1 Kings 5 (BOICB)

1 Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma. 2 Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya: 3 “Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha ONYENWE ANYỊ Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ. Ọ nọkwa na-eche ka ONYENWE ANYỊ nye ya udo. 4 Ugbu a, ONYENWE ANYỊ Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla. 5 Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYỊ Chineke m, dịka ONYENWE ANYỊ gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’ 6 “Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.” 7 Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.” 8 Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị,“Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa. 9 Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.” 10 Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ. 11 Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ. 12 ONYENWE ANYỊ nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ. 13 Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ. 14 Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a. 15 Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ. 16 Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ. 17 Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ 18 Ndị ikom si Gebal, nyere ndị ọrụ Solomọn na ndị ọrụ Hiram aka, igbutu osisi na ịwa ha. Ha nyekwara aka ịkwado nkume e ji ewu ụlọ ahụ.

In Other Versions

1 Kings 5 in the ANGEFD

1 Kings 5 in the ANTPNG2D

1 Kings 5 in the AS21

1 Kings 5 in the BAGH

1 Kings 5 in the BBPNG

1 Kings 5 in the BBT1E

1 Kings 5 in the BDS

1 Kings 5 in the BEV

1 Kings 5 in the BHAD

1 Kings 5 in the BIB

1 Kings 5 in the BLPT

1 Kings 5 in the BNT

1 Kings 5 in the BNTABOOT

1 Kings 5 in the BNTLV

1 Kings 5 in the BOATCB

1 Kings 5 in the BOATCB2

1 Kings 5 in the BOBCV

1 Kings 5 in the BOCNT

1 Kings 5 in the BOECS

1 Kings 5 in the BOGWICC

1 Kings 5 in the BOHCB

1 Kings 5 in the BOHCV

1 Kings 5 in the BOHLNT

1 Kings 5 in the BOHNTLTAL

1 Kings 5 in the BOILNTAP

1 Kings 5 in the BOITCV

1 Kings 5 in the BOKCV

1 Kings 5 in the BOKCV2

1 Kings 5 in the BOKHWOG

1 Kings 5 in the BOKSSV

1 Kings 5 in the BOLCB

1 Kings 5 in the BOLCB2

1 Kings 5 in the BOMCV

1 Kings 5 in the BONAV

1 Kings 5 in the BONCB

1 Kings 5 in the BONLT

1 Kings 5 in the BONUT2

1 Kings 5 in the BOPLNT

1 Kings 5 in the BOSCB

1 Kings 5 in the BOSNC

1 Kings 5 in the BOTLNT

1 Kings 5 in the BOVCB

1 Kings 5 in the BOYCB

1 Kings 5 in the BPBB

1 Kings 5 in the BPH

1 Kings 5 in the BSB

1 Kings 5 in the CCB

1 Kings 5 in the CUV

1 Kings 5 in the CUVS

1 Kings 5 in the DBT

1 Kings 5 in the DGDNT

1 Kings 5 in the DHNT

1 Kings 5 in the DNT

1 Kings 5 in the ELBE

1 Kings 5 in the EMTV

1 Kings 5 in the ESV

1 Kings 5 in the FBV

1 Kings 5 in the FEB

1 Kings 5 in the GGMNT

1 Kings 5 in the GNT

1 Kings 5 in the HARY

1 Kings 5 in the HNT

1 Kings 5 in the IRVA

1 Kings 5 in the IRVB

1 Kings 5 in the IRVG

1 Kings 5 in the IRVH

1 Kings 5 in the IRVK

1 Kings 5 in the IRVM

1 Kings 5 in the IRVM2

1 Kings 5 in the IRVO

1 Kings 5 in the IRVP

1 Kings 5 in the IRVT

1 Kings 5 in the IRVT2

1 Kings 5 in the IRVU

1 Kings 5 in the ISVN

1 Kings 5 in the JSNT

1 Kings 5 in the KAPI

1 Kings 5 in the KBT1ETNIK

1 Kings 5 in the KBV

1 Kings 5 in the KJV

1 Kings 5 in the KNFD

1 Kings 5 in the LBA

1 Kings 5 in the LBLA

1 Kings 5 in the LNT

1 Kings 5 in the LSV

1 Kings 5 in the MAAL

1 Kings 5 in the MBV

1 Kings 5 in the MBV2

1 Kings 5 in the MHNT

1 Kings 5 in the MKNFD

1 Kings 5 in the MNG

1 Kings 5 in the MNT

1 Kings 5 in the MNT2

1 Kings 5 in the MRS1T

1 Kings 5 in the NAA

1 Kings 5 in the NASB

1 Kings 5 in the NBLA

1 Kings 5 in the NBS

1 Kings 5 in the NBVTP

1 Kings 5 in the NET2

1 Kings 5 in the NIV11

1 Kings 5 in the NNT

1 Kings 5 in the NNT2

1 Kings 5 in the NNT3

1 Kings 5 in the PDDPT

1 Kings 5 in the PFNT

1 Kings 5 in the RMNT

1 Kings 5 in the SBIAS

1 Kings 5 in the SBIBS

1 Kings 5 in the SBIBS2

1 Kings 5 in the SBICS

1 Kings 5 in the SBIDS

1 Kings 5 in the SBIGS

1 Kings 5 in the SBIHS

1 Kings 5 in the SBIIS

1 Kings 5 in the SBIIS2

1 Kings 5 in the SBIIS3

1 Kings 5 in the SBIKS

1 Kings 5 in the SBIKS2

1 Kings 5 in the SBIMS

1 Kings 5 in the SBIOS

1 Kings 5 in the SBIPS

1 Kings 5 in the SBISS

1 Kings 5 in the SBITS

1 Kings 5 in the SBITS2

1 Kings 5 in the SBITS3

1 Kings 5 in the SBITS4

1 Kings 5 in the SBIUS

1 Kings 5 in the SBIVS

1 Kings 5 in the SBT

1 Kings 5 in the SBT1E

1 Kings 5 in the SCHL

1 Kings 5 in the SNT

1 Kings 5 in the SUSU

1 Kings 5 in the SUSU2

1 Kings 5 in the SYNO

1 Kings 5 in the TBIAOTANT

1 Kings 5 in the TBT1E

1 Kings 5 in the TBT1E2

1 Kings 5 in the TFTIP

1 Kings 5 in the TFTU

1 Kings 5 in the TGNTATF3T

1 Kings 5 in the THAI

1 Kings 5 in the TNFD

1 Kings 5 in the TNT

1 Kings 5 in the TNTIK

1 Kings 5 in the TNTIL

1 Kings 5 in the TNTIN

1 Kings 5 in the TNTIP

1 Kings 5 in the TNTIZ

1 Kings 5 in the TOMA

1 Kings 5 in the TTENT

1 Kings 5 in the UBG

1 Kings 5 in the UGV

1 Kings 5 in the UGV2

1 Kings 5 in the UGV3

1 Kings 5 in the VBL

1 Kings 5 in the VDCC

1 Kings 5 in the YALU

1 Kings 5 in the YAPE

1 Kings 5 in the YBVTP

1 Kings 5 in the ZBP