Numbers 19 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, 2 “Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ ONYENWE ANYỊ nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya. 3 Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya. 4 Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa. 5 Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ. 6 Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ. 7 Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. 8 Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị. 9 “Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie. 10 Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 11 “Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 12 Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị. 13 Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ ONYENWE ANYỊ. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha. 14 “Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 15 Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. 16 “Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 17 “Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute. 18 Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka. 19 Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha. 20 Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ ONYENWE ANYỊ. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha. 21 Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi.“Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. 22 Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”

In Other Versions

Numbers 19 in the ANGEFD

Numbers 19 in the ANTPNG2D

Numbers 19 in the AS21

Numbers 19 in the BAGH

Numbers 19 in the BBPNG

Numbers 19 in the BBT1E

Numbers 19 in the BDS

Numbers 19 in the BEV

Numbers 19 in the BHAD

Numbers 19 in the BIB

Numbers 19 in the BLPT

Numbers 19 in the BNT

Numbers 19 in the BNTABOOT

Numbers 19 in the BNTLV

Numbers 19 in the BOATCB

Numbers 19 in the BOATCB2

Numbers 19 in the BOBCV

Numbers 19 in the BOCNT

Numbers 19 in the BOECS

Numbers 19 in the BOGWICC

Numbers 19 in the BOHCB

Numbers 19 in the BOHCV

Numbers 19 in the BOHLNT

Numbers 19 in the BOHNTLTAL

Numbers 19 in the BOILNTAP

Numbers 19 in the BOITCV

Numbers 19 in the BOKCV

Numbers 19 in the BOKCV2

Numbers 19 in the BOKHWOG

Numbers 19 in the BOKSSV

Numbers 19 in the BOLCB

Numbers 19 in the BOLCB2

Numbers 19 in the BOMCV

Numbers 19 in the BONAV

Numbers 19 in the BONCB

Numbers 19 in the BONLT

Numbers 19 in the BONUT2

Numbers 19 in the BOPLNT

Numbers 19 in the BOSCB

Numbers 19 in the BOSNC

Numbers 19 in the BOTLNT

Numbers 19 in the BOVCB

Numbers 19 in the BOYCB

Numbers 19 in the BPBB

Numbers 19 in the BPH

Numbers 19 in the BSB

Numbers 19 in the CCB

Numbers 19 in the CUV

Numbers 19 in the CUVS

Numbers 19 in the DBT

Numbers 19 in the DGDNT

Numbers 19 in the DHNT

Numbers 19 in the DNT

Numbers 19 in the ELBE

Numbers 19 in the EMTV

Numbers 19 in the ESV

Numbers 19 in the FBV

Numbers 19 in the FEB

Numbers 19 in the GGMNT

Numbers 19 in the GNT

Numbers 19 in the HARY

Numbers 19 in the HNT

Numbers 19 in the IRVA

Numbers 19 in the IRVB

Numbers 19 in the IRVG

Numbers 19 in the IRVH

Numbers 19 in the IRVK

Numbers 19 in the IRVM

Numbers 19 in the IRVM2

Numbers 19 in the IRVO

Numbers 19 in the IRVP

Numbers 19 in the IRVT

Numbers 19 in the IRVT2

Numbers 19 in the IRVU

Numbers 19 in the ISVN

Numbers 19 in the JSNT

Numbers 19 in the KAPI

Numbers 19 in the KBT1ETNIK

Numbers 19 in the KBV

Numbers 19 in the KJV

Numbers 19 in the KNFD

Numbers 19 in the LBA

Numbers 19 in the LBLA

Numbers 19 in the LNT

Numbers 19 in the LSV

Numbers 19 in the MAAL

Numbers 19 in the MBV

Numbers 19 in the MBV2

Numbers 19 in the MHNT

Numbers 19 in the MKNFD

Numbers 19 in the MNG

Numbers 19 in the MNT

Numbers 19 in the MNT2

Numbers 19 in the MRS1T

Numbers 19 in the NAA

Numbers 19 in the NASB

Numbers 19 in the NBLA

Numbers 19 in the NBS

Numbers 19 in the NBVTP

Numbers 19 in the NET2

Numbers 19 in the NIV11

Numbers 19 in the NNT

Numbers 19 in the NNT2

Numbers 19 in the NNT3

Numbers 19 in the PDDPT

Numbers 19 in the PFNT

Numbers 19 in the RMNT

Numbers 19 in the SBIAS

Numbers 19 in the SBIBS

Numbers 19 in the SBIBS2

Numbers 19 in the SBICS

Numbers 19 in the SBIDS

Numbers 19 in the SBIGS

Numbers 19 in the SBIHS

Numbers 19 in the SBIIS

Numbers 19 in the SBIIS2

Numbers 19 in the SBIIS3

Numbers 19 in the SBIKS

Numbers 19 in the SBIKS2

Numbers 19 in the SBIMS

Numbers 19 in the SBIOS

Numbers 19 in the SBIPS

Numbers 19 in the SBISS

Numbers 19 in the SBITS

Numbers 19 in the SBITS2

Numbers 19 in the SBITS3

Numbers 19 in the SBITS4

Numbers 19 in the SBIUS

Numbers 19 in the SBIVS

Numbers 19 in the SBT

Numbers 19 in the SBT1E

Numbers 19 in the SCHL

Numbers 19 in the SNT

Numbers 19 in the SUSU

Numbers 19 in the SUSU2

Numbers 19 in the SYNO

Numbers 19 in the TBIAOTANT

Numbers 19 in the TBT1E

Numbers 19 in the TBT1E2

Numbers 19 in the TFTIP

Numbers 19 in the TFTU

Numbers 19 in the TGNTATF3T

Numbers 19 in the THAI

Numbers 19 in the TNFD

Numbers 19 in the TNT

Numbers 19 in the TNTIK

Numbers 19 in the TNTIL

Numbers 19 in the TNTIN

Numbers 19 in the TNTIP

Numbers 19 in the TNTIZ

Numbers 19 in the TOMA

Numbers 19 in the TTENT

Numbers 19 in the UBG

Numbers 19 in the UGV

Numbers 19 in the UGV2

Numbers 19 in the UGV3

Numbers 19 in the VBL

Numbers 19 in the VDCC

Numbers 19 in the YALU

Numbers 19 in the YAPE

Numbers 19 in the YBVTP

Numbers 19 in the ZBP