Numbers 4 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu sị, 2 “Gụọ ọnụ chọpụta, ọnụọgụgụ ụmụ Kohat dị nʼebo Livayị dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 3 Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute. 4 “Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ. 5 Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 6 Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị. 7 “Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị. 8 Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị. 9 “Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ. 10 Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya. 11 “Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ. 12 “Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha. 13 “A ga-ekpopụ ntụ dị nʼebe ịchụ aja bronz ahụ, jiri akwa na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, sachie ebe ịchụ aja bronz ahụ. 14 Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị. 15 “Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat. 16 “Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.” 17 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn sị, 18 “Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị. 19 Otu a ka unu ga-esi meso ha mmeso ime ka ha dịrị ndụ, ghara ịnwụ, mgbe ha bịara nso ihe ndị ahụ dịkarịsịrị nsọ, Erọn na ụmụ ya ga-esoro ha banye gosi onye ọ bụla nʼime ha ihe ha ga-ebu. 20 Ma ndị Kohat ekwesighị ịbanye ilekwasị ihe nsọ ndị ahụ anya, ka ha ghara ịnwụ.” 21 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 22 “Gụọ ọnụ chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Geshọn, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 23 Mata ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị kwesiri ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise. 24 “Ihe ga-abụ ọrụ ndị ikwu Geshọn ga-abụ ije ozi na ibu ibu. 25 Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 26 Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi. 27 Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu. 28 Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha. 29 “Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 30 Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị. 31 Ije ozi ha dịka o si metụta ọrụ ụlọ nzute bụ ibu mbudo ụlọ nzute ahụ niile, osisi ntụbichi ya niile, ogidi osisi na ụkwụ ya niile; 32 tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya. 33 Nke a bụ ọrụ dịịrị ndị agbụrụ Merari mgbe ha na-aga ozi ha nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.” 34 Ya mere, Mosis na Erọn na ndị ndu nzukọ ụmụ Izrel gụrụ ma chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Kohat, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 35 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute ahụ 36 dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị asaa na iri ise (2,750). 37 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Kohat ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 38 A gụrụ ụmụ Geshọn ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 39 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute, 40 dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị isii na iri atọ (2,630). 41 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Geshọn ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 42 A gụrụ ụmụ Merari ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 43 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute 44 dịka ikwu ha si dị bụ puku atọ na narị abụọ (3,200). 45 Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Merari ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 46 Otu a ka Mosis na Erọn na ndị ndu ụmụ Izrel si gụọ ndị Livayị niile ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 47 Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi na ibu ụlọ nzute ahụ 48 dị puku asatọ na narị ise na iri asatọ (8,580). 49 Dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere site nʼaka Mosis si dị, e kenyere onye ọbụla ọrụ ya ma gwa ya ihe o kwesiri ibu. A gụrụ ha ọnụ dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu.

In Other Versions

Numbers 4 in the ANGEFD

Numbers 4 in the ANTPNG2D

Numbers 4 in the AS21

Numbers 4 in the BAGH

Numbers 4 in the BBPNG

Numbers 4 in the BBT1E

Numbers 4 in the BDS

Numbers 4 in the BEV

Numbers 4 in the BHAD

Numbers 4 in the BIB

Numbers 4 in the BLPT

Numbers 4 in the BNT

Numbers 4 in the BNTABOOT

Numbers 4 in the BNTLV

Numbers 4 in the BOATCB

Numbers 4 in the BOATCB2

Numbers 4 in the BOBCV

Numbers 4 in the BOCNT

Numbers 4 in the BOECS

Numbers 4 in the BOGWICC

Numbers 4 in the BOHCB

Numbers 4 in the BOHCV

Numbers 4 in the BOHLNT

Numbers 4 in the BOHNTLTAL

Numbers 4 in the BOILNTAP

Numbers 4 in the BOITCV

Numbers 4 in the BOKCV

Numbers 4 in the BOKCV2

Numbers 4 in the BOKHWOG

Numbers 4 in the BOKSSV

Numbers 4 in the BOLCB

Numbers 4 in the BOLCB2

Numbers 4 in the BOMCV

Numbers 4 in the BONAV

Numbers 4 in the BONCB

Numbers 4 in the BONLT

Numbers 4 in the BONUT2

Numbers 4 in the BOPLNT

Numbers 4 in the BOSCB

Numbers 4 in the BOSNC

Numbers 4 in the BOTLNT

Numbers 4 in the BOVCB

Numbers 4 in the BOYCB

Numbers 4 in the BPBB

Numbers 4 in the BPH

Numbers 4 in the BSB

Numbers 4 in the CCB

Numbers 4 in the CUV

Numbers 4 in the CUVS

Numbers 4 in the DBT

Numbers 4 in the DGDNT

Numbers 4 in the DHNT

Numbers 4 in the DNT

Numbers 4 in the ELBE

Numbers 4 in the EMTV

Numbers 4 in the ESV

Numbers 4 in the FBV

Numbers 4 in the FEB

Numbers 4 in the GGMNT

Numbers 4 in the GNT

Numbers 4 in the HARY

Numbers 4 in the HNT

Numbers 4 in the IRVA

Numbers 4 in the IRVB

Numbers 4 in the IRVG

Numbers 4 in the IRVH

Numbers 4 in the IRVK

Numbers 4 in the IRVM

Numbers 4 in the IRVM2

Numbers 4 in the IRVO

Numbers 4 in the IRVP

Numbers 4 in the IRVT

Numbers 4 in the IRVT2

Numbers 4 in the IRVU

Numbers 4 in the ISVN

Numbers 4 in the JSNT

Numbers 4 in the KAPI

Numbers 4 in the KBT1ETNIK

Numbers 4 in the KBV

Numbers 4 in the KJV

Numbers 4 in the KNFD

Numbers 4 in the LBA

Numbers 4 in the LBLA

Numbers 4 in the LNT

Numbers 4 in the LSV

Numbers 4 in the MAAL

Numbers 4 in the MBV

Numbers 4 in the MBV2

Numbers 4 in the MHNT

Numbers 4 in the MKNFD

Numbers 4 in the MNG

Numbers 4 in the MNT

Numbers 4 in the MNT2

Numbers 4 in the MRS1T

Numbers 4 in the NAA

Numbers 4 in the NASB

Numbers 4 in the NBLA

Numbers 4 in the NBS

Numbers 4 in the NBVTP

Numbers 4 in the NET2

Numbers 4 in the NIV11

Numbers 4 in the NNT

Numbers 4 in the NNT2

Numbers 4 in the NNT3

Numbers 4 in the PDDPT

Numbers 4 in the PFNT

Numbers 4 in the RMNT

Numbers 4 in the SBIAS

Numbers 4 in the SBIBS

Numbers 4 in the SBIBS2

Numbers 4 in the SBICS

Numbers 4 in the SBIDS

Numbers 4 in the SBIGS

Numbers 4 in the SBIHS

Numbers 4 in the SBIIS

Numbers 4 in the SBIIS2

Numbers 4 in the SBIIS3

Numbers 4 in the SBIKS

Numbers 4 in the SBIKS2

Numbers 4 in the SBIMS

Numbers 4 in the SBIOS

Numbers 4 in the SBIPS

Numbers 4 in the SBISS

Numbers 4 in the SBITS

Numbers 4 in the SBITS2

Numbers 4 in the SBITS3

Numbers 4 in the SBITS4

Numbers 4 in the SBIUS

Numbers 4 in the SBIVS

Numbers 4 in the SBT

Numbers 4 in the SBT1E

Numbers 4 in the SCHL

Numbers 4 in the SNT

Numbers 4 in the SUSU

Numbers 4 in the SUSU2

Numbers 4 in the SYNO

Numbers 4 in the TBIAOTANT

Numbers 4 in the TBT1E

Numbers 4 in the TBT1E2

Numbers 4 in the TFTIP

Numbers 4 in the TFTU

Numbers 4 in the TGNTATF3T

Numbers 4 in the THAI

Numbers 4 in the TNFD

Numbers 4 in the TNT

Numbers 4 in the TNTIK

Numbers 4 in the TNTIL

Numbers 4 in the TNTIN

Numbers 4 in the TNTIP

Numbers 4 in the TNTIZ

Numbers 4 in the TOMA

Numbers 4 in the TTENT

Numbers 4 in the UBG

Numbers 4 in the UGV

Numbers 4 in the UGV2

Numbers 4 in the UGV3

Numbers 4 in the VBL

Numbers 4 in the VDCC

Numbers 4 in the YALU

Numbers 4 in the YAPE

Numbers 4 in the YBVTP

Numbers 4 in the ZBP