1 Samuel 10 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na ONYENWE ANYỊ etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya? 2 Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’ 3 “Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya. 4 Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha. 5 “Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma. 6 Nʼoge ahụ, mmụọ ONYENWE ANYỊ ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche. 7 Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị. 8 “Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.” 9 Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ. 10 Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma. 11 Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?” 12 Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?” 13 Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu. 14 Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?”Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.” 15 Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.” 16 Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla. 17 Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute ONYENWE ANYỊ. 18 Ọ gwara ha sị, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’ 19 Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.” 20 Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin. 21 O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya. 22 Ha jụrụ ONYENWE ANYỊ ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” ONYENWE ANYỊ sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.” 23 Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. 24 Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ ONYENWE ANYỊ họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!”Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!” 25 Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya. 26 Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya. 27 Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

In Other Versions

1 Samuel 10 in the ANGEFD

1 Samuel 10 in the ANTPNG2D

1 Samuel 10 in the AS21

1 Samuel 10 in the BAGH

1 Samuel 10 in the BBPNG

1 Samuel 10 in the BBT1E

1 Samuel 10 in the BDS

1 Samuel 10 in the BEV

1 Samuel 10 in the BHAD

1 Samuel 10 in the BIB

1 Samuel 10 in the BLPT

1 Samuel 10 in the BNT

1 Samuel 10 in the BNTABOOT

1 Samuel 10 in the BNTLV

1 Samuel 10 in the BOATCB

1 Samuel 10 in the BOATCB2

1 Samuel 10 in the BOBCV

1 Samuel 10 in the BOCNT

1 Samuel 10 in the BOECS

1 Samuel 10 in the BOGWICC

1 Samuel 10 in the BOHCB

1 Samuel 10 in the BOHCV

1 Samuel 10 in the BOHLNT

1 Samuel 10 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 10 in the BOILNTAP

1 Samuel 10 in the BOITCV

1 Samuel 10 in the BOKCV

1 Samuel 10 in the BOKCV2

1 Samuel 10 in the BOKHWOG

1 Samuel 10 in the BOKSSV

1 Samuel 10 in the BOLCB

1 Samuel 10 in the BOLCB2

1 Samuel 10 in the BOMCV

1 Samuel 10 in the BONAV

1 Samuel 10 in the BONCB

1 Samuel 10 in the BONLT

1 Samuel 10 in the BONUT2

1 Samuel 10 in the BOPLNT

1 Samuel 10 in the BOSCB

1 Samuel 10 in the BOSNC

1 Samuel 10 in the BOTLNT

1 Samuel 10 in the BOVCB

1 Samuel 10 in the BOYCB

1 Samuel 10 in the BPBB

1 Samuel 10 in the BPH

1 Samuel 10 in the BSB

1 Samuel 10 in the CCB

1 Samuel 10 in the CUV

1 Samuel 10 in the CUVS

1 Samuel 10 in the DBT

1 Samuel 10 in the DGDNT

1 Samuel 10 in the DHNT

1 Samuel 10 in the DNT

1 Samuel 10 in the ELBE

1 Samuel 10 in the EMTV

1 Samuel 10 in the ESV

1 Samuel 10 in the FBV

1 Samuel 10 in the FEB

1 Samuel 10 in the GGMNT

1 Samuel 10 in the GNT

1 Samuel 10 in the HARY

1 Samuel 10 in the HNT

1 Samuel 10 in the IRVA

1 Samuel 10 in the IRVB

1 Samuel 10 in the IRVG

1 Samuel 10 in the IRVH

1 Samuel 10 in the IRVK

1 Samuel 10 in the IRVM

1 Samuel 10 in the IRVM2

1 Samuel 10 in the IRVO

1 Samuel 10 in the IRVP

1 Samuel 10 in the IRVT

1 Samuel 10 in the IRVT2

1 Samuel 10 in the IRVU

1 Samuel 10 in the ISVN

1 Samuel 10 in the JSNT

1 Samuel 10 in the KAPI

1 Samuel 10 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 10 in the KBV

1 Samuel 10 in the KJV

1 Samuel 10 in the KNFD

1 Samuel 10 in the LBA

1 Samuel 10 in the LBLA

1 Samuel 10 in the LNT

1 Samuel 10 in the LSV

1 Samuel 10 in the MAAL

1 Samuel 10 in the MBV

1 Samuel 10 in the MBV2

1 Samuel 10 in the MHNT

1 Samuel 10 in the MKNFD

1 Samuel 10 in the MNG

1 Samuel 10 in the MNT

1 Samuel 10 in the MNT2

1 Samuel 10 in the MRS1T

1 Samuel 10 in the NAA

1 Samuel 10 in the NASB

1 Samuel 10 in the NBLA

1 Samuel 10 in the NBS

1 Samuel 10 in the NBVTP

1 Samuel 10 in the NET2

1 Samuel 10 in the NIV11

1 Samuel 10 in the NNT

1 Samuel 10 in the NNT2

1 Samuel 10 in the NNT3

1 Samuel 10 in the PDDPT

1 Samuel 10 in the PFNT

1 Samuel 10 in the RMNT

1 Samuel 10 in the SBIAS

1 Samuel 10 in the SBIBS

1 Samuel 10 in the SBIBS2

1 Samuel 10 in the SBICS

1 Samuel 10 in the SBIDS

1 Samuel 10 in the SBIGS

1 Samuel 10 in the SBIHS

1 Samuel 10 in the SBIIS

1 Samuel 10 in the SBIIS2

1 Samuel 10 in the SBIIS3

1 Samuel 10 in the SBIKS

1 Samuel 10 in the SBIKS2

1 Samuel 10 in the SBIMS

1 Samuel 10 in the SBIOS

1 Samuel 10 in the SBIPS

1 Samuel 10 in the SBISS

1 Samuel 10 in the SBITS

1 Samuel 10 in the SBITS2

1 Samuel 10 in the SBITS3

1 Samuel 10 in the SBITS4

1 Samuel 10 in the SBIUS

1 Samuel 10 in the SBIVS

1 Samuel 10 in the SBT

1 Samuel 10 in the SBT1E

1 Samuel 10 in the SCHL

1 Samuel 10 in the SNT

1 Samuel 10 in the SUSU

1 Samuel 10 in the SUSU2

1 Samuel 10 in the SYNO

1 Samuel 10 in the TBIAOTANT

1 Samuel 10 in the TBT1E

1 Samuel 10 in the TBT1E2

1 Samuel 10 in the TFTIP

1 Samuel 10 in the TFTU

1 Samuel 10 in the TGNTATF3T

1 Samuel 10 in the THAI

1 Samuel 10 in the TNFD

1 Samuel 10 in the TNT

1 Samuel 10 in the TNTIK

1 Samuel 10 in the TNTIL

1 Samuel 10 in the TNTIN

1 Samuel 10 in the TNTIP

1 Samuel 10 in the TNTIZ

1 Samuel 10 in the TOMA

1 Samuel 10 in the TTENT

1 Samuel 10 in the UBG

1 Samuel 10 in the UGV

1 Samuel 10 in the UGV2

1 Samuel 10 in the UGV3

1 Samuel 10 in the VBL

1 Samuel 10 in the VDCC

1 Samuel 10 in the YALU

1 Samuel 10 in the YAPE

1 Samuel 10 in the YBVTP

1 Samuel 10 in the ZBP