Numbers 3 (BOICB)

1 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Erọn na Mosis nʼoge ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị. 2 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, Nadab, ọkpara ya, Abihu, Elieza na Itama. 3 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, ndị e tere mmanụ ịbụ ndị nchụaja, ndị e doro nsọ nʼihi ije ozi dịka ndị nchụaja. 4 Ma ONYENWE ANYỊ mere ka Nadab na Abihu nwụọ, nʼihu ya nʼime ọzara Saịnaị, mgbe ha ji ọkụ na-adịghị nsọ wetara ya onyinye. Ebe ọ bụ na ha amụtaghị ụmụ ndị ikom nke aka ha, ọ bụ naanị Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja ogologo ụbọchị ndụ nna ha bụ Erọn. 5 Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 6 “Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya. 7 Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ. 8 Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ. 9 Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam. 10 Họpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dịka ndị nchụaja. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ka a ga-egbu.” 11 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 12 “Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m. 13 Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m ONYENWE ANYỊ.” 14 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya, 15 “Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.” 16 Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu ONYENWE ANYỊ si dị. 17 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị:Geshọn, Kohat na Merari. 18 Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị:Libni na Shimei. 19 Ụmụ Kohat dịka ikwu ha si dị:Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. 20 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị:Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị agbụrụ Livayị, dịka ezinaụlọ ha si dị. 21 Ndị Geshọn bụ ndị ikwu Libni na Shimei. Ndị a bụ ndị ikwu Geshọn. 22 Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise (7,500). 23 Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute. 24 Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael. 25 Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute. 26 Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a. 27 Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat. 28 Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600).Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ. 29 Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ. 30 Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel. 31 Ọrụ e tinyere ha nʼaka bụ ilekọta igbe ọgbụgba ndụ, tebul ahụ, ihe ịdọba oriọna ahụ na ebe ịchụ aja. Ihe ọzọ bụ ilekọta ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ, akwa mgbochi na ihe niile metụtara otu e si e ji ha eje ozi. 32 Onyeisi ndị ndu nke ndị Livayị bụ Elieza nwa Erọn, onye nchụaja. Ọ bụ ya na-elekọta ndị ọrụ ha bụ ihu maka ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ. 33 Ndị Merari bụ ikwu Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị ikwu Merari. 34 Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku isii na narị abụọ (6,200). 35 Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail.Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. 36 Ọrụ e tinyere nʼaka ndị ikwu Merari bụ ilekọta mbudo niile nke ụlọ nzute ahụ, na mkpọrọ ya niile, ụkwụ ya niile, na ngwongwo niile e kwesiri iji rụọ ọrụ metụtara ha. 37 Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile. 38 Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom.Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile.Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu. 39 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu. 40 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ. 41 Nabata ndị Livayị ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụrụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọzọkwa, anụ ụlọ ndị Livayị niile bụ nke m, nʼọnọdụ ụmụ mbụ nke anụ ụlọ niile a mụrụ nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel niile. Abụ m ONYENWE ANYỊ.” 42 Ya mere, Mosis gụrụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼIzrel, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu, 43 chọpụta na ọnụọgụgụ ndị ikom e buru ụzọ mụọ site nʼonye dị otu ọnwa ruo nʼokenye dị iri puku abụọ na puku abụọ na narị abụọ na iri asaa na atọ (22,273). 44 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị: 45 “Nye m ndị Livayị nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Nyekwa m anụ ụlọ ndị Livayị niile nʼọnọdụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ndị Livayị bụ nke m. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 46 Ihe a ga-eji gbara narị ụmụ ndị ikom Izrel abụọ na iri ndị ikom asaa, na atọ (273) ndị e buru ụzọ mụọ mapụtara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị 47 bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ. 48 Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.” 49 Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị. 50 Ego niile ọ natara site nʼaka ndị ikom Izrel niile e bụ ụzọ mụọ bụ ọlaọcha ruru puku shekel na narị shekel atọ na iri isii na ise (1,365), dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. 51 Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ego mgbapụta ndị a dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu.

In Other Versions

Numbers 3 in the ANGEFD

Numbers 3 in the ANTPNG2D

Numbers 3 in the AS21

Numbers 3 in the BAGH

Numbers 3 in the BBPNG

Numbers 3 in the BBT1E

Numbers 3 in the BDS

Numbers 3 in the BEV

Numbers 3 in the BHAD

Numbers 3 in the BIB

Numbers 3 in the BLPT

Numbers 3 in the BNT

Numbers 3 in the BNTABOOT

Numbers 3 in the BNTLV

Numbers 3 in the BOATCB

Numbers 3 in the BOATCB2

Numbers 3 in the BOBCV

Numbers 3 in the BOCNT

Numbers 3 in the BOECS

Numbers 3 in the BOGWICC

Numbers 3 in the BOHCB

Numbers 3 in the BOHCV

Numbers 3 in the BOHLNT

Numbers 3 in the BOHNTLTAL

Numbers 3 in the BOILNTAP

Numbers 3 in the BOITCV

Numbers 3 in the BOKCV

Numbers 3 in the BOKCV2

Numbers 3 in the BOKHWOG

Numbers 3 in the BOKSSV

Numbers 3 in the BOLCB

Numbers 3 in the BOLCB2

Numbers 3 in the BOMCV

Numbers 3 in the BONAV

Numbers 3 in the BONCB

Numbers 3 in the BONLT

Numbers 3 in the BONUT2

Numbers 3 in the BOPLNT

Numbers 3 in the BOSCB

Numbers 3 in the BOSNC

Numbers 3 in the BOTLNT

Numbers 3 in the BOVCB

Numbers 3 in the BOYCB

Numbers 3 in the BPBB

Numbers 3 in the BPH

Numbers 3 in the BSB

Numbers 3 in the CCB

Numbers 3 in the CUV

Numbers 3 in the CUVS

Numbers 3 in the DBT

Numbers 3 in the DGDNT

Numbers 3 in the DHNT

Numbers 3 in the DNT

Numbers 3 in the ELBE

Numbers 3 in the EMTV

Numbers 3 in the ESV

Numbers 3 in the FBV

Numbers 3 in the FEB

Numbers 3 in the GGMNT

Numbers 3 in the GNT

Numbers 3 in the HARY

Numbers 3 in the HNT

Numbers 3 in the IRVA

Numbers 3 in the IRVB

Numbers 3 in the IRVG

Numbers 3 in the IRVH

Numbers 3 in the IRVK

Numbers 3 in the IRVM

Numbers 3 in the IRVM2

Numbers 3 in the IRVO

Numbers 3 in the IRVP

Numbers 3 in the IRVT

Numbers 3 in the IRVT2

Numbers 3 in the IRVU

Numbers 3 in the ISVN

Numbers 3 in the JSNT

Numbers 3 in the KAPI

Numbers 3 in the KBT1ETNIK

Numbers 3 in the KBV

Numbers 3 in the KJV

Numbers 3 in the KNFD

Numbers 3 in the LBA

Numbers 3 in the LBLA

Numbers 3 in the LNT

Numbers 3 in the LSV

Numbers 3 in the MAAL

Numbers 3 in the MBV

Numbers 3 in the MBV2

Numbers 3 in the MHNT

Numbers 3 in the MKNFD

Numbers 3 in the MNG

Numbers 3 in the MNT

Numbers 3 in the MNT2

Numbers 3 in the MRS1T

Numbers 3 in the NAA

Numbers 3 in the NASB

Numbers 3 in the NBLA

Numbers 3 in the NBS

Numbers 3 in the NBVTP

Numbers 3 in the NET2

Numbers 3 in the NIV11

Numbers 3 in the NNT

Numbers 3 in the NNT2

Numbers 3 in the NNT3

Numbers 3 in the PDDPT

Numbers 3 in the PFNT

Numbers 3 in the RMNT

Numbers 3 in the SBIAS

Numbers 3 in the SBIBS

Numbers 3 in the SBIBS2

Numbers 3 in the SBICS

Numbers 3 in the SBIDS

Numbers 3 in the SBIGS

Numbers 3 in the SBIHS

Numbers 3 in the SBIIS

Numbers 3 in the SBIIS2

Numbers 3 in the SBIIS3

Numbers 3 in the SBIKS

Numbers 3 in the SBIKS2

Numbers 3 in the SBIMS

Numbers 3 in the SBIOS

Numbers 3 in the SBIPS

Numbers 3 in the SBISS

Numbers 3 in the SBITS

Numbers 3 in the SBITS2

Numbers 3 in the SBITS3

Numbers 3 in the SBITS4

Numbers 3 in the SBIUS

Numbers 3 in the SBIVS

Numbers 3 in the SBT

Numbers 3 in the SBT1E

Numbers 3 in the SCHL

Numbers 3 in the SNT

Numbers 3 in the SUSU

Numbers 3 in the SUSU2

Numbers 3 in the SYNO

Numbers 3 in the TBIAOTANT

Numbers 3 in the TBT1E

Numbers 3 in the TBT1E2

Numbers 3 in the TFTIP

Numbers 3 in the TFTU

Numbers 3 in the TGNTATF3T

Numbers 3 in the THAI

Numbers 3 in the TNFD

Numbers 3 in the TNT

Numbers 3 in the TNTIK

Numbers 3 in the TNTIL

Numbers 3 in the TNTIN

Numbers 3 in the TNTIP

Numbers 3 in the TNTIZ

Numbers 3 in the TOMA

Numbers 3 in the TTENT

Numbers 3 in the UBG

Numbers 3 in the UGV

Numbers 3 in the UGV2

Numbers 3 in the UGV3

Numbers 3 in the VBL

Numbers 3 in the VDCC

Numbers 3 in the YALU

Numbers 3 in the YAPE

Numbers 3 in the YBVTP

Numbers 3 in the ZBP