Mark 10 (BOICB)

1 Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe. 2 Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” 3 Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?” 4 Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.” 5 Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a. 6 Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’ 7 ‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. 8 Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. 9 Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 10 Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a. 11 Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. 12 Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.” 13 Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba. 14 Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a. 15 Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.” 16 Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha. 17 Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 18 Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke. 19 Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’” 20 Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.” 21 Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.” 22 Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba. 23 Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.” 24 Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke. 25 Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 26 Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 27 Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.” 28 Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!” 29 Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, 30 nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. 31 Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.” 32 Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya. 33 Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ. 34 Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.” 35 Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.” 36 Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 37 Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.” 38 Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?” 39 Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.”Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m. 40 Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.” 41 Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn. 42 Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 43 Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 44 Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile. 45 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.” 46 Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. 47 Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!” 48 Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!” 49 Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.”Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.” 50 Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs. 51 Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.” 52 Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.

In Other Versions

Mark 10 in the ANGEFD

Mark 10 in the ANTPNG2D

Mark 10 in the AS21

Mark 10 in the BAGH

Mark 10 in the BBPNG

Mark 10 in the BBT1E

Mark 10 in the BDS

Mark 10 in the BEV

Mark 10 in the BHAD

Mark 10 in the BIB

Mark 10 in the BLPT

Mark 10 in the BNT

Mark 10 in the BNTABOOT

Mark 10 in the BNTLV

Mark 10 in the BOATCB

Mark 10 in the BOATCB2

Mark 10 in the BOBCV

Mark 10 in the BOCNT

Mark 10 in the BOECS

Mark 10 in the BOGWICC

Mark 10 in the BOHCB

Mark 10 in the BOHCV

Mark 10 in the BOHLNT

Mark 10 in the BOHNTLTAL

Mark 10 in the BOILNTAP

Mark 10 in the BOITCV

Mark 10 in the BOKCV

Mark 10 in the BOKCV2

Mark 10 in the BOKHWOG

Mark 10 in the BOKSSV

Mark 10 in the BOLCB

Mark 10 in the BOLCB2

Mark 10 in the BOMCV

Mark 10 in the BONAV

Mark 10 in the BONCB

Mark 10 in the BONLT

Mark 10 in the BONUT2

Mark 10 in the BOPLNT

Mark 10 in the BOSCB

Mark 10 in the BOSNC

Mark 10 in the BOTLNT

Mark 10 in the BOVCB

Mark 10 in the BOYCB

Mark 10 in the BPBB

Mark 10 in the BPH

Mark 10 in the BSB

Mark 10 in the CCB

Mark 10 in the CUV

Mark 10 in the CUVS

Mark 10 in the DBT

Mark 10 in the DGDNT

Mark 10 in the DHNT

Mark 10 in the DNT

Mark 10 in the ELBE

Mark 10 in the EMTV

Mark 10 in the ESV

Mark 10 in the FBV

Mark 10 in the FEB

Mark 10 in the GGMNT

Mark 10 in the GNT

Mark 10 in the HARY

Mark 10 in the HNT

Mark 10 in the IRVA

Mark 10 in the IRVB

Mark 10 in the IRVG

Mark 10 in the IRVH

Mark 10 in the IRVK

Mark 10 in the IRVM

Mark 10 in the IRVM2

Mark 10 in the IRVO

Mark 10 in the IRVP

Mark 10 in the IRVT

Mark 10 in the IRVT2

Mark 10 in the IRVU

Mark 10 in the ISVN

Mark 10 in the JSNT

Mark 10 in the KAPI

Mark 10 in the KBT1ETNIK

Mark 10 in the KBV

Mark 10 in the KJV

Mark 10 in the KNFD

Mark 10 in the LBA

Mark 10 in the LBLA

Mark 10 in the LNT

Mark 10 in the LSV

Mark 10 in the MAAL

Mark 10 in the MBV

Mark 10 in the MBV2

Mark 10 in the MHNT

Mark 10 in the MKNFD

Mark 10 in the MNG

Mark 10 in the MNT

Mark 10 in the MNT2

Mark 10 in the MRS1T

Mark 10 in the NAA

Mark 10 in the NASB

Mark 10 in the NBLA

Mark 10 in the NBS

Mark 10 in the NBVTP

Mark 10 in the NET2

Mark 10 in the NIV11

Mark 10 in the NNT

Mark 10 in the NNT2

Mark 10 in the NNT3

Mark 10 in the PDDPT

Mark 10 in the PFNT

Mark 10 in the RMNT

Mark 10 in the SBIAS

Mark 10 in the SBIBS

Mark 10 in the SBIBS2

Mark 10 in the SBICS

Mark 10 in the SBIDS

Mark 10 in the SBIGS

Mark 10 in the SBIHS

Mark 10 in the SBIIS

Mark 10 in the SBIIS2

Mark 10 in the SBIIS3

Mark 10 in the SBIKS

Mark 10 in the SBIKS2

Mark 10 in the SBIMS

Mark 10 in the SBIOS

Mark 10 in the SBIPS

Mark 10 in the SBISS

Mark 10 in the SBITS

Mark 10 in the SBITS2

Mark 10 in the SBITS3

Mark 10 in the SBITS4

Mark 10 in the SBIUS

Mark 10 in the SBIVS

Mark 10 in the SBT

Mark 10 in the SBT1E

Mark 10 in the SCHL

Mark 10 in the SNT

Mark 10 in the SUSU

Mark 10 in the SUSU2

Mark 10 in the SYNO

Mark 10 in the TBIAOTANT

Mark 10 in the TBT1E

Mark 10 in the TBT1E2

Mark 10 in the TFTIP

Mark 10 in the TFTU

Mark 10 in the TGNTATF3T

Mark 10 in the THAI

Mark 10 in the TNFD

Mark 10 in the TNT

Mark 10 in the TNTIK

Mark 10 in the TNTIL

Mark 10 in the TNTIN

Mark 10 in the TNTIP

Mark 10 in the TNTIZ

Mark 10 in the TOMA

Mark 10 in the TTENT

Mark 10 in the UBG

Mark 10 in the UGV

Mark 10 in the UGV2

Mark 10 in the UGV3

Mark 10 in the VBL

Mark 10 in the VDCC

Mark 10 in the YALU

Mark 10 in the YAPE

Mark 10 in the YBVTP

Mark 10 in the ZBP