Luke 9 (BOICB)

1 Mgbe ọ kpọkọtara ndị ozi iri na abụọ ahụ, o nyere ha ike na ịchị isi nʼebe mmụọ ọjọọ niile nọ na ịgwọ ọrịa dị iche iche. 2 O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa. 3 Ọ gwara ha sị, “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, maọbụ mkpanaka maọbụ akpa, maọbụ achịcha maọbụ ego maọbụ uwe abụọ. 4 Ụlọ ọbụla unu banyere, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ. 5 Ma ebe ọbụla a na-anabataghị unu, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ nʼobodo ahụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.” 6 Ha gara nʼobodo nta niile na-ekwusa oziọma na-agwọkwa ndị ọrịa nʼebe niile. 7 Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie. 8 Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ. 9 Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya. 10 Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha. 11 Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma. 12 Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.” 13 Ọ zara ha sị, “Unu nye ha nri ka ha rie.”Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.” 14 Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise.Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.” 15 Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala. 16 O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ. 17 Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ. 18 Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?” 19 Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.” 20 Ma ọ jụrụ ha, “Unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst nke Chineke.” 21 Ma ọ dọrọ ha aka na ntị, nyesiekwa ha iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọbụla nke a, 22 na-asị, “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.” 23 Mgbe ahụ ọ sịkwara ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m. 24 Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya. 25 Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya? 26 Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ. 27 “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.” 28 Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ọ kpọọrọ Pita na Jọn na Jemis gaa nʼelu ugwu ikpe ekpere. 29 Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu. 30 Nʼotu ntabi anya, ha hụrụ ndị ikom abụọ ka ha na ya na-ekwu okwu. Ha bụ Mosis na Ịlaịja. 31 Ha pụtara nʼebube eluigwe dị ukwu na-ekwu banyere nlaghachi ya, nke ọ na-aga imezu na Jerusalem. 32 Pita na ndị ya na ha nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya na ndị ikom abụọ ya na ha nọ na-ekwurịta okwu. 33 Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja.” Ọ mataghị ihe ọ na-ekwu. 34 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ. 35 Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara; geenụ ya ntị.” 36 Mgbe olu ahụ kwusiri okwu, ha chọpụtara na Jisọs nọ naanị ya. Ndị na-eso ụzọ ya kpuchiri ọnụ ha, debe ihe niile nʼobi ha, ọ dịkwaghị onye ọbụla ha gwara ihe ha hụrụ. 37 Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya. 38 Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere. 39 Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ. 40 Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.” 41 Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!” 42 Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya. 43 Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya.Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, 44 “Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.” 45 Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara. 46 Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu. 47 Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya. 48 Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.” 49 Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.” 50 Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.” 51 Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem. 52 O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa; 53 ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem. 54 Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?” 55 Ọ tụgharịrị bara ha mba. 56 Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ. 57 Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” 58 Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi.” 59 Ọ gwara onye ọzọ sị, “Soro m.”Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, “Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.” 60 Ma ọ sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke.” 61 Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, “Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma.” 62 Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”

In Other Versions

Luke 9 in the ANGEFD

Luke 9 in the ANTPNG2D

Luke 9 in the AS21

Luke 9 in the BAGH

Luke 9 in the BBPNG

Luke 9 in the BBT1E

Luke 9 in the BDS

Luke 9 in the BEV

Luke 9 in the BHAD

Luke 9 in the BIB

Luke 9 in the BLPT

Luke 9 in the BNT

Luke 9 in the BNTABOOT

Luke 9 in the BNTLV

Luke 9 in the BOATCB

Luke 9 in the BOATCB2

Luke 9 in the BOBCV

Luke 9 in the BOCNT

Luke 9 in the BOECS

Luke 9 in the BOGWICC

Luke 9 in the BOHCB

Luke 9 in the BOHCV

Luke 9 in the BOHLNT

Luke 9 in the BOHNTLTAL

Luke 9 in the BOILNTAP

Luke 9 in the BOITCV

Luke 9 in the BOKCV

Luke 9 in the BOKCV2

Luke 9 in the BOKHWOG

Luke 9 in the BOKSSV

Luke 9 in the BOLCB

Luke 9 in the BOLCB2

Luke 9 in the BOMCV

Luke 9 in the BONAV

Luke 9 in the BONCB

Luke 9 in the BONLT

Luke 9 in the BONUT2

Luke 9 in the BOPLNT

Luke 9 in the BOSCB

Luke 9 in the BOSNC

Luke 9 in the BOTLNT

Luke 9 in the BOVCB

Luke 9 in the BOYCB

Luke 9 in the BPBB

Luke 9 in the BPH

Luke 9 in the BSB

Luke 9 in the CCB

Luke 9 in the CUV

Luke 9 in the CUVS

Luke 9 in the DBT

Luke 9 in the DGDNT

Luke 9 in the DHNT

Luke 9 in the DNT

Luke 9 in the ELBE

Luke 9 in the EMTV

Luke 9 in the ESV

Luke 9 in the FBV

Luke 9 in the FEB

Luke 9 in the GGMNT

Luke 9 in the GNT

Luke 9 in the HARY

Luke 9 in the HNT

Luke 9 in the IRVA

Luke 9 in the IRVB

Luke 9 in the IRVG

Luke 9 in the IRVH

Luke 9 in the IRVK

Luke 9 in the IRVM

Luke 9 in the IRVM2

Luke 9 in the IRVO

Luke 9 in the IRVP

Luke 9 in the IRVT

Luke 9 in the IRVT2

Luke 9 in the IRVU

Luke 9 in the ISVN

Luke 9 in the JSNT

Luke 9 in the KAPI

Luke 9 in the KBT1ETNIK

Luke 9 in the KBV

Luke 9 in the KJV

Luke 9 in the KNFD

Luke 9 in the LBA

Luke 9 in the LBLA

Luke 9 in the LNT

Luke 9 in the LSV

Luke 9 in the MAAL

Luke 9 in the MBV

Luke 9 in the MBV2

Luke 9 in the MHNT

Luke 9 in the MKNFD

Luke 9 in the MNG

Luke 9 in the MNT

Luke 9 in the MNT2

Luke 9 in the MRS1T

Luke 9 in the NAA

Luke 9 in the NASB

Luke 9 in the NBLA

Luke 9 in the NBS

Luke 9 in the NBVTP

Luke 9 in the NET2

Luke 9 in the NIV11

Luke 9 in the NNT

Luke 9 in the NNT2

Luke 9 in the NNT3

Luke 9 in the PDDPT

Luke 9 in the PFNT

Luke 9 in the RMNT

Luke 9 in the SBIAS

Luke 9 in the SBIBS

Luke 9 in the SBIBS2

Luke 9 in the SBICS

Luke 9 in the SBIDS

Luke 9 in the SBIGS

Luke 9 in the SBIHS

Luke 9 in the SBIIS

Luke 9 in the SBIIS2

Luke 9 in the SBIIS3

Luke 9 in the SBIKS

Luke 9 in the SBIKS2

Luke 9 in the SBIMS

Luke 9 in the SBIOS

Luke 9 in the SBIPS

Luke 9 in the SBISS

Luke 9 in the SBITS

Luke 9 in the SBITS2

Luke 9 in the SBITS3

Luke 9 in the SBITS4

Luke 9 in the SBIUS

Luke 9 in the SBIVS

Luke 9 in the SBT

Luke 9 in the SBT1E

Luke 9 in the SCHL

Luke 9 in the SNT

Luke 9 in the SUSU

Luke 9 in the SUSU2

Luke 9 in the SYNO

Luke 9 in the TBIAOTANT

Luke 9 in the TBT1E

Luke 9 in the TBT1E2

Luke 9 in the TFTIP

Luke 9 in the TFTU

Luke 9 in the TGNTATF3T

Luke 9 in the THAI

Luke 9 in the TNFD

Luke 9 in the TNT

Luke 9 in the TNTIK

Luke 9 in the TNTIL

Luke 9 in the TNTIN

Luke 9 in the TNTIP

Luke 9 in the TNTIZ

Luke 9 in the TOMA

Luke 9 in the TTENT

Luke 9 in the UBG

Luke 9 in the UGV

Luke 9 in the UGV2

Luke 9 in the UGV3

Luke 9 in the VBL

Luke 9 in the VDCC

Luke 9 in the YALU

Luke 9 in the YAPE

Luke 9 in the YBVTP

Luke 9 in the ZBP