBIIS3

Leviticus 5 in the SBIKS

Leviticus 5 in the SBIKS2

Leviticus 5 in the SBIMS

Leviticus 5 in the SBIOS

Leviticus 5 in the SBIPS

Leviticus 5 in the SBISS

Leviticus 5 in the SBITS

Leviticus 5 in the SBITS2

Leviticus 5 in the SBITS3

Leviticus 5 in the SBITS4

Leviticus 5 in the SBIUS

Leviticus 5 in the SBIVS

Leviticus 5 in the SBT

Leviticus 5 in the SBT1E

Leviticus 5 in the SCHL

Leviticus 5 in the SNT

Leviticus 5 in the SUSU

Leviticus 5 in the SUSU2

Leviticus 5 in the SYNO

Leviticus 5 in the TBIAOTANT

Leviticus 5 in the TBT1E

Leviticus 5 in the TBT1E2

Leviticus 5 in the TFTIP

Leviticus 5 in the TFTU

Leviticus 5 in the TGNTATF3T

Leviticus 5 in the THAI

Leviticus 5 in the TNFD

Leviticus 5 in the TNT

Leviticus 5 in the TNTIK

Leviticus 5 in the TNTIL

Leviticus 5 in the TNTIN

Leviticus 5 in the TNTIP

Leviticus 5 in the TNTIZ

Leviticus 5 in the TOMA

Leviticus 5 in the TTENT

Leviticus 5 in the UBG

Leviticus 5 in the UGV

Leviticus 5 in the UGV2

Leviticus 5 in the UGV3

Leviticus 5 in the VBL

Leviticus 5 in the VDCC

Leviticus 5 in the YALU

Leviticus 5 in the YAPE

Leviticus 5 in the YBVTP

Leviticus 5 in the ZBP