Psalms 74 (BOICB)

undefined Abụ maskil nke Asaf. 1 Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ? 2 Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie,ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara,nʼugwu Zayọn ebe i biri. 3 Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a.Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a. 4 Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị.Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama. 5 Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụikeha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa. 6 Ha ji anyụike na egbugbu hakụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe. 7 Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa.Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị. 8 Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!”Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ. 9 Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke.Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ.Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ. 10 O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị?Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi? 11 Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị?Sepụta aka gị laa ha nʼiyi! 12 Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie.Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa. 13 Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ.Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri. 14 Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan,mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara. 15 Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ.I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa. 16 Ehihie na abalị bụ nke gị.I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike. 17 Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa.Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị. 18 O ONYENWE ANYỊ, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị,na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo. 19 Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka.Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi. 20 Chetakwa ọgbụgba ndụ gị,nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a. 21 Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere;ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị. 22 O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe.Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile. 23 Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya,olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.

In Other Versions

Psalms 74 in the ANGEFD

Psalms 74 in the ANTPNG2D

Psalms 74 in the AS21

Psalms 74 in the BAGH

Psalms 74 in the BBPNG

Psalms 74 in the BBT1E

Psalms 74 in the BDS

Psalms 74 in the BEV

Psalms 74 in the BHAD

Psalms 74 in the BIB

Psalms 74 in the BLPT

Psalms 74 in the BNT

Psalms 74 in the BNTABOOT

Psalms 74 in the BNTLV

Psalms 74 in the BOATCB

Psalms 74 in the BOATCB2

Psalms 74 in the BOBCV

Psalms 74 in the BOCNT

Psalms 74 in the BOECS

Psalms 74 in the BOGWICC

Psalms 74 in the BOHCB

Psalms 74 in the BOHCV

Psalms 74 in the BOHLNT

Psalms 74 in the BOHNTLTAL

Psalms 74 in the BOILNTAP

Psalms 74 in the BOITCV

Psalms 74 in the BOKCV

Psalms 74 in the BOKCV2

Psalms 74 in the BOKHWOG

Psalms 74 in the BOKSSV

Psalms 74 in the BOLCB

Psalms 74 in the BOLCB2

Psalms 74 in the BOMCV

Psalms 74 in the BONAV

Psalms 74 in the BONCB

Psalms 74 in the BONLT

Psalms 74 in the BONUT2

Psalms 74 in the BOPLNT

Psalms 74 in the BOSCB

Psalms 74 in the BOSNC

Psalms 74 in the BOTLNT

Psalms 74 in the BOVCB

Psalms 74 in the BOYCB

Psalms 74 in the BPBB

Psalms 74 in the BPH

Psalms 74 in the BSB

Psalms 74 in the CCB

Psalms 74 in the CUV

Psalms 74 in the CUVS

Psalms 74 in the DBT

Psalms 74 in the DGDNT

Psalms 74 in the DHNT

Psalms 74 in the DNT

Psalms 74 in the ELBE

Psalms 74 in the EMTV

Psalms 74 in the ESV

Psalms 74 in the FBV

Psalms 74 in the FEB

Psalms 74 in the GGMNT

Psalms 74 in the GNT

Psalms 74 in the HARY

Psalms 74 in the HNT

Psalms 74 in the IRVA

Psalms 74 in the IRVB

Psalms 74 in the IRVG

Psalms 74 in the IRVH

Psalms 74 in the IRVK

Psalms 74 in the IRVM

Psalms 74 in the IRVM2

Psalms 74 in the IRVO

Psalms 74 in the IRVP

Psalms 74 in the IRVT

Psalms 74 in the IRVT2

Psalms 74 in the IRVU

Psalms 74 in the ISVN

Psalms 74 in the JSNT

Psalms 74 in the KAPI

Psalms 74 in the KBT1ETNIK

Psalms 74 in the KBV

Psalms 74 in the KJV

Psalms 74 in the KNFD

Psalms 74 in the LBA

Psalms 74 in the LBLA

Psalms 74 in the LNT

Psalms 74 in the LSV

Psalms 74 in the MAAL

Psalms 74 in the MBV

Psalms 74 in the MBV2

Psalms 74 in the MHNT

Psalms 74 in the MKNFD

Psalms 74 in the MNG

Psalms 74 in the MNT

Psalms 74 in the MNT2

Psalms 74 in the MRS1T

Psalms 74 in the NAA

Psalms 74 in the NASB

Psalms 74 in the NBLA

Psalms 74 in the NBS

Psalms 74 in the NBVTP

Psalms 74 in the NET2

Psalms 74 in the NIV11

Psalms 74 in the NNT

Psalms 74 in the NNT2

Psalms 74 in the NNT3

Psalms 74 in the PDDPT

Psalms 74 in the PFNT

Psalms 74 in the RMNT

Psalms 74 in the SBIAS

Psalms 74 in the SBIBS

Psalms 74 in the SBIBS2

Psalms 74 in the SBICS

Psalms 74 in the SBIDS

Psalms 74 in the SBIGS

Psalms 74 in the SBIHS

Psalms 74 in the SBIIS

Psalms 74 in the SBIIS2

Psalms 74 in the SBIIS3

Psalms 74 in the SBIKS

Psalms 74 in the SBIKS2

Psalms 74 in the SBIMS

Psalms 74 in the SBIOS

Psalms 74 in the SBIPS

Psalms 74 in the SBISS

Psalms 74 in the SBITS

Psalms 74 in the SBITS2

Psalms 74 in the SBITS3

Psalms 74 in the SBITS4

Psalms 74 in the SBIUS

Psalms 74 in the SBIVS

Psalms 74 in the SBT

Psalms 74 in the SBT1E

Psalms 74 in the SCHL

Psalms 74 in the SNT

Psalms 74 in the SUSU

Psalms 74 in the SUSU2

Psalms 74 in the SYNO

Psalms 74 in the TBIAOTANT

Psalms 74 in the TBT1E

Psalms 74 in the TBT1E2

Psalms 74 in the TFTIP

Psalms 74 in the TFTU

Psalms 74 in the TGNTATF3T

Psalms 74 in the THAI

Psalms 74 in the TNFD

Psalms 74 in the TNT

Psalms 74 in the TNTIK

Psalms 74 in the TNTIL

Psalms 74 in the TNTIN

Psalms 74 in the TNTIP

Psalms 74 in the TNTIZ

Psalms 74 in the TOMA

Psalms 74 in the TTENT

Psalms 74 in the UBG

Psalms 74 in the UGV

Psalms 74 in the UGV2

Psalms 74 in the UGV3

Psalms 74 in the VBL

Psalms 74 in the VDCC

Psalms 74 in the YALU

Psalms 74 in the YAPE

Psalms 74 in the YBVTP

Psalms 74 in the ZBP