Nehemiah 13 (BOICB)

1 Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke. 2 Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.) 3 Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha. 4 Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta, 5 o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a. 6 Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike 7 laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya. 8 Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi. 9 Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ. 10 A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche. 11 Nʼihi ya, abaara m ha mba jụọ ha si: “Gịnị mere unu jiri gbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ?” Mgbe ahụ akpọghachiri m ndị Livayị nyekwa ha ọrụ ha nʼụlọnsọ. 12 Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ. 13 E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke. 14 Chineke m, biko cheta m nʼihi nke a, ehichapụkwala ihe niile m ji obi m niile rụọ nʼụlọnsọ gị na ije ozi niile ya. 15 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka m hụrụ na Juda ndị na-azọcha mmanya vaịnị nʼụbọchị izuike, ndị ji ịnyịnya ibu na-ebubata ogbe ọka, na-ebokwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu, tinyekwara mmanya, na mkpụrụ vaịnị na fiig, na ibu niile ọbụla. Ha na-ebubatakwa ha nʼime Jerusalem nʼụbọchị izuike. Nke a mere m ji dọọ ha aka na ntị megide ire nri nʼụbọchị ahụ. 16 Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike. 17 A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike? 18 Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?” 19 Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike. 20 Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ. 21 Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike. 22 Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị. 23 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab, 24 chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị. 25 Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ. 26 Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị. 27 Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?” 28 Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor. 29 Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị. 30 Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya. 31 Emekwara m ka a na-ebubata nkụ nke ebe ịchụ aja nʼoge kwesiri, meekwa ka a na-ewebata onyinye mkpụrụ mbụ niile nʼoge ha. Cheta m Chineke, gosi m ihuọma gị.

In Other Versions

Nehemiah 13 in the ANGEFD

Nehemiah 13 in the ANTPNG2D

Nehemiah 13 in the AS21

Nehemiah 13 in the BAGH

Nehemiah 13 in the BBPNG

Nehemiah 13 in the BBT1E

Nehemiah 13 in the BDS

Nehemiah 13 in the BEV

Nehemiah 13 in the BHAD

Nehemiah 13 in the BIB

Nehemiah 13 in the BLPT

Nehemiah 13 in the BNT

Nehemiah 13 in the BNTABOOT

Nehemiah 13 in the BNTLV

Nehemiah 13 in the BOATCB

Nehemiah 13 in the BOATCB2

Nehemiah 13 in the BOBCV

Nehemiah 13 in the BOCNT

Nehemiah 13 in the BOECS

Nehemiah 13 in the BOGWICC

Nehemiah 13 in the BOHCB

Nehemiah 13 in the BOHCV

Nehemiah 13 in the BOHLNT

Nehemiah 13 in the BOHNTLTAL

Nehemiah 13 in the BOILNTAP

Nehemiah 13 in the BOITCV

Nehemiah 13 in the BOKCV

Nehemiah 13 in the BOKCV2

Nehemiah 13 in the BOKHWOG

Nehemiah 13 in the BOKSSV

Nehemiah 13 in the BOLCB

Nehemiah 13 in the BOLCB2

Nehemiah 13 in the BOMCV

Nehemiah 13 in the BONAV

Nehemiah 13 in the BONCB

Nehemiah 13 in the BONLT

Nehemiah 13 in the BONUT2

Nehemiah 13 in the BOPLNT

Nehemiah 13 in the BOSCB

Nehemiah 13 in the BOSNC

Nehemiah 13 in the BOTLNT

Nehemiah 13 in the BOVCB

Nehemiah 13 in the BOYCB

Nehemiah 13 in the BPBB

Nehemiah 13 in the BPH

Nehemiah 13 in the BSB

Nehemiah 13 in the CCB

Nehemiah 13 in the CUV

Nehemiah 13 in the CUVS

Nehemiah 13 in the DBT

Nehemiah 13 in the DGDNT

Nehemiah 13 in the DHNT

Nehemiah 13 in the DNT

Nehemiah 13 in the ELBE

Nehemiah 13 in the EMTV

Nehemiah 13 in the ESV

Nehemiah 13 in the FBV

Nehemiah 13 in the FEB

Nehemiah 13 in the GGMNT

Nehemiah 13 in the GNT

Nehemiah 13 in the HARY

Nehemiah 13 in the HNT

Nehemiah 13 in the IRVA

Nehemiah 13 in the IRVB

Nehemiah 13 in the IRVG

Nehemiah 13 in the IRVH

Nehemiah 13 in the IRVK

Nehemiah 13 in the IRVM

Nehemiah 13 in the IRVM2

Nehemiah 13 in the IRVO

Nehemiah 13 in the IRVP

Nehemiah 13 in the IRVT

Nehemiah 13 in the IRVT2

Nehemiah 13 in the IRVU

Nehemiah 13 in the ISVN

Nehemiah 13 in the JSNT

Nehemiah 13 in the KAPI

Nehemiah 13 in the KBT1ETNIK

Nehemiah 13 in the KBV

Nehemiah 13 in the KJV

Nehemiah 13 in the KNFD

Nehemiah 13 in the LBA

Nehemiah 13 in the LBLA

Nehemiah 13 in the LNT

Nehemiah 13 in the LSV

Nehemiah 13 in the MAAL

Nehemiah 13 in the MBV

Nehemiah 13 in the MBV2

Nehemiah 13 in the MHNT

Nehemiah 13 in the MKNFD

Nehemiah 13 in the MNG

Nehemiah 13 in the MNT

Nehemiah 13 in the MNT2

Nehemiah 13 in the MRS1T

Nehemiah 13 in the NAA

Nehemiah 13 in the NASB

Nehemiah 13 in the NBLA

Nehemiah 13 in the NBS

Nehemiah 13 in the NBVTP

Nehemiah 13 in the NET2

Nehemiah 13 in the NIV11

Nehemiah 13 in the NNT

Nehemiah 13 in the NNT2

Nehemiah 13 in the NNT3

Nehemiah 13 in the PDDPT

Nehemiah 13 in the PFNT

Nehemiah 13 in the RMNT

Nehemiah 13 in the SBIAS

Nehemiah 13 in the SBIBS

Nehemiah 13 in the SBIBS2

Nehemiah 13 in the SBICS

Nehemiah 13 in the SBIDS

Nehemiah 13 in the SBIGS

Nehemiah 13 in the SBIHS

Nehemiah 13 in the SBIIS

Nehemiah 13 in the SBIIS2

Nehemiah 13 in the SBIIS3

Nehemiah 13 in the SBIKS

Nehemiah 13 in the SBIKS2

Nehemiah 13 in the SBIMS

Nehemiah 13 in the SBIOS

Nehemiah 13 in the SBIPS

Nehemiah 13 in the SBISS

Nehemiah 13 in the SBITS

Nehemiah 13 in the SBITS2

Nehemiah 13 in the SBITS3

Nehemiah 13 in the SBITS4

Nehemiah 13 in the SBIUS

Nehemiah 13 in the SBIVS

Nehemiah 13 in the SBT

Nehemiah 13 in the SBT1E

Nehemiah 13 in the SCHL

Nehemiah 13 in the SNT

Nehemiah 13 in the SUSU

Nehemiah 13 in the SUSU2

Nehemiah 13 in the SYNO

Nehemiah 13 in the TBIAOTANT

Nehemiah 13 in the TBT1E

Nehemiah 13 in the TBT1E2

Nehemiah 13 in the TFTIP

Nehemiah 13 in the TFTU

Nehemiah 13 in the TGNTATF3T

Nehemiah 13 in the THAI

Nehemiah 13 in the TNFD

Nehemiah 13 in the TNT

Nehemiah 13 in the TNTIK

Nehemiah 13 in the TNTIL

Nehemiah 13 in the TNTIN

Nehemiah 13 in the TNTIP

Nehemiah 13 in the TNTIZ

Nehemiah 13 in the TOMA

Nehemiah 13 in the TTENT

Nehemiah 13 in the UBG

Nehemiah 13 in the UGV

Nehemiah 13 in the UGV2

Nehemiah 13 in the UGV3

Nehemiah 13 in the VBL

Nehemiah 13 in the VDCC

Nehemiah 13 in the YALU

Nehemiah 13 in the YAPE

Nehemiah 13 in the YBVTP

Nehemiah 13 in the ZBP