Matthew 25 (BOICB)

1 “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. 2 Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. 3 Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. 4 Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. 5 Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra. 6 “Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ 7 “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. 8 Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’ 9 “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’ 10 “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. 11 “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’ 12 “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’ 13 “Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ. 14 “Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. 15 O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. 16 Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. 17 Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. 18 Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma. 19 “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. 20 Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ 21 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 22 “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ 23 “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 24 “Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. 25 Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’ 26 “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. 27 Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri. 28 “ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. 29 Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere. 30 Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ 31 “Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. 32 Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. 33 Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya. 34 “Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. 35 Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. 36 Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’ 37 “Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? 38 Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? 39 Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ 40 “Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’ 41 “Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. 42 Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. 43 Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ 44 “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ 45 “Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ 46 “Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

In Other Versions

Matthew 25 in the ANGEFD

Matthew 25 in the ANTPNG2D

Matthew 25 in the AS21

Matthew 25 in the BAGH

Matthew 25 in the BBPNG

Matthew 25 in the BBT1E

Matthew 25 in the BDS

Matthew 25 in the BEV

Matthew 25 in the BHAD

Matthew 25 in the BIB

Matthew 25 in the BLPT

Matthew 25 in the BNT

Matthew 25 in the BNTABOOT

Matthew 25 in the BNTLV

Matthew 25 in the BOATCB

Matthew 25 in the BOATCB2

Matthew 25 in the BOBCV

Matthew 25 in the BOCNT

Matthew 25 in the BOECS

Matthew 25 in the BOGWICC

Matthew 25 in the BOHCB

Matthew 25 in the BOHCV

Matthew 25 in the BOHLNT

Matthew 25 in the BOHNTLTAL

Matthew 25 in the BOILNTAP

Matthew 25 in the BOITCV

Matthew 25 in the BOKCV

Matthew 25 in the BOKCV2

Matthew 25 in the BOKHWOG

Matthew 25 in the BOKSSV

Matthew 25 in the BOLCB

Matthew 25 in the BOLCB2

Matthew 25 in the BOMCV

Matthew 25 in the BONAV

Matthew 25 in the BONCB

Matthew 25 in the BONLT

Matthew 25 in the BONUT2

Matthew 25 in the BOPLNT

Matthew 25 in the BOSCB

Matthew 25 in the BOSNC

Matthew 25 in the BOTLNT

Matthew 25 in the BOVCB

Matthew 25 in the BOYCB

Matthew 25 in the BPBB

Matthew 25 in the BPH

Matthew 25 in the BSB

Matthew 25 in the CCB

Matthew 25 in the CUV

Matthew 25 in the CUVS

Matthew 25 in the DBT

Matthew 25 in the DGDNT

Matthew 25 in the DHNT

Matthew 25 in the DNT

Matthew 25 in the ELBE

Matthew 25 in the EMTV

Matthew 25 in the ESV

Matthew 25 in the FBV

Matthew 25 in the FEB

Matthew 25 in the GGMNT

Matthew 25 in the GNT

Matthew 25 in the HARY

Matthew 25 in the HNT

Matthew 25 in the IRVA

Matthew 25 in the IRVB

Matthew 25 in the IRVG

Matthew 25 in the IRVH

Matthew 25 in the IRVK

Matthew 25 in the IRVM

Matthew 25 in the IRVM2

Matthew 25 in the IRVO

Matthew 25 in the IRVP

Matthew 25 in the IRVT

Matthew 25 in the IRVT2

Matthew 25 in the IRVU

Matthew 25 in the ISVN

Matthew 25 in the JSNT

Matthew 25 in the KAPI

Matthew 25 in the KBT1ETNIK

Matthew 25 in the KBV

Matthew 25 in the KJV

Matthew 25 in the KNFD

Matthew 25 in the LBA

Matthew 25 in the LBLA

Matthew 25 in the LNT

Matthew 25 in the LSV

Matthew 25 in the MAAL

Matthew 25 in the MBV

Matthew 25 in the MBV2

Matthew 25 in the MHNT

Matthew 25 in the MKNFD

Matthew 25 in the MNG

Matthew 25 in the MNT

Matthew 25 in the MNT2

Matthew 25 in the MRS1T

Matthew 25 in the NAA

Matthew 25 in the NASB

Matthew 25 in the NBLA

Matthew 25 in the NBS

Matthew 25 in the NBVTP

Matthew 25 in the NET2

Matthew 25 in the NIV11

Matthew 25 in the NNT

Matthew 25 in the NNT2

Matthew 25 in the NNT3

Matthew 25 in the PDDPT

Matthew 25 in the PFNT

Matthew 25 in the RMNT

Matthew 25 in the SBIAS

Matthew 25 in the SBIBS

Matthew 25 in the SBIBS2

Matthew 25 in the SBICS

Matthew 25 in the SBIDS

Matthew 25 in the SBIGS

Matthew 25 in the SBIHS

Matthew 25 in the SBIIS

Matthew 25 in the SBIIS2

Matthew 25 in the SBIIS3

Matthew 25 in the SBIKS

Matthew 25 in the SBIKS2

Matthew 25 in the SBIMS

Matthew 25 in the SBIOS

Matthew 25 in the SBIPS

Matthew 25 in the SBISS

Matthew 25 in the SBITS

Matthew 25 in the SBITS2

Matthew 25 in the SBITS3

Matthew 25 in the SBITS4

Matthew 25 in the SBIUS

Matthew 25 in the SBIVS

Matthew 25 in the SBT

Matthew 25 in the SBT1E

Matthew 25 in the SCHL

Matthew 25 in the SNT

Matthew 25 in the SUSU

Matthew 25 in the SUSU2

Matthew 25 in the SYNO

Matthew 25 in the TBIAOTANT

Matthew 25 in the TBT1E

Matthew 25 in the TBT1E2

Matthew 25 in the TFTIP

Matthew 25 in the TFTU

Matthew 25 in the TGNTATF3T

Matthew 25 in the THAI

Matthew 25 in the TNFD

Matthew 25 in the TNT

Matthew 25 in the TNTIK

Matthew 25 in the TNTIL

Matthew 25 in the TNTIN

Matthew 25 in the TNTIP

Matthew 25 in the TNTIZ

Matthew 25 in the TOMA

Matthew 25 in the TTENT

Matthew 25 in the UBG

Matthew 25 in the UGV

Matthew 25 in the UGV2

Matthew 25 in the UGV3

Matthew 25 in the VBL

Matthew 25 in the VDCC

Matthew 25 in the YALU

Matthew 25 in the YAPE

Matthew 25 in the YBVTP

Matthew 25 in the ZBP