1 Chronicles 22 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru ONYENWE ANYỊ Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.” 2 Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke. 3 Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya. 4 O webatakwara osisi sida nʼapụghị ịgụta ọnụọgụgụ ha, nʼihi na ndị Taịa na Saịdọn butere ha nʼọnụọgụgụ riri nne nye Devid. 5 Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru ONYENWE ANYỊ ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne. 6 Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke Izrel ụlọ. 7 Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi iwu ụlọ maka aha ONYENWE ANYỊ bụ Chineke m, 8 ma okwu ONYENWE ANYỊ ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m. 9 Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya. 10 Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’ 11 “Ya mere, ugbu a nwa m, ka ONYENWE ANYỊ nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme. 12 ONYENWE ANYỊ nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu ONYENWE ANYỊ Chineke gị. 13 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke ONYENWE ANYỊ nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba. 14 “Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha. 15 Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche, 16 ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. ONYENWE ANYỊ aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.” 17 Devid nyere ndịisi Izrel iwu ka ha nyere nwa ya Solomọn aka, mgbe ọ ga-ewu ụlọ ahụ. 18 Ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ na ONYENWE ANYỊ Chineke anọnyereghị unu? Ọ bụ na o nyebeghị unu udo nʼakụkụ niile? Nʼihi na o nyela m mmeri nʼebe ndị iro m nọ. Ugbu a, ala a dịkwa nʼaka ONYENWE ANYỊ na nʼaka ndị ya. 19 Ya mere, tinyenụ obi unu na mmụọ unu nʼịgbaso ONYENWE ANYỊ Chineke unu. Malitekwanụ iwu ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ Chineke, ka unu nweekwa ike ibubata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, na ihe nsọ ndị ọzọ nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a ga-ewu nʼihi Aha ONYENWE ANYỊ.”

In Other Versions

1 Chronicles 22 in the ANGEFD

1 Chronicles 22 in the ANTPNG2D

1 Chronicles 22 in the AS21

1 Chronicles 22 in the BAGH

1 Chronicles 22 in the BBPNG

1 Chronicles 22 in the BBT1E

1 Chronicles 22 in the BDS

1 Chronicles 22 in the BEV

1 Chronicles 22 in the BHAD

1 Chronicles 22 in the BIB

1 Chronicles 22 in the BLPT

1 Chronicles 22 in the BNT

1 Chronicles 22 in the BNTABOOT

1 Chronicles 22 in the BNTLV

1 Chronicles 22 in the BOATCB

1 Chronicles 22 in the BOATCB2

1 Chronicles 22 in the BOBCV

1 Chronicles 22 in the BOCNT

1 Chronicles 22 in the BOECS

1 Chronicles 22 in the BOGWICC

1 Chronicles 22 in the BOHCB

1 Chronicles 22 in the BOHCV

1 Chronicles 22 in the BOHLNT

1 Chronicles 22 in the BOHNTLTAL

1 Chronicles 22 in the BOILNTAP

1 Chronicles 22 in the BOITCV

1 Chronicles 22 in the BOKCV

1 Chronicles 22 in the BOKCV2

1 Chronicles 22 in the BOKHWOG

1 Chronicles 22 in the BOKSSV

1 Chronicles 22 in the BOLCB

1 Chronicles 22 in the BOLCB2

1 Chronicles 22 in the BOMCV

1 Chronicles 22 in the BONAV

1 Chronicles 22 in the BONCB

1 Chronicles 22 in the BONLT

1 Chronicles 22 in the BONUT2

1 Chronicles 22 in the BOPLNT

1 Chronicles 22 in the BOSCB

1 Chronicles 22 in the BOSNC

1 Chronicles 22 in the BOTLNT

1 Chronicles 22 in the BOVCB

1 Chronicles 22 in the BOYCB

1 Chronicles 22 in the BPBB

1 Chronicles 22 in the BPH

1 Chronicles 22 in the BSB

1 Chronicles 22 in the CCB

1 Chronicles 22 in the CUV

1 Chronicles 22 in the CUVS

1 Chronicles 22 in the DBT

1 Chronicles 22 in the DGDNT

1 Chronicles 22 in the DHNT

1 Chronicles 22 in the DNT

1 Chronicles 22 in the ELBE

1 Chronicles 22 in the EMTV

1 Chronicles 22 in the ESV

1 Chronicles 22 in the FBV

1 Chronicles 22 in the FEB

1 Chronicles 22 in the GGMNT

1 Chronicles 22 in the GNT

1 Chronicles 22 in the HARY

1 Chronicles 22 in the HNT

1 Chronicles 22 in the IRVA

1 Chronicles 22 in the IRVB

1 Chronicles 22 in the IRVG

1 Chronicles 22 in the IRVH

1 Chronicles 22 in the IRVK

1 Chronicles 22 in the IRVM

1 Chronicles 22 in the IRVM2

1 Chronicles 22 in the IRVO

1 Chronicles 22 in the IRVP

1 Chronicles 22 in the IRVT

1 Chronicles 22 in the IRVT2

1 Chronicles 22 in the IRVU

1 Chronicles 22 in the ISVN

1 Chronicles 22 in the JSNT

1 Chronicles 22 in the KAPI

1 Chronicles 22 in the KBT1ETNIK

1 Chronicles 22 in the KBV

1 Chronicles 22 in the KJV

1 Chronicles 22 in the KNFD

1 Chronicles 22 in the LBA

1 Chronicles 22 in the LBLA

1 Chronicles 22 in the LNT

1 Chronicles 22 in the LSV

1 Chronicles 22 in the MAAL

1 Chronicles 22 in the MBV

1 Chronicles 22 in the MBV2

1 Chronicles 22 in the MHNT

1 Chronicles 22 in the MKNFD

1 Chronicles 22 in the MNG

1 Chronicles 22 in the MNT

1 Chronicles 22 in the MNT2

1 Chronicles 22 in the MRS1T

1 Chronicles 22 in the NAA

1 Chronicles 22 in the NASB

1 Chronicles 22 in the NBLA

1 Chronicles 22 in the NBS

1 Chronicles 22 in the NBVTP

1 Chronicles 22 in the NET2

1 Chronicles 22 in the NIV11

1 Chronicles 22 in the NNT

1 Chronicles 22 in the NNT2

1 Chronicles 22 in the NNT3

1 Chronicles 22 in the PDDPT

1 Chronicles 22 in the PFNT

1 Chronicles 22 in the RMNT

1 Chronicles 22 in the SBIAS

1 Chronicles 22 in the SBIBS

1 Chronicles 22 in the SBIBS2

1 Chronicles 22 in the SBICS

1 Chronicles 22 in the SBIDS

1 Chronicles 22 in the SBIGS

1 Chronicles 22 in the SBIHS

1 Chronicles 22 in the SBIIS

1 Chronicles 22 in the SBIIS2

1 Chronicles 22 in the SBIIS3

1 Chronicles 22 in the SBIKS

1 Chronicles 22 in the SBIKS2

1 Chronicles 22 in the SBIMS

1 Chronicles 22 in the SBIOS

1 Chronicles 22 in the SBIPS

1 Chronicles 22 in the SBISS

1 Chronicles 22 in the SBITS

1 Chronicles 22 in the SBITS2

1 Chronicles 22 in the SBITS3

1 Chronicles 22 in the SBITS4

1 Chronicles 22 in the SBIUS

1 Chronicles 22 in the SBIVS

1 Chronicles 22 in the SBT

1 Chronicles 22 in the SBT1E

1 Chronicles 22 in the SCHL

1 Chronicles 22 in the SNT

1 Chronicles 22 in the SUSU

1 Chronicles 22 in the SUSU2

1 Chronicles 22 in the SYNO

1 Chronicles 22 in the TBIAOTANT

1 Chronicles 22 in the TBT1E

1 Chronicles 22 in the TBT1E2

1 Chronicles 22 in the TFTIP

1 Chronicles 22 in the TFTU

1 Chronicles 22 in the TGNTATF3T

1 Chronicles 22 in the THAI

1 Chronicles 22 in the TNFD

1 Chronicles 22 in the TNT

1 Chronicles 22 in the TNTIK

1 Chronicles 22 in the TNTIL

1 Chronicles 22 in the TNTIN

1 Chronicles 22 in the TNTIP

1 Chronicles 22 in the TNTIZ

1 Chronicles 22 in the TOMA

1 Chronicles 22 in the TTENT

1 Chronicles 22 in the UBG

1 Chronicles 22 in the UGV

1 Chronicles 22 in the UGV2

1 Chronicles 22 in the UGV3

1 Chronicles 22 in the VBL

1 Chronicles 22 in the VDCC

1 Chronicles 22 in the YALU

1 Chronicles 22 in the YAPE

1 Chronicles 22 in the YBVTP

1 Chronicles 22 in the ZBP