Numbers 28 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Nye ndị Izrel iwu a sị ha, ‘Lezienụ anya hụ na unu na-eche nʼihu m, nʼoge niile a kara aka, nri ahụ a na-enye maka onyinye m a na-enye site nʼọkụ, nke isisi ya na-adị m ezi mma.’ 3 Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu ONYENWE ANYỊ: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile. 4 Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi. 5 Ị ga-ejikwa lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja mkpụrụ ọka. 6 Nke a bụ aja nsure ọkụ ahụ ONYENWE ANYỊ nyere iwu ya nʼugwu Saịnaị na a ga na-achụrụ ya mgbe niile, dịka aja isisi ya dị ezi mma, aja nke a chụrụ site nʼọkụ nye ONYENWE ANYỊ. 7 Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye ONYENWE ANYỊ. 8 Nʼoge anyasị, ị ga-ewerekwa nwa atụrụ nke abụọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dị ka i mere nʼụtụtụ, jiri chụọ aja. Nke a bụkwa aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye ONYENWE ANYỊ. 9 “ ‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee. 10 Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha. 11 “ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ. 12 Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla. 13 Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa ONYENWE ANYỊ ezi ụtọ. 14 Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla, 15 nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mmehie. 16 “ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka a ga-edebe Mmemme Ngabiga. ONYENWE ANYỊ. 17 Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 18 Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ. 19 Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ. 20 Nʼisi otu oke ehi ọbụla, a ga-achụ aja mkpụrụ ọka nke a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, a gwakọtara ya na mmanụ chụọ. Nʼisi ebule ọbụla, lita ụtụ ọka anọ na ọkara. 21 Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, a ga-enye lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma. 22 Tinye otu mkpi nʼihi ịchụ aja mmehie maka ikpuchiri unu mmehie unu. 23 A ga-achụ aja ndị a, tinyere aja ndị ọzọ niile a na-achụ nʼụbọchị niile. 24 A ga-achụ aja ndị a ụbọchị niile nʼime ụbọchị asaa nke mmemme ahụ. Ha ga-abụ aja nke isisi ha dị ONYENWE ANYỊ ezi ụtọ. A ga-achụ ha, chụkwaa aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị. 25 Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. 26 “ ‘Nʼụbọchị mbụ nke mkpụrụ mbụ, mgbe unu na-eche onyinye ọka ọhụrụ unu nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼoge mmemme Izu Asaa, nweenụ mkpọkọta dị nsọ. Unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. 27 Unu ga-achụ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị ezi mma nye ONYENWE ANYỊ. Ọ bụ ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ka a ga-eji chụọ aja a. 28 Ihe unu ga-etinye nʼihe ndị a bụ aja mkpụrụ ọka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi otu oke ehi. Lita ụtụ ọka anọ na ọkara, nʼisi otu ebule, 29 na lita ụtụ ọka abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla. 30 Ọzọkwa, a ga-eji otu mkpi chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu. 31 Dozie aja ndị a tinyere aja ihe ọṅụṅụ ha, ya na aja nsure ọkụ na aja mkpụrụ ọka ya na aja ahụ so. Hụkwanụ na anụ ụlọ e ji chụọ aja ndị a bụ ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla.

In Other Versions

Numbers 28 in the ANGEFD

Numbers 28 in the ANTPNG2D

Numbers 28 in the AS21

Numbers 28 in the BAGH

Numbers 28 in the BBPNG

Numbers 28 in the BBT1E

Numbers 28 in the BDS

Numbers 28 in the BEV

Numbers 28 in the BHAD

Numbers 28 in the BIB

Numbers 28 in the BLPT

Numbers 28 in the BNT

Numbers 28 in the BNTABOOT

Numbers 28 in the BNTLV

Numbers 28 in the BOATCB

Numbers 28 in the BOATCB2

Numbers 28 in the BOBCV

Numbers 28 in the BOCNT

Numbers 28 in the BOECS

Numbers 28 in the BOGWICC

Numbers 28 in the BOHCB

Numbers 28 in the BOHCV

Numbers 28 in the BOHLNT

Numbers 28 in the BOHNTLTAL

Numbers 28 in the BOILNTAP

Numbers 28 in the BOITCV

Numbers 28 in the BOKCV

Numbers 28 in the BOKCV2

Numbers 28 in the BOKHWOG

Numbers 28 in the BOKSSV

Numbers 28 in the BOLCB

Numbers 28 in the BOLCB2

Numbers 28 in the BOMCV

Numbers 28 in the BONAV

Numbers 28 in the BONCB

Numbers 28 in the BONLT

Numbers 28 in the BONUT2

Numbers 28 in the BOPLNT

Numbers 28 in the BOSCB

Numbers 28 in the BOSNC

Numbers 28 in the BOTLNT

Numbers 28 in the BOVCB

Numbers 28 in the BOYCB

Numbers 28 in the BPBB

Numbers 28 in the BPH

Numbers 28 in the BSB

Numbers 28 in the CCB

Numbers 28 in the CUV

Numbers 28 in the CUVS

Numbers 28 in the DBT

Numbers 28 in the DGDNT

Numbers 28 in the DHNT

Numbers 28 in the DNT

Numbers 28 in the ELBE

Numbers 28 in the EMTV

Numbers 28 in the ESV

Numbers 28 in the FBV

Numbers 28 in the FEB

Numbers 28 in the GGMNT

Numbers 28 in the GNT

Numbers 28 in the HARY

Numbers 28 in the HNT

Numbers 28 in the IRVA

Numbers 28 in the IRVB

Numbers 28 in the IRVG

Numbers 28 in the IRVH

Numbers 28 in the IRVK

Numbers 28 in the IRVM

Numbers 28 in the IRVM2

Numbers 28 in the IRVO

Numbers 28 in the IRVP

Numbers 28 in the IRVT

Numbers 28 in the IRVT2

Numbers 28 in the IRVU

Numbers 28 in the ISVN

Numbers 28 in the JSNT

Numbers 28 in the KAPI

Numbers 28 in the KBT1ETNIK

Numbers 28 in the KBV

Numbers 28 in the KJV

Numbers 28 in the KNFD

Numbers 28 in the LBA

Numbers 28 in the LBLA

Numbers 28 in the LNT

Numbers 28 in the LSV

Numbers 28 in the MAAL

Numbers 28 in the MBV

Numbers 28 in the MBV2

Numbers 28 in the MHNT

Numbers 28 in the MKNFD

Numbers 28 in the MNG

Numbers 28 in the MNT

Numbers 28 in the MNT2

Numbers 28 in the MRS1T

Numbers 28 in the NAA

Numbers 28 in the NASB

Numbers 28 in the NBLA

Numbers 28 in the NBS

Numbers 28 in the NBVTP

Numbers 28 in the NET2

Numbers 28 in the NIV11

Numbers 28 in the NNT

Numbers 28 in the NNT2

Numbers 28 in the NNT3

Numbers 28 in the PDDPT

Numbers 28 in the PFNT

Numbers 28 in the RMNT

Numbers 28 in the SBIAS

Numbers 28 in the SBIBS

Numbers 28 in the SBIBS2

Numbers 28 in the SBICS

Numbers 28 in the SBIDS

Numbers 28 in the SBIGS

Numbers 28 in the SBIHS

Numbers 28 in the SBIIS

Numbers 28 in the SBIIS2

Numbers 28 in the SBIIS3

Numbers 28 in the SBIKS

Numbers 28 in the SBIKS2

Numbers 28 in the SBIMS

Numbers 28 in the SBIOS

Numbers 28 in the SBIPS

Numbers 28 in the SBISS

Numbers 28 in the SBITS

Numbers 28 in the SBITS2

Numbers 28 in the SBITS3

Numbers 28 in the SBITS4

Numbers 28 in the SBIUS

Numbers 28 in the SBIVS

Numbers 28 in the SBT

Numbers 28 in the SBT1E

Numbers 28 in the SCHL

Numbers 28 in the SNT

Numbers 28 in the SUSU

Numbers 28 in the SUSU2

Numbers 28 in the SYNO

Numbers 28 in the TBIAOTANT

Numbers 28 in the TBT1E

Numbers 28 in the TBT1E2

Numbers 28 in the TFTIP

Numbers 28 in the TFTU

Numbers 28 in the TGNTATF3T

Numbers 28 in the THAI

Numbers 28 in the TNFD

Numbers 28 in the TNT

Numbers 28 in the TNTIK

Numbers 28 in the TNTIL

Numbers 28 in the TNTIN

Numbers 28 in the TNTIP

Numbers 28 in the TNTIZ

Numbers 28 in the TOMA

Numbers 28 in the TTENT

Numbers 28 in the UBG

Numbers 28 in the UGV

Numbers 28 in the UGV2

Numbers 28 in the UGV3

Numbers 28 in the VBL

Numbers 28 in the VDCC

Numbers 28 in the YALU

Numbers 28 in the YAPE

Numbers 28 in the YBVTP

Numbers 28 in the ZBP