Psalms 54 (BOICB)
undefined Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” 1 O Chineke, jiri aha gị zọpụta m;jirikwa ike gị kpepụta m. 2 O Chineke, nụrụ ekpere m;gee ntị nʼokwu ọnụ m. 3 Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha;ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m,ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela 4 Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 5 Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m;nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi. 6 Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja;O ONYENWE ANYỊ, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma. 7 Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile,ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.