Proverbs 20 (BOICB)

1 Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ.Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu. 2 Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm;ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha. 3 Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka,ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu. 4 Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya.Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri. 5 Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi,ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha. 6 Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ,ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya? 7 Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ. 8 Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe,ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile. 9 Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha;Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?” 10 Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu,ha niile bụ ihe arụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. 11 Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile,nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi? 12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ,ọ bụ ONYENWE ANYỊ mere ha abụọ. 13 Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa.Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri. 14 “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị,ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara. 15 Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba,ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa. 16 Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe.Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe. 17 Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ.Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ. 18 Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime;ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa. 19 Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị,nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile. 20 Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna yaka Chineke na-afụnyụ. 21 Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ,agaghị agọzi ya nʼikpeazụ. 22 A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.”Chere ONYENWE ANYỊ, ọ ga-abọrọ gị ọbọ. 23 ONYENWE ANYỊ kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị,ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ. 24 ONYENWE ANYỊ na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ.Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha? 25 Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnyama mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ. 26 Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume,ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha. 27 Akọnuche mmadụ bụ ọkụ ONYENWE ANYỊ ji enyocha mmụọ ya,ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ. 28 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze,site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm. 29 Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha,ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye. 30 Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ,ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.

In Other Versions

Proverbs 20 in the ANGEFD

Proverbs 20 in the ANTPNG2D

Proverbs 20 in the AS21

Proverbs 20 in the BAGH

Proverbs 20 in the BBPNG

Proverbs 20 in the BBT1E

Proverbs 20 in the BDS

Proverbs 20 in the BEV

Proverbs 20 in the BHAD

Proverbs 20 in the BIB

Proverbs 20 in the BLPT

Proverbs 20 in the BNT

Proverbs 20 in the BNTABOOT

Proverbs 20 in the BNTLV

Proverbs 20 in the BOATCB

Proverbs 20 in the BOATCB2

Proverbs 20 in the BOBCV

Proverbs 20 in the BOCNT

Proverbs 20 in the BOECS

Proverbs 20 in the BOGWICC

Proverbs 20 in the BOHCB

Proverbs 20 in the BOHCV

Proverbs 20 in the BOHLNT

Proverbs 20 in the BOHNTLTAL

Proverbs 20 in the BOILNTAP

Proverbs 20 in the BOITCV

Proverbs 20 in the BOKCV

Proverbs 20 in the BOKCV2

Proverbs 20 in the BOKHWOG

Proverbs 20 in the BOKSSV

Proverbs 20 in the BOLCB

Proverbs 20 in the BOLCB2

Proverbs 20 in the BOMCV

Proverbs 20 in the BONAV

Proverbs 20 in the BONCB

Proverbs 20 in the BONLT

Proverbs 20 in the BONUT2

Proverbs 20 in the BOPLNT

Proverbs 20 in the BOSCB

Proverbs 20 in the BOSNC

Proverbs 20 in the BOTLNT

Proverbs 20 in the BOVCB

Proverbs 20 in the BOYCB

Proverbs 20 in the BPBB

Proverbs 20 in the BPH

Proverbs 20 in the BSB

Proverbs 20 in the CCB

Proverbs 20 in the CUV

Proverbs 20 in the CUVS

Proverbs 20 in the DBT

Proverbs 20 in the DGDNT

Proverbs 20 in the DHNT

Proverbs 20 in the DNT

Proverbs 20 in the ELBE

Proverbs 20 in the EMTV

Proverbs 20 in the ESV

Proverbs 20 in the FBV

Proverbs 20 in the FEB

Proverbs 20 in the GGMNT

Proverbs 20 in the GNT

Proverbs 20 in the HARY

Proverbs 20 in the HNT

Proverbs 20 in the IRVA

Proverbs 20 in the IRVB

Proverbs 20 in the IRVG

Proverbs 20 in the IRVH

Proverbs 20 in the IRVK

Proverbs 20 in the IRVM

Proverbs 20 in the IRVM2

Proverbs 20 in the IRVO

Proverbs 20 in the IRVP

Proverbs 20 in the IRVT

Proverbs 20 in the IRVT2

Proverbs 20 in the IRVU

Proverbs 20 in the ISVN

Proverbs 20 in the JSNT

Proverbs 20 in the KAPI

Proverbs 20 in the KBT1ETNIK

Proverbs 20 in the KBV

Proverbs 20 in the KJV

Proverbs 20 in the KNFD

Proverbs 20 in the LBA

Proverbs 20 in the LBLA

Proverbs 20 in the LNT

Proverbs 20 in the LSV

Proverbs 20 in the MAAL

Proverbs 20 in the MBV

Proverbs 20 in the MBV2

Proverbs 20 in the MHNT

Proverbs 20 in the MKNFD

Proverbs 20 in the MNG

Proverbs 20 in the MNT

Proverbs 20 in the MNT2

Proverbs 20 in the MRS1T

Proverbs 20 in the NAA

Proverbs 20 in the NASB

Proverbs 20 in the NBLA

Proverbs 20 in the NBS

Proverbs 20 in the NBVTP

Proverbs 20 in the NET2

Proverbs 20 in the NIV11

Proverbs 20 in the NNT

Proverbs 20 in the NNT2

Proverbs 20 in the NNT3

Proverbs 20 in the PDDPT

Proverbs 20 in the PFNT

Proverbs 20 in the RMNT

Proverbs 20 in the SBIAS

Proverbs 20 in the SBIBS

Proverbs 20 in the SBIBS2

Proverbs 20 in the SBICS

Proverbs 20 in the SBIDS

Proverbs 20 in the SBIGS

Proverbs 20 in the SBIHS

Proverbs 20 in the SBIIS

Proverbs 20 in the SBIIS2

Proverbs 20 in the SBIIS3

Proverbs 20 in the SBIKS

Proverbs 20 in the SBIKS2

Proverbs 20 in the SBIMS

Proverbs 20 in the SBIOS

Proverbs 20 in the SBIPS

Proverbs 20 in the SBISS

Proverbs 20 in the SBITS

Proverbs 20 in the SBITS2

Proverbs 20 in the SBITS3

Proverbs 20 in the SBITS4

Proverbs 20 in the SBIUS

Proverbs 20 in the SBIVS

Proverbs 20 in the SBT

Proverbs 20 in the SBT1E

Proverbs 20 in the SCHL

Proverbs 20 in the SNT

Proverbs 20 in the SUSU

Proverbs 20 in the SUSU2

Proverbs 20 in the SYNO

Proverbs 20 in the TBIAOTANT

Proverbs 20 in the TBT1E

Proverbs 20 in the TBT1E2

Proverbs 20 in the TFTIP

Proverbs 20 in the TFTU

Proverbs 20 in the TGNTATF3T

Proverbs 20 in the THAI

Proverbs 20 in the TNFD

Proverbs 20 in the TNT

Proverbs 20 in the TNTIK

Proverbs 20 in the TNTIL

Proverbs 20 in the TNTIN

Proverbs 20 in the TNTIP

Proverbs 20 in the TNTIZ

Proverbs 20 in the TOMA

Proverbs 20 in the TTENT

Proverbs 20 in the UBG

Proverbs 20 in the UGV

Proverbs 20 in the UGV2

Proverbs 20 in the UGV3

Proverbs 20 in the VBL

Proverbs 20 in the VDCC

Proverbs 20 in the YALU

Proverbs 20 in the YAPE

Proverbs 20 in the YBVTP

Proverbs 20 in the ZBP