1 Samuel 18 (BOICB)

1 Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu, ịhụnanya dị ukwuu malitere nʼetiti Jonatan na Devid. Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. 2 Sọl mere ka Devid nọgide nʼụlọeze. O kwekwaghị ka ọ laghachi nʼụlọ nna ya. 3 Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. 4 Jonatan yipụtara uwe o yi nʼahụ nye ya Devid, nyekwa ya uwe ime ahụ ya, na ọ bụladị mma agha ya, ma ụta ya na eriri ukwu ya. 5 Devid jeziri ozi niile Sọl ziri ya, o mere ihe niile nke ọma nke a mere na Sọl nyere ya ọkwa dị elu nʼetiti ndị agha ya. Ọnọdụ a dị mma nʼanya ndị Izrel nakwa nʼanya ndị agha Sọl. 6 Mgbe ndị agha ahụ na-alọghachite, mgbe Devid gbusịrị onye Filistia ahụ, ndị inyom sitere nʼobodo niile nke Izrel pụta izute eze Sọl. Ha na-abụ abụ na-ete egwu ọṅụ, nke ha ji ụbọ akwara na ihe egwu ndị ọzọ na-eti. 7 Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị,“Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị aghama Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.” 8 Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?” 9 Site nʼụbọchị ahụ gawa, Sọl malitere ile Devid anya ọjọọ. 10 Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka. 11 Ọ tụrụ ùbe ahụ, kwuo nʼobi ya sị, “Aga m atụgide Devid nʼaja ụlọ ahụ.” Ma Devid wezugara onwe ya, ugboro abụọ ndị a. 12 Sọl na-atụ Devid egwu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ahapụla Sọl, ma nọnyere Devid. 13 Emesịa, Sọl mere ihe ga-eme ka ọ ghara ịhụkwa Devid anya ọzọ. O mere Devid ka ọ bụrụ onye na-elekọta puku ndị agha, ndị ọ na-edu na-aga ibu agha. 14 Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma, nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-anọnyere ya. 15 Mgbe Sọl hụrụ na ọ bụ onye nwere uche nke ọma, ọ tụrụ ya ụjọ. 16 Ma Izrel na Juda niile hụrụ Devid nʼanya, nʼihi na ọ na-edu ha nʼagha. 17 Sọl gwara Devid okwu sị ya, “Lee ada m nwanyị Merab. Aga m akpọnye gị ya, ka ị lụọ ya. Naanị jeere m ozi, lụọkwa agha ONYENWE ANYỊ.” Nʼihi na Sọl kwuru nʼime obi ya sị, “Agaghị m ewelite aka m megide ya. Ka ndị Filistia mee nke ahụ.” 18 Ma Devid sịrị Sọl, “Onyekwanụ ka m bụ, gịnịkwa bụ ezinaụlọ m maọbụ agbụrụ m nʼIzrel, nke m ga-eji bụrụ ọgọ nwoke eze?” 19 O ruo, na mgbe a ga-eduru Merab, ada Sọl dunye Devid, akpọrọ ya nye Adriel, onye Mehola ka ọ lụọ. 20 Nʼoge a, a chọpụtara na Mikal, ada Sọl hụrụ Devid nʼanya, mgbe e mere ka Sọl mata nke a, obi tọrọ ya ụtọ. 21 O kwuru nʼobi ya sị, “Aga m akpọnye ya nwa m nwanyị, ka ọ bụrụ ihe ịma nʼọnya nye ya, ka aka ndị Filistia si otu a megide ya.” Ya mere, Sọl gwara Devid sị ya, “Ugbu a i nwekwara ohere ọzọ ịghọ ọgọ m nwoke.” 22 Sọl nyere ndị ohu ya iwu sị, “Gwanụ Devid okwu na nzuzo sị ya, ‘Lee, ihe banyere gị masịrị eze, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị nʼanya. Ugbu a, kwerenụ ịbụ ọgọ ya.’ ” 23 Ha gwara Devid okwu ndị a niile. Ma Devid zara sị, “Ọ bụ ihe nta ịbụ ọgọ eze? Mụ onwe m bụ onye ogbenye, onye a na-amaghị ama.” 24 Mgbe ndị ohu Sọl gwara Sọl ihe Devid kwuru, 25 ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ. 26 Mgbe ndị ohu eze gwara Devid ihe eze kwuru, ọ tọrọ ya ụtọ, nʼihi ya, o kwenyere ịbụ ọgọ eze. Tupu oge ahụ a kara aka eruo, 27 Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya. 28 Mgbe Sọl hụrụ na ONYENWE ANYỊ na-anọnyere Devid, hụkwa na Mikal nwa ya nwanyị hụrụ Devid nʼanya, 29 ọ tụrụ Devid ụjọ karịa na mbụ. Sọl kpọkwara Devid asị, gụọ ya dịka onye iro ụbọchị ndụ ya niile. 30 Ndịisi agha Filistia na-apụta ibu agha dịka ha na-eme mgbe ọbụla, ma Devid na-eme nke ọma karịa ndị ọchịagha Sọl ndị ọzọ niile. Nke a mere ka Devid ghọọ onye a mara aha ya nʼala ahụ niile.

In Other Versions

1 Samuel 18 in the ANGEFD

1 Samuel 18 in the ANTPNG2D

1 Samuel 18 in the AS21

1 Samuel 18 in the BAGH

1 Samuel 18 in the BBPNG

1 Samuel 18 in the BBT1E

1 Samuel 18 in the BDS

1 Samuel 18 in the BEV

1 Samuel 18 in the BHAD

1 Samuel 18 in the BIB

1 Samuel 18 in the BLPT

1 Samuel 18 in the BNT

1 Samuel 18 in the BNTABOOT

1 Samuel 18 in the BNTLV

1 Samuel 18 in the BOATCB

1 Samuel 18 in the BOATCB2

1 Samuel 18 in the BOBCV

1 Samuel 18 in the BOCNT

1 Samuel 18 in the BOECS

1 Samuel 18 in the BOGWICC

1 Samuel 18 in the BOHCB

1 Samuel 18 in the BOHCV

1 Samuel 18 in the BOHLNT

1 Samuel 18 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 18 in the BOILNTAP

1 Samuel 18 in the BOITCV

1 Samuel 18 in the BOKCV

1 Samuel 18 in the BOKCV2

1 Samuel 18 in the BOKHWOG

1 Samuel 18 in the BOKSSV

1 Samuel 18 in the BOLCB

1 Samuel 18 in the BOLCB2

1 Samuel 18 in the BOMCV

1 Samuel 18 in the BONAV

1 Samuel 18 in the BONCB

1 Samuel 18 in the BONLT

1 Samuel 18 in the BONUT2

1 Samuel 18 in the BOPLNT

1 Samuel 18 in the BOSCB

1 Samuel 18 in the BOSNC

1 Samuel 18 in the BOTLNT

1 Samuel 18 in the BOVCB

1 Samuel 18 in the BOYCB

1 Samuel 18 in the BPBB

1 Samuel 18 in the BPH

1 Samuel 18 in the BSB

1 Samuel 18 in the CCB

1 Samuel 18 in the CUV

1 Samuel 18 in the CUVS

1 Samuel 18 in the DBT

1 Samuel 18 in the DGDNT

1 Samuel 18 in the DHNT

1 Samuel 18 in the DNT

1 Samuel 18 in the ELBE

1 Samuel 18 in the EMTV

1 Samuel 18 in the ESV

1 Samuel 18 in the FBV

1 Samuel 18 in the FEB

1 Samuel 18 in the GGMNT

1 Samuel 18 in the GNT

1 Samuel 18 in the HARY

1 Samuel 18 in the HNT

1 Samuel 18 in the IRVA

1 Samuel 18 in the IRVB

1 Samuel 18 in the IRVG

1 Samuel 18 in the IRVH

1 Samuel 18 in the IRVK

1 Samuel 18 in the IRVM

1 Samuel 18 in the IRVM2

1 Samuel 18 in the IRVO

1 Samuel 18 in the IRVP

1 Samuel 18 in the IRVT

1 Samuel 18 in the IRVT2

1 Samuel 18 in the IRVU

1 Samuel 18 in the ISVN

1 Samuel 18 in the JSNT

1 Samuel 18 in the KAPI

1 Samuel 18 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 18 in the KBV

1 Samuel 18 in the KJV

1 Samuel 18 in the KNFD

1 Samuel 18 in the LBA

1 Samuel 18 in the LBLA

1 Samuel 18 in the LNT

1 Samuel 18 in the LSV

1 Samuel 18 in the MAAL

1 Samuel 18 in the MBV

1 Samuel 18 in the MBV2

1 Samuel 18 in the MHNT

1 Samuel 18 in the MKNFD

1 Samuel 18 in the MNG

1 Samuel 18 in the MNT

1 Samuel 18 in the MNT2

1 Samuel 18 in the MRS1T

1 Samuel 18 in the NAA

1 Samuel 18 in the NASB

1 Samuel 18 in the NBLA

1 Samuel 18 in the NBS

1 Samuel 18 in the NBVTP

1 Samuel 18 in the NET2

1 Samuel 18 in the NIV11

1 Samuel 18 in the NNT

1 Samuel 18 in the NNT2

1 Samuel 18 in the NNT3

1 Samuel 18 in the PDDPT

1 Samuel 18 in the PFNT

1 Samuel 18 in the RMNT

1 Samuel 18 in the SBIAS

1 Samuel 18 in the SBIBS

1 Samuel 18 in the SBIBS2

1 Samuel 18 in the SBICS

1 Samuel 18 in the SBIDS

1 Samuel 18 in the SBIGS

1 Samuel 18 in the SBIHS

1 Samuel 18 in the SBIIS

1 Samuel 18 in the SBIIS2

1 Samuel 18 in the SBIIS3

1 Samuel 18 in the SBIKS

1 Samuel 18 in the SBIKS2

1 Samuel 18 in the SBIMS

1 Samuel 18 in the SBIOS

1 Samuel 18 in the SBIPS

1 Samuel 18 in the SBISS

1 Samuel 18 in the SBITS

1 Samuel 18 in the SBITS2

1 Samuel 18 in the SBITS3

1 Samuel 18 in the SBITS4

1 Samuel 18 in the SBIUS

1 Samuel 18 in the SBIVS

1 Samuel 18 in the SBT

1 Samuel 18 in the SBT1E

1 Samuel 18 in the SCHL

1 Samuel 18 in the SNT

1 Samuel 18 in the SUSU

1 Samuel 18 in the SUSU2

1 Samuel 18 in the SYNO

1 Samuel 18 in the TBIAOTANT

1 Samuel 18 in the TBT1E

1 Samuel 18 in the TBT1E2

1 Samuel 18 in the TFTIP

1 Samuel 18 in the TFTU

1 Samuel 18 in the TGNTATF3T

1 Samuel 18 in the THAI

1 Samuel 18 in the TNFD

1 Samuel 18 in the TNT

1 Samuel 18 in the TNTIK

1 Samuel 18 in the TNTIL

1 Samuel 18 in the TNTIN

1 Samuel 18 in the TNTIP

1 Samuel 18 in the TNTIZ

1 Samuel 18 in the TOMA

1 Samuel 18 in the TTENT

1 Samuel 18 in the UBG

1 Samuel 18 in the UGV

1 Samuel 18 in the UGV2

1 Samuel 18 in the UGV3

1 Samuel 18 in the VBL

1 Samuel 18 in the VDCC

1 Samuel 18 in the YALU

1 Samuel 18 in the YAPE

1 Samuel 18 in the YBVTP

1 Samuel 18 in the ZBP