1 Corinthians 3 (BOICB)

1 Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dịka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nʼime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dịka ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị bụ ụmụntakịrị nʼime Kraịst. 2 Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike. 3 Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa. 4 Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa? 5 Onye bụ Apọlọs? Onye bụ Pọl? Ọ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu oziọma unu kweere nʼime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dịka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ. 6 Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ ahụ, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, maọbụ Chineke mere ka o too. 7 Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa. 8 O nweghị ihe dị iche nʼetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bu nʼobi. Onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya. 9 Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu. 10 Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu. 11 O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ. 12 Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ, 13 ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ. 14 Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ. 15 Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya. 16 Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu? 17 Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ. 18 Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe. 19 Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.” 20 Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.” 21 Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị. 22 Ma ọ bụ Pọl, maọbụ Apọlọs, maọbụ Sefas, maọbụ ụwa a, maọbụ ndụ, maọbụ ọnwụ, maọbụ ihe dị taa na ihe niile ga-adị nʼoge dị nʼihu, ha bụ nke unu. 23 Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke.

In Other Versions

1 Corinthians 3 in the ANGEFD

1 Corinthians 3 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 3 in the AS21

1 Corinthians 3 in the BAGH

1 Corinthians 3 in the BBPNG

1 Corinthians 3 in the BBT1E

1 Corinthians 3 in the BDS

1 Corinthians 3 in the BEV

1 Corinthians 3 in the BHAD

1 Corinthians 3 in the BIB

1 Corinthians 3 in the BLPT

1 Corinthians 3 in the BNT

1 Corinthians 3 in the BNTABOOT

1 Corinthians 3 in the BNTLV

1 Corinthians 3 in the BOATCB

1 Corinthians 3 in the BOATCB2

1 Corinthians 3 in the BOBCV

1 Corinthians 3 in the BOCNT

1 Corinthians 3 in the BOECS

1 Corinthians 3 in the BOGWICC

1 Corinthians 3 in the BOHCB

1 Corinthians 3 in the BOHCV

1 Corinthians 3 in the BOHLNT

1 Corinthians 3 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 3 in the BOILNTAP

1 Corinthians 3 in the BOITCV

1 Corinthians 3 in the BOKCV

1 Corinthians 3 in the BOKCV2

1 Corinthians 3 in the BOKHWOG

1 Corinthians 3 in the BOKSSV

1 Corinthians 3 in the BOLCB

1 Corinthians 3 in the BOLCB2

1 Corinthians 3 in the BOMCV

1 Corinthians 3 in the BONAV

1 Corinthians 3 in the BONCB

1 Corinthians 3 in the BONLT

1 Corinthians 3 in the BONUT2

1 Corinthians 3 in the BOPLNT

1 Corinthians 3 in the BOSCB

1 Corinthians 3 in the BOSNC

1 Corinthians 3 in the BOTLNT

1 Corinthians 3 in the BOVCB

1 Corinthians 3 in the BOYCB

1 Corinthians 3 in the BPBB

1 Corinthians 3 in the BPH

1 Corinthians 3 in the BSB

1 Corinthians 3 in the CCB

1 Corinthians 3 in the CUV

1 Corinthians 3 in the CUVS

1 Corinthians 3 in the DBT

1 Corinthians 3 in the DGDNT

1 Corinthians 3 in the DHNT

1 Corinthians 3 in the DNT

1 Corinthians 3 in the ELBE

1 Corinthians 3 in the EMTV

1 Corinthians 3 in the ESV

1 Corinthians 3 in the FBV

1 Corinthians 3 in the FEB

1 Corinthians 3 in the GGMNT

1 Corinthians 3 in the GNT

1 Corinthians 3 in the HARY

1 Corinthians 3 in the HNT

1 Corinthians 3 in the IRVA

1 Corinthians 3 in the IRVB

1 Corinthians 3 in the IRVG

1 Corinthians 3 in the IRVH

1 Corinthians 3 in the IRVK

1 Corinthians 3 in the IRVM

1 Corinthians 3 in the IRVM2

1 Corinthians 3 in the IRVO

1 Corinthians 3 in the IRVP

1 Corinthians 3 in the IRVT

1 Corinthians 3 in the IRVT2

1 Corinthians 3 in the IRVU

1 Corinthians 3 in the ISVN

1 Corinthians 3 in the JSNT

1 Corinthians 3 in the KAPI

1 Corinthians 3 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 3 in the KBV

1 Corinthians 3 in the KJV

1 Corinthians 3 in the KNFD

1 Corinthians 3 in the LBA

1 Corinthians 3 in the LBLA

1 Corinthians 3 in the LNT

1 Corinthians 3 in the LSV

1 Corinthians 3 in the MAAL

1 Corinthians 3 in the MBV

1 Corinthians 3 in the MBV2

1 Corinthians 3 in the MHNT

1 Corinthians 3 in the MKNFD

1 Corinthians 3 in the MNG

1 Corinthians 3 in the MNT

1 Corinthians 3 in the MNT2

1 Corinthians 3 in the MRS1T

1 Corinthians 3 in the NAA

1 Corinthians 3 in the NASB

1 Corinthians 3 in the NBLA

1 Corinthians 3 in the NBS

1 Corinthians 3 in the NBVTP

1 Corinthians 3 in the NET2

1 Corinthians 3 in the NIV11

1 Corinthians 3 in the NNT

1 Corinthians 3 in the NNT2

1 Corinthians 3 in the NNT3

1 Corinthians 3 in the PDDPT

1 Corinthians 3 in the PFNT

1 Corinthians 3 in the RMNT

1 Corinthians 3 in the SBIAS

1 Corinthians 3 in the SBIBS

1 Corinthians 3 in the SBIBS2

1 Corinthians 3 in the SBICS

1 Corinthians 3 in the SBIDS

1 Corinthians 3 in the SBIGS

1 Corinthians 3 in the SBIHS

1 Corinthians 3 in the SBIIS

1 Corinthians 3 in the SBIIS2

1 Corinthians 3 in the SBIIS3

1 Corinthians 3 in the SBIKS

1 Corinthians 3 in the SBIKS2

1 Corinthians 3 in the SBIMS

1 Corinthians 3 in the SBIOS

1 Corinthians 3 in the SBIPS

1 Corinthians 3 in the SBISS

1 Corinthians 3 in the SBITS

1 Corinthians 3 in the SBITS2

1 Corinthians 3 in the SBITS3

1 Corinthians 3 in the SBITS4

1 Corinthians 3 in the SBIUS

1 Corinthians 3 in the SBIVS

1 Corinthians 3 in the SBT

1 Corinthians 3 in the SBT1E

1 Corinthians 3 in the SCHL

1 Corinthians 3 in the SNT

1 Corinthians 3 in the SUSU

1 Corinthians 3 in the SUSU2

1 Corinthians 3 in the SYNO

1 Corinthians 3 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 3 in the TBT1E

1 Corinthians 3 in the TBT1E2

1 Corinthians 3 in the TFTIP

1 Corinthians 3 in the TFTU

1 Corinthians 3 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 3 in the THAI

1 Corinthians 3 in the TNFD

1 Corinthians 3 in the TNT

1 Corinthians 3 in the TNTIK

1 Corinthians 3 in the TNTIL

1 Corinthians 3 in the TNTIN

1 Corinthians 3 in the TNTIP

1 Corinthians 3 in the TNTIZ

1 Corinthians 3 in the TOMA

1 Corinthians 3 in the TTENT

1 Corinthians 3 in the UBG

1 Corinthians 3 in the UGV

1 Corinthians 3 in the UGV2

1 Corinthians 3 in the UGV3

1 Corinthians 3 in the VBL

1 Corinthians 3 in the VDCC

1 Corinthians 3 in the YALU

1 Corinthians 3 in the YAPE

1 Corinthians 3 in the YBVTP

1 Corinthians 3 in the ZBP