Numbers 18 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Erọn sị, “Gị, na ụmụ gị ndị ikom gị, na ezinaụlọ nna gị ga-ebu ahụhụ ajọ omume metụtara ebe nsọ ahụ. Gị na ụmụ gị ndị ikom naanị ka ọ dị nʼaka ịsa ajụjụ ihe ọjọọ ọbụla banyere ọrụ nchụaja. 2 Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama. 3 Ha ga-anọ gị nʼokpuru ije ozi niile nʼụlọ nzute, ma ha agaghị abịaru nso ngwongwo e ji chọọ ebe nsọ ahụ mma, maọbụ nʼebe ịchụ aja. Ma ọ bụghị otu a, gị na ha ga-anwụ. 4 Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ. 5 “Gị ka ọ dịrị ilekọta ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ, na ebe ịchụ aja ahụ, ka oke iwe ONYENWE ANYỊ ghara ịdakwasị onye ọbụla nʼala Izrel ọzọ. 6 Mụ onwe m ahọpụtala ụmụnna gị ndị Livayị site nʼetiti ndị Izrel, were ha nye gị dịka onyinye, ka ha bụrụ ndị e doro nsọ nye ONYENWE ANYỊ maka ịrụ ọrụ ụlọ nzute. 7 Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.” 8 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Erọn okwu sị ya, “Mụ onwe m emeela gị onye nlekọta onyinye niile a na-eche nʼihu m, onyinye niile dị nsọ nke ụmụ Izrel wetara m ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom dịka oke ruuru unu site nʼụkpụrụ ebighị ebi. 9 Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom. 10 A ga-eri ha dịka ihe dịkarịrị nsọ. Nwa nwoke ọbụla ga-eri ya. Unu ga-agụ ha dịka ihe dị nsọ. 11 “Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya. 12 “Ana m enye gị mmanụ oliv nke kachasị mma, na mmanya ọhụrụ nke kachasị mma na ọka, bụ mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ha na-ewetara ONYENWE ANYỊ. 13 Mkpụrụ mbụ nke ihe niile dị nʼala nke ha na-ewebatara ONYENWE ANYỊ, ga-abụ nke gị. Onye ọbụla nke dị ọcha nʼezinaụlọ unu nwere ike iso rie ya. 14 “Ihe niile e doro nsọ nʼala Izrel niile nye ONYENWE ANYỊ bụ nke gị. 15 Ihe niile e bụ ụzọ mụọ, ma mmadụ ma anụ ụlọ, nke e nyere ONYENWE ANYỊ dịka onyinye, bụ nke gị. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ, na ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ ndị na-adịghị ọcha. 16 Mgbe ha dị otu ọnwa, a ga-eji shekel ọlaọcha ise, nʼusoro shekel ebe nsọ, nke bụ iri ihe ọtụtụ gera abụọ gbapụta ha. 17 “Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. 18 Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị. 19 Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu ONYENWE ANYỊ ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu ONYENWE ANYỊ nye gị na ụmụ ụmụ gị.” 20 ONYENWE ANYỊ gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel. 21 “Enyela m ndị Livayị, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri ahụ ụmụ Izrel niile na-akwụbatara m. Nke a bụ ihe nketa ha nʼihi ọrụ ha na-arụ nʼụlọ nzute. 22 Site ugbu a gaa nʼihu, o nweghị onye Izrel ọbụla kwesiri ịbịa nso ụlọ nzute ahụ, ka ha ghara iwetara onwe ha ikpe ọmụma, mmehie na ọnwụ. 23 Ọ bụ naanị ụmụ Livayị ga-arụ ọrụ nʼụlọ nzute ahụ. Ha ka ọ dịrị ibu ahụhụ ajọ omume ọbụla banyere ejezighị ozi nke ụlọ nzute. Ụkpụrụ a ga-adị ebighị ebi ruo ọgbọ niile dị nʼihu. Ndị Livayị agaghị enwe ihe nketa nke aka ha nʼetiti ụmụ Izrel. 24 Kama, enyela m ndị Livayị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ niile ndị Izrel na-ewetara ONYENWE ANYỊ ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ nke a mere m ji kwuo sị, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa nʼetiti ụmụ Izrel.’ ” 25 ONYENWE ANYỊ gwakwara Mosis okwu sị, 26 “Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye ONYENWE ANYỊ. 27 A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta. 28 Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu ONYENWE ANYỊ site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru ONYENWE ANYỊ. 29 Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru ONYENWE ANYỊ ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’ 30 “Gwa ndị Livayị okwu sị ha, ‘Mgbe unu wetara akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, a ga-agụnyere unu ya dịka a ga-asị na ọ bụ onyinye unu si nʼebe ịzọcha ọka, na nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị unu weta. 31 Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute. 32 Ikpe ọmụma agaghị adịrị unu mgbe unu na-eri ya ma ọ bụrụ na unu chere onyinye ndị ahụ kachasị mma nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ma kpachapụnụ anya hụ na unu e merụghị onyinye ndị a dị nsọ ụmụ Izrel webatara. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-anwụ.’ ”

In Other Versions

Numbers 18 in the ANGEFD

Numbers 18 in the ANTPNG2D

Numbers 18 in the AS21

Numbers 18 in the BAGH

Numbers 18 in the BBPNG

Numbers 18 in the BBT1E

Numbers 18 in the BDS

Numbers 18 in the BEV

Numbers 18 in the BHAD

Numbers 18 in the BIB

Numbers 18 in the BLPT

Numbers 18 in the BNT

Numbers 18 in the BNTABOOT

Numbers 18 in the BNTLV

Numbers 18 in the BOATCB

Numbers 18 in the BOATCB2

Numbers 18 in the BOBCV

Numbers 18 in the BOCNT

Numbers 18 in the BOECS

Numbers 18 in the BOGWICC

Numbers 18 in the BOHCB

Numbers 18 in the BOHCV

Numbers 18 in the BOHLNT

Numbers 18 in the BOHNTLTAL

Numbers 18 in the BOILNTAP

Numbers 18 in the BOITCV

Numbers 18 in the BOKCV

Numbers 18 in the BOKCV2

Numbers 18 in the BOKHWOG

Numbers 18 in the BOKSSV

Numbers 18 in the BOLCB

Numbers 18 in the BOLCB2

Numbers 18 in the BOMCV

Numbers 18 in the BONAV

Numbers 18 in the BONCB

Numbers 18 in the BONLT

Numbers 18 in the BONUT2

Numbers 18 in the BOPLNT

Numbers 18 in the BOSCB

Numbers 18 in the BOSNC

Numbers 18 in the BOTLNT

Numbers 18 in the BOVCB

Numbers 18 in the BOYCB

Numbers 18 in the BPBB

Numbers 18 in the BPH

Numbers 18 in the BSB

Numbers 18 in the CCB

Numbers 18 in the CUV

Numbers 18 in the CUVS

Numbers 18 in the DBT

Numbers 18 in the DGDNT

Numbers 18 in the DHNT

Numbers 18 in the DNT

Numbers 18 in the ELBE

Numbers 18 in the EMTV

Numbers 18 in the ESV

Numbers 18 in the FBV

Numbers 18 in the FEB

Numbers 18 in the GGMNT

Numbers 18 in the GNT

Numbers 18 in the HARY

Numbers 18 in the HNT

Numbers 18 in the IRVA

Numbers 18 in the IRVB

Numbers 18 in the IRVG

Numbers 18 in the IRVH

Numbers 18 in the IRVK

Numbers 18 in the IRVM

Numbers 18 in the IRVM2

Numbers 18 in the IRVO

Numbers 18 in the IRVP

Numbers 18 in the IRVT

Numbers 18 in the IRVT2

Numbers 18 in the IRVU

Numbers 18 in the ISVN

Numbers 18 in the JSNT

Numbers 18 in the KAPI

Numbers 18 in the KBT1ETNIK

Numbers 18 in the KBV

Numbers 18 in the KJV

Numbers 18 in the KNFD

Numbers 18 in the LBA

Numbers 18 in the LBLA

Numbers 18 in the LNT

Numbers 18 in the LSV

Numbers 18 in the MAAL

Numbers 18 in the MBV

Numbers 18 in the MBV2

Numbers 18 in the MHNT

Numbers 18 in the MKNFD

Numbers 18 in the MNG

Numbers 18 in the MNT

Numbers 18 in the MNT2

Numbers 18 in the MRS1T

Numbers 18 in the NAA

Numbers 18 in the NASB

Numbers 18 in the NBLA

Numbers 18 in the NBS

Numbers 18 in the NBVTP

Numbers 18 in the NET2

Numbers 18 in the NIV11

Numbers 18 in the NNT

Numbers 18 in the NNT2

Numbers 18 in the NNT3

Numbers 18 in the PDDPT

Numbers 18 in the PFNT

Numbers 18 in the RMNT

Numbers 18 in the SBIAS

Numbers 18 in the SBIBS

Numbers 18 in the SBIBS2

Numbers 18 in the SBICS

Numbers 18 in the SBIDS

Numbers 18 in the SBIGS

Numbers 18 in the SBIHS

Numbers 18 in the SBIIS

Numbers 18 in the SBIIS2

Numbers 18 in the SBIIS3

Numbers 18 in the SBIKS

Numbers 18 in the SBIKS2

Numbers 18 in the SBIMS

Numbers 18 in the SBIOS

Numbers 18 in the SBIPS

Numbers 18 in the SBISS

Numbers 18 in the SBITS

Numbers 18 in the SBITS2

Numbers 18 in the SBITS3

Numbers 18 in the SBITS4

Numbers 18 in the SBIUS

Numbers 18 in the SBIVS

Numbers 18 in the SBT

Numbers 18 in the SBT1E

Numbers 18 in the SCHL

Numbers 18 in the SNT

Numbers 18 in the SUSU

Numbers 18 in the SUSU2

Numbers 18 in the SYNO

Numbers 18 in the TBIAOTANT

Numbers 18 in the TBT1E

Numbers 18 in the TBT1E2

Numbers 18 in the TFTIP

Numbers 18 in the TFTU

Numbers 18 in the TGNTATF3T

Numbers 18 in the THAI

Numbers 18 in the TNFD

Numbers 18 in the TNT

Numbers 18 in the TNTIK

Numbers 18 in the TNTIL

Numbers 18 in the TNTIN

Numbers 18 in the TNTIP

Numbers 18 in the TNTIZ

Numbers 18 in the TOMA

Numbers 18 in the TTENT

Numbers 18 in the UBG

Numbers 18 in the UGV

Numbers 18 in the UGV2

Numbers 18 in the UGV3

Numbers 18 in the VBL

Numbers 18 in the VDCC

Numbers 18 in the YALU

Numbers 18 in the YAPE

Numbers 18 in the YBVTP

Numbers 18 in the ZBP