Psalms 29 (BOICB)
undefined Abụ Ọma Devid. 1 Toonu ONYENWE ANYỊ, unu ndị bi nʼeluigwe,nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. 2 Nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ kwesiri aha ya;kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ nʼebube nke ịdị nsọ ya. 3 Olu ONYENWE ANYỊ na-ada nʼelu osimiri;olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,olu ONYENWE ANYỊ na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri. 4 Olu ONYENWE ANYỊ dị ike,olu ONYENWE ANYỊ jupụtakwara nʼebube. 5 Olu ONYENWE ANYỊ na-etiwa osisi ukwu sida; ONYENWE ANYỊ na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn. 6 Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ. 7 Olu ONYENWE ANYỊ na-agba dịka egbe eluigwemgbe amụma na-egbu. 8 Olu ONYENWE ANYỊ na-eme ka ọzara maa jijiji; ONYENWE ANYỊ na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 9 Olu ONYENWE ANYỊ na-eme ka osisi ook gbagọọna-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” 10 ONYENWE ANYỊ nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; ONYENWE ANYỊ na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. 11 ONYENWE ANYỊ na-enye ndị ya ike,ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.