Numbers 21 (BOICB)

1 Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha. 2 Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere ONYENWE ANYỊ nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.” 3 ONYENWE ANYỊ ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa. 4 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a. 5 Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.” 6 Ya mere, ONYENWE ANYỊ zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel. 7 Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola ONYENWE ANYỊ, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị ONYENWE ANYỊ ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha. 8 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.” 9 Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ. 10 Ụmụ Izrel biliri njem, manye ụlọ ikwu ha na Obot. 11 Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ. 12 Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered. 13 Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait. 14 Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke ONYENWE ANYỊ na-asị,“Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niileAnọn 15 na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụnke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị,nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.” 16 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ ONYENWE ANYỊ nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.” 17 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a.“Sọpụta gị olulu mmiri!Bụọnụ abụ banyere mmiri a! 18 Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwurunke ndị ndu anyị doziri.Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.”Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana. 19 Ha si Matana jeruo Nahaliel, si Nahaliel jeruo Bamot. 20 Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. 21 Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya, 22 “Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.” 23 Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha. 24 Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa. 25 Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu. 26 Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn. 27 Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị,“Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya,ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike. 28 “Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ.Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn,rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab,ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn. 29 Ahụhụ dịrị gị Moab!Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh.Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi.A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha,nye Saịhọn eze ndị Amọrait. 30 “Ma anyị ebibiela ha,bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn,bibie ha ruo Nofa,ruokwa rịị Medeba.” 31 Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait. 32 Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ. 33 Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei. 34 Ma ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.” 35 Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.

In Other Versions

Numbers 21 in the ANGEFD

Numbers 21 in the ANTPNG2D

Numbers 21 in the AS21

Numbers 21 in the BAGH

Numbers 21 in the BBPNG

Numbers 21 in the BBT1E

Numbers 21 in the BDS

Numbers 21 in the BEV

Numbers 21 in the BHAD

Numbers 21 in the BIB

Numbers 21 in the BLPT

Numbers 21 in the BNT

Numbers 21 in the BNTABOOT

Numbers 21 in the BNTLV

Numbers 21 in the BOATCB

Numbers 21 in the BOATCB2

Numbers 21 in the BOBCV

Numbers 21 in the BOCNT

Numbers 21 in the BOECS

Numbers 21 in the BOGWICC

Numbers 21 in the BOHCB

Numbers 21 in the BOHCV

Numbers 21 in the BOHLNT

Numbers 21 in the BOHNTLTAL

Numbers 21 in the BOILNTAP

Numbers 21 in the BOITCV

Numbers 21 in the BOKCV

Numbers 21 in the BOKCV2

Numbers 21 in the BOKHWOG

Numbers 21 in the BOKSSV

Numbers 21 in the BOLCB

Numbers 21 in the BOLCB2

Numbers 21 in the BOMCV

Numbers 21 in the BONAV

Numbers 21 in the BONCB

Numbers 21 in the BONLT

Numbers 21 in the BONUT2

Numbers 21 in the BOPLNT

Numbers 21 in the BOSCB

Numbers 21 in the BOSNC

Numbers 21 in the BOTLNT

Numbers 21 in the BOVCB

Numbers 21 in the BOYCB

Numbers 21 in the BPBB

Numbers 21 in the BPH

Numbers 21 in the BSB

Numbers 21 in the CCB

Numbers 21 in the CUV

Numbers 21 in the CUVS

Numbers 21 in the DBT

Numbers 21 in the DGDNT

Numbers 21 in the DHNT

Numbers 21 in the DNT

Numbers 21 in the ELBE

Numbers 21 in the EMTV

Numbers 21 in the ESV

Numbers 21 in the FBV

Numbers 21 in the FEB

Numbers 21 in the GGMNT

Numbers 21 in the GNT

Numbers 21 in the HARY

Numbers 21 in the HNT

Numbers 21 in the IRVA

Numbers 21 in the IRVB

Numbers 21 in the IRVG

Numbers 21 in the IRVH

Numbers 21 in the IRVK

Numbers 21 in the IRVM

Numbers 21 in the IRVM2

Numbers 21 in the IRVO

Numbers 21 in the IRVP

Numbers 21 in the IRVT

Numbers 21 in the IRVT2

Numbers 21 in the IRVU

Numbers 21 in the ISVN

Numbers 21 in the JSNT

Numbers 21 in the KAPI

Numbers 21 in the KBT1ETNIK

Numbers 21 in the KBV

Numbers 21 in the KJV

Numbers 21 in the KNFD

Numbers 21 in the LBA

Numbers 21 in the LBLA

Numbers 21 in the LNT

Numbers 21 in the LSV

Numbers 21 in the MAAL

Numbers 21 in the MBV

Numbers 21 in the MBV2

Numbers 21 in the MHNT

Numbers 21 in the MKNFD

Numbers 21 in the MNG

Numbers 21 in the MNT

Numbers 21 in the MNT2

Numbers 21 in the MRS1T

Numbers 21 in the NAA

Numbers 21 in the NASB

Numbers 21 in the NBLA

Numbers 21 in the NBS

Numbers 21 in the NBVTP

Numbers 21 in the NET2

Numbers 21 in the NIV11

Numbers 21 in the NNT

Numbers 21 in the NNT2

Numbers 21 in the NNT3

Numbers 21 in the PDDPT

Numbers 21 in the PFNT

Numbers 21 in the RMNT

Numbers 21 in the SBIAS

Numbers 21 in the SBIBS

Numbers 21 in the SBIBS2

Numbers 21 in the SBICS

Numbers 21 in the SBIDS

Numbers 21 in the SBIGS

Numbers 21 in the SBIHS

Numbers 21 in the SBIIS

Numbers 21 in the SBIIS2

Numbers 21 in the SBIIS3

Numbers 21 in the SBIKS

Numbers 21 in the SBIKS2

Numbers 21 in the SBIMS

Numbers 21 in the SBIOS

Numbers 21 in the SBIPS

Numbers 21 in the SBISS

Numbers 21 in the SBITS

Numbers 21 in the SBITS2

Numbers 21 in the SBITS3

Numbers 21 in the SBITS4

Numbers 21 in the SBIUS

Numbers 21 in the SBIVS

Numbers 21 in the SBT

Numbers 21 in the SBT1E

Numbers 21 in the SCHL

Numbers 21 in the SNT

Numbers 21 in the SUSU

Numbers 21 in the SUSU2

Numbers 21 in the SYNO

Numbers 21 in the TBIAOTANT

Numbers 21 in the TBT1E

Numbers 21 in the TBT1E2

Numbers 21 in the TFTIP

Numbers 21 in the TFTU

Numbers 21 in the TGNTATF3T

Numbers 21 in the THAI

Numbers 21 in the TNFD

Numbers 21 in the TNT

Numbers 21 in the TNTIK

Numbers 21 in the TNTIL

Numbers 21 in the TNTIN

Numbers 21 in the TNTIP

Numbers 21 in the TNTIZ

Numbers 21 in the TOMA

Numbers 21 in the TTENT

Numbers 21 in the UBG

Numbers 21 in the UGV

Numbers 21 in the UGV2

Numbers 21 in the UGV3

Numbers 21 in the VBL

Numbers 21 in the VDCC

Numbers 21 in the YALU

Numbers 21 in the YAPE

Numbers 21 in the YBVTP

Numbers 21 in the ZBP