1 Kings 17 (BOICB)

1 Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha ONYENWE ANYỊ Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!” 2 Okwu ONYENWE ANYỊ rutere Ịlaịja ntị, sị ya, 3 “Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan. 4 Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.” 5 O mere ihe ONYENWE ANYỊ gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ. 6 Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ. 7 Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ. 8 Okwu ONYENWE ANYỊ bịakwutere ya, 9 “Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.” 10 Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.” 11 Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.” 12 Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ONYENWE ANYỊ Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.” 13 Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri. 14 Nʼihi na nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ ONYENWE ANYỊ ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ” 15 Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya. 16 Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu ONYENWE ANYỊ kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma. 17 Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya. 18 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?” 19 Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya. 20 Ọ kpọkuru ONYENWE ANYỊ sị ya, “ONYENWE ANYỊ Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?” 21 Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo ONYENWE ANYỊ, sị, “Biko, ONYENWE ANYỊ Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.” 22 ONYENWE ANYỊ nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ. 23 Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!” 24 Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”

In Other Versions

1 Kings 17 in the ANGEFD

1 Kings 17 in the ANTPNG2D

1 Kings 17 in the AS21

1 Kings 17 in the BAGH

1 Kings 17 in the BBPNG

1 Kings 17 in the BBT1E

1 Kings 17 in the BDS

1 Kings 17 in the BEV

1 Kings 17 in the BHAD

1 Kings 17 in the BIB

1 Kings 17 in the BLPT

1 Kings 17 in the BNT

1 Kings 17 in the BNTABOOT

1 Kings 17 in the BNTLV

1 Kings 17 in the BOATCB

1 Kings 17 in the BOATCB2

1 Kings 17 in the BOBCV

1 Kings 17 in the BOCNT

1 Kings 17 in the BOECS

1 Kings 17 in the BOGWICC

1 Kings 17 in the BOHCB

1 Kings 17 in the BOHCV

1 Kings 17 in the BOHLNT

1 Kings 17 in the BOHNTLTAL

1 Kings 17 in the BOILNTAP

1 Kings 17 in the BOITCV

1 Kings 17 in the BOKCV

1 Kings 17 in the BOKCV2

1 Kings 17 in the BOKHWOG

1 Kings 17 in the BOKSSV

1 Kings 17 in the BOLCB

1 Kings 17 in the BOLCB2

1 Kings 17 in the BOMCV

1 Kings 17 in the BONAV

1 Kings 17 in the BONCB

1 Kings 17 in the BONLT

1 Kings 17 in the BONUT2

1 Kings 17 in the BOPLNT

1 Kings 17 in the BOSCB

1 Kings 17 in the BOSNC

1 Kings 17 in the BOTLNT

1 Kings 17 in the BOVCB

1 Kings 17 in the BOYCB

1 Kings 17 in the BPBB

1 Kings 17 in the BPH

1 Kings 17 in the BSB

1 Kings 17 in the CCB

1 Kings 17 in the CUV

1 Kings 17 in the CUVS

1 Kings 17 in the DBT

1 Kings 17 in the DGDNT

1 Kings 17 in the DHNT

1 Kings 17 in the DNT

1 Kings 17 in the ELBE

1 Kings 17 in the EMTV

1 Kings 17 in the ESV

1 Kings 17 in the FBV

1 Kings 17 in the FEB

1 Kings 17 in the GGMNT

1 Kings 17 in the GNT

1 Kings 17 in the HARY

1 Kings 17 in the HNT

1 Kings 17 in the IRVA

1 Kings 17 in the IRVB

1 Kings 17 in the IRVG

1 Kings 17 in the IRVH

1 Kings 17 in the IRVK

1 Kings 17 in the IRVM

1 Kings 17 in the IRVM2

1 Kings 17 in the IRVO

1 Kings 17 in the IRVP

1 Kings 17 in the IRVT

1 Kings 17 in the IRVT2

1 Kings 17 in the IRVU

1 Kings 17 in the ISVN

1 Kings 17 in the JSNT

1 Kings 17 in the KAPI

1 Kings 17 in the KBT1ETNIK

1 Kings 17 in the KBV

1 Kings 17 in the KJV

1 Kings 17 in the KNFD

1 Kings 17 in the LBA

1 Kings 17 in the LBLA

1 Kings 17 in the LNT

1 Kings 17 in the LSV

1 Kings 17 in the MAAL

1 Kings 17 in the MBV

1 Kings 17 in the MBV2

1 Kings 17 in the MHNT

1 Kings 17 in the MKNFD

1 Kings 17 in the MNG

1 Kings 17 in the MNT

1 Kings 17 in the MNT2

1 Kings 17 in the MRS1T

1 Kings 17 in the NAA

1 Kings 17 in the NASB

1 Kings 17 in the NBLA

1 Kings 17 in the NBS

1 Kings 17 in the NBVTP

1 Kings 17 in the NET2

1 Kings 17 in the NIV11

1 Kings 17 in the NNT

1 Kings 17 in the NNT2

1 Kings 17 in the NNT3

1 Kings 17 in the PDDPT

1 Kings 17 in the PFNT

1 Kings 17 in the RMNT

1 Kings 17 in the SBIAS

1 Kings 17 in the SBIBS

1 Kings 17 in the SBIBS2

1 Kings 17 in the SBICS

1 Kings 17 in the SBIDS

1 Kings 17 in the SBIGS

1 Kings 17 in the SBIHS

1 Kings 17 in the SBIIS

1 Kings 17 in the SBIIS2

1 Kings 17 in the SBIIS3

1 Kings 17 in the SBIKS

1 Kings 17 in the SBIKS2

1 Kings 17 in the SBIMS

1 Kings 17 in the SBIOS

1 Kings 17 in the SBIPS

1 Kings 17 in the SBISS

1 Kings 17 in the SBITS

1 Kings 17 in the SBITS2

1 Kings 17 in the SBITS3

1 Kings 17 in the SBITS4

1 Kings 17 in the SBIUS

1 Kings 17 in the SBIVS

1 Kings 17 in the SBT

1 Kings 17 in the SBT1E

1 Kings 17 in the SCHL

1 Kings 17 in the SNT

1 Kings 17 in the SUSU

1 Kings 17 in the SUSU2

1 Kings 17 in the SYNO

1 Kings 17 in the TBIAOTANT

1 Kings 17 in the TBT1E

1 Kings 17 in the TBT1E2

1 Kings 17 in the TFTIP

1 Kings 17 in the TFTU

1 Kings 17 in the TGNTATF3T

1 Kings 17 in the THAI

1 Kings 17 in the TNFD

1 Kings 17 in the TNT

1 Kings 17 in the TNTIK

1 Kings 17 in the TNTIL

1 Kings 17 in the TNTIN

1 Kings 17 in the TNTIP

1 Kings 17 in the TNTIZ

1 Kings 17 in the TOMA

1 Kings 17 in the TTENT

1 Kings 17 in the UBG

1 Kings 17 in the UGV

1 Kings 17 in the UGV2

1 Kings 17 in the UGV3

1 Kings 17 in the VBL

1 Kings 17 in the VDCC

1 Kings 17 in the YALU

1 Kings 17 in the YAPE

1 Kings 17 in the YBVTP

1 Kings 17 in the ZBP