1 Samuel 26 (BOICB)

1 Ndị Zif jekwuru Sọl na Gibea gwa ya na Devid na-ezo onwe ya nʼugwu Hakila nke chere ihu nʼọzara. 2 Nʼihi ya, Sọl biliri chịrị puku ndị agha atọ o leziri anya họpụta nʼetiti ndị agha Izrel, duru ha gaa nʼọzara Zif ịchọ Devid. 3 Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara, 4 Devid zipụrụ ndị nledo, matakwa na Sọl bịara nʼezie. 5 Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya. 6 Devid sịrị Ahimelek onye Het, na Abishai, nwa Zeruaya onye bụ nwanne Joab, “Onye ga-eso m gaa nʼogige ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọ ikwu ha?”Abishai zara sị, “Aga m eso gị gaa.” 7 Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra. 8 Abishai sịrị Devid, “Nʼezie, Chineke enyefeela gị onye iro gị nʼaka taa. Ugbu a, kwere ka m gaa were ùbe magide ya nʼala otu ugboro; agaghị m atụ ya ugboro abụọ.” 9 Ma Devid sịrị Abishai, “Mba egbula ya. Onye ga-eseti aka ya megide onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ, ghara ị bụ onye ikpe na-amaghị?” 10 Ọ sịrị, “Nʼezie dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, ọ bụ ONYENWE ANYỊ ya onwe ya ga-etida ya, maọbụ oge ya ga-eru mgbe ọ ga-anwụ, ma ọ bụkwanụ ọ gaa agha, ọ nwụfuo. 11 Ma ONYENWE ANYỊ ekwela ka m setịpụ aka megide onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ. Ugbu a, weta ùbe na ihe ịṅụ mmiri nke dị nʼakụkụ isi ya, ka anyị si nʼebe a pụọ.” 12 Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na ONYENWE ANYỊ mere ka ha daba nʼoke ụra. 13 Mgbe ahụ, Devid pụrụ gafee nʼofe nke ọzọ, guzo onwe ya nʼelu ugwu ebe dị anya, ebe mbara dị nʼetiti ya na ha. 14 Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!”Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?” 15 Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze. 16 Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?” 17 Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ olu Devid, ọ sịrị, “Ọ bụ gị nwa m, Devid?”Devid zara sị ya, “E, ọ bụ olu m, onyenwe m, eze.” 18 Ọ sịkwa, “Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achụgharị ohu ya? Gịnị ka m mere? Gịnịkwa bụ ihe ọjọọ ị chọtara nʼaka m? 19 Ugbu a ka onyenwe m eze gee ntị nʼokwu ohu ya: Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ kpaliri gị imegide m, mgbe ahụ arịrịọ m bụ ka ONYENWE ANYỊ nara onyinye ịnata ihuọma. Otu ọ dị, a si na ọ bụ ndị mmadụ na-akpali gị imegide m, ka ndị dị otu a bụrụ ndị a bụrụ ọnụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Nʼihi na ha esitela nʼoke m nwere nʼihe nketa ONYENWE ANYỊ chụpụ m, sị m, ‘Gaa fee chi ndị ọzọ ofufe.’ 20 Ugbu a, ekwela ka ọbara m bụrụ ihe a wufuru nʼala dị anya, na-abụghị nʼihu ONYENWE ANYỊ. Eze Izrel apụtala ịchọ akpị dịka m, otu dinta si achọgharị ọkwa nʼelu ugwu.” 21 Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.” 22 Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya. 23 ONYENWE ANYỊ na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. ONYENWE ANYỊ nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ. 24 Ugbu a, ka ONYENWE ANYỊ zọpụta ndụ m, ọ bụladị dịka m sị zọpụta ndụ nke gị taa. Ka ọ napụtakwa m site na mkpagbu m niile.” 25 Sọl sịrị Devid, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nwa m, Devid. Ị ga-eme oke ihe, bụrụkwa onye na-emeri nʼagha.”Devid sitere nʼebe ahụ pụọ. Sọl laghachikwara nʼụlọ ya.

In Other Versions

1 Samuel 26 in the ANGEFD

1 Samuel 26 in the ANTPNG2D

1 Samuel 26 in the AS21

1 Samuel 26 in the BAGH

1 Samuel 26 in the BBPNG

1 Samuel 26 in the BBT1E

1 Samuel 26 in the BDS

1 Samuel 26 in the BEV

1 Samuel 26 in the BHAD

1 Samuel 26 in the BIB

1 Samuel 26 in the BLPT

1 Samuel 26 in the BNT

1 Samuel 26 in the BNTABOOT

1 Samuel 26 in the BNTLV

1 Samuel 26 in the BOATCB

1 Samuel 26 in the BOATCB2

1 Samuel 26 in the BOBCV

1 Samuel 26 in the BOCNT

1 Samuel 26 in the BOECS

1 Samuel 26 in the BOGWICC

1 Samuel 26 in the BOHCB

1 Samuel 26 in the BOHCV

1 Samuel 26 in the BOHLNT

1 Samuel 26 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 26 in the BOILNTAP

1 Samuel 26 in the BOITCV

1 Samuel 26 in the BOKCV

1 Samuel 26 in the BOKCV2

1 Samuel 26 in the BOKHWOG

1 Samuel 26 in the BOKSSV

1 Samuel 26 in the BOLCB

1 Samuel 26 in the BOLCB2

1 Samuel 26 in the BOMCV

1 Samuel 26 in the BONAV

1 Samuel 26 in the BONCB

1 Samuel 26 in the BONLT

1 Samuel 26 in the BONUT2

1 Samuel 26 in the BOPLNT

1 Samuel 26 in the BOSCB

1 Samuel 26 in the BOSNC

1 Samuel 26 in the BOTLNT

1 Samuel 26 in the BOVCB

1 Samuel 26 in the BOYCB

1 Samuel 26 in the BPBB

1 Samuel 26 in the BPH

1 Samuel 26 in the BSB

1 Samuel 26 in the CCB

1 Samuel 26 in the CUV

1 Samuel 26 in the CUVS

1 Samuel 26 in the DBT

1 Samuel 26 in the DGDNT

1 Samuel 26 in the DHNT

1 Samuel 26 in the DNT

1 Samuel 26 in the ELBE

1 Samuel 26 in the EMTV

1 Samuel 26 in the ESV

1 Samuel 26 in the FBV

1 Samuel 26 in the FEB

1 Samuel 26 in the GGMNT

1 Samuel 26 in the GNT

1 Samuel 26 in the HARY

1 Samuel 26 in the HNT

1 Samuel 26 in the IRVA

1 Samuel 26 in the IRVB

1 Samuel 26 in the IRVG

1 Samuel 26 in the IRVH

1 Samuel 26 in the IRVK

1 Samuel 26 in the IRVM

1 Samuel 26 in the IRVM2

1 Samuel 26 in the IRVO

1 Samuel 26 in the IRVP

1 Samuel 26 in the IRVT

1 Samuel 26 in the IRVT2

1 Samuel 26 in the IRVU

1 Samuel 26 in the ISVN

1 Samuel 26 in the JSNT

1 Samuel 26 in the KAPI

1 Samuel 26 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 26 in the KBV

1 Samuel 26 in the KJV

1 Samuel 26 in the KNFD

1 Samuel 26 in the LBA

1 Samuel 26 in the LBLA

1 Samuel 26 in the LNT

1 Samuel 26 in the LSV

1 Samuel 26 in the MAAL

1 Samuel 26 in the MBV

1 Samuel 26 in the MBV2

1 Samuel 26 in the MHNT

1 Samuel 26 in the MKNFD

1 Samuel 26 in the MNG

1 Samuel 26 in the MNT

1 Samuel 26 in the MNT2

1 Samuel 26 in the MRS1T

1 Samuel 26 in the NAA

1 Samuel 26 in the NASB

1 Samuel 26 in the NBLA

1 Samuel 26 in the NBS

1 Samuel 26 in the NBVTP

1 Samuel 26 in the NET2

1 Samuel 26 in the NIV11

1 Samuel 26 in the NNT

1 Samuel 26 in the NNT2

1 Samuel 26 in the NNT3

1 Samuel 26 in the PDDPT

1 Samuel 26 in the PFNT

1 Samuel 26 in the RMNT

1 Samuel 26 in the SBIAS

1 Samuel 26 in the SBIBS

1 Samuel 26 in the SBIBS2

1 Samuel 26 in the SBICS

1 Samuel 26 in the SBIDS

1 Samuel 26 in the SBIGS

1 Samuel 26 in the SBIHS

1 Samuel 26 in the SBIIS

1 Samuel 26 in the SBIIS2

1 Samuel 26 in the SBIIS3

1 Samuel 26 in the SBIKS

1 Samuel 26 in the SBIKS2

1 Samuel 26 in the SBIMS

1 Samuel 26 in the SBIOS

1 Samuel 26 in the SBIPS

1 Samuel 26 in the SBISS

1 Samuel 26 in the SBITS

1 Samuel 26 in the SBITS2

1 Samuel 26 in the SBITS3

1 Samuel 26 in the SBITS4

1 Samuel 26 in the SBIUS

1 Samuel 26 in the SBIVS

1 Samuel 26 in the SBT

1 Samuel 26 in the SBT1E

1 Samuel 26 in the SCHL

1 Samuel 26 in the SNT

1 Samuel 26 in the SUSU

1 Samuel 26 in the SUSU2

1 Samuel 26 in the SYNO

1 Samuel 26 in the TBIAOTANT

1 Samuel 26 in the TBT1E

1 Samuel 26 in the TBT1E2

1 Samuel 26 in the TFTIP

1 Samuel 26 in the TFTU

1 Samuel 26 in the TGNTATF3T

1 Samuel 26 in the THAI

1 Samuel 26 in the TNFD

1 Samuel 26 in the TNT

1 Samuel 26 in the TNTIK

1 Samuel 26 in the TNTIL

1 Samuel 26 in the TNTIN

1 Samuel 26 in the TNTIP

1 Samuel 26 in the TNTIZ

1 Samuel 26 in the TOMA

1 Samuel 26 in the TTENT

1 Samuel 26 in the UBG

1 Samuel 26 in the UGV

1 Samuel 26 in the UGV2

1 Samuel 26 in the UGV3

1 Samuel 26 in the VBL

1 Samuel 26 in the VDCC

1 Samuel 26 in the YALU

1 Samuel 26 in the YAPE

1 Samuel 26 in the YBVTP

1 Samuel 26 in the ZBP