1 Samuel 28 (BOICB)

1 Nʼoge ahụ, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha jikere ịlụso ndị Izrel agha. Akish eze Gat gwara Devid okwu, “Ghọtakwa na gị na ndị agha gị ga-eso mụ na ndị agha m gaa ibu agha.” 2 Devid zara ya sị, “Ị ga-eji anya gị hụrụ ihe ohu gị ga-eme.”Akish zara sị, “Ọ dị mma aga m eme gị onye nche m ụbọchị ndụ gị niile.” 3 Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ. 4 Ndị Filistia zukọtara, bịa maa ụlọ ikwu ha na Shunem, ebe Sọl na ndị Izrel niile zukọtakwara maa ụlọ ikwu ha na Gilboa. 5 Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya. 6 Ọ jụrụ ONYENWE ANYỊ ase, ma ONYENWE ANYỊ azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma. 7 Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.”Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.” 8 Ya mere, Sọl nwogharịrị onwe ya, yiri uwe ọzọ, o ruo nʼabalị, ya na ndị ikom abụọ gakwuru nwanyị ahụ. Ọ sịrị, “Jụtara m mmụọ ase, kpọlitekwara m onye m ga-akpọ aha ya.” 9 Ma nwanyị ahụ sịrị ya, “Nʼezie gị onwe gị maara ihe Sọl mere. Ọ kwụsịla ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, na ndị dibịa afa site nʼala a. Nʼihi gịnị ka iji a gbara ndụ m ọnya, ime ka m nwụọ?” 10 Ma Sọl jiri ONYENWE ANYỊ ṅụọra ya iyi, “Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.” 11 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?”Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.” 12 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!” 13 Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?”Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.” 14 Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?”Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.”Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala. 15 Samuel sịrị Sọl, “Gịnị mere i ji esogbu m, site na ịkpọlite m?”Sọl zara, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ndị Filistia na-ebuso m agha, ma Chineke esitekwala nʼebe m nọ wezuga onwe ya. Ọ naghị azakwa m ọzọ, maọbụ site na ndị amụma, maọbụ site na nrọ. Nʼihi ya ka m ji kpọọ gị, ịjụ gị ihe m ga-eme.” 16 Samuel sịrị, “Nʼihi gịnị ka i ji na-ajụ m, ebe ọ bụ na ONYENWE ANYỊ ewezugala onwe ya site nʼebe ị nọ, ghọọkwara gị onye iro? 17 ONYENWE ANYỊ emeela ihe ọ sị na ọ ga-eme. Ọ napụla gị alaeze gị were ya nye Devid. 18 Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ ONYENWE ANYỊ, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek. 19 ONYENWE ANYỊ ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. ONYENWE ANYỊ ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.” 20 Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile. 21 Mgbe nwanyị a hụrụ ọnọdụ Sọl, ọ gwara ya okwu sị ya, “Onyenwe m, lee, ohu gị rubere isi mee ihe ị sị m mee. Ọ bụkwa ndụ m ka m ji chụọ aja imezu ihe ị rịọrọ m. 22 Ugbu a, biko, gee ntị nʼihe ohu gị na-aga ịgwa gị. Kwere ka m nye gị nri ka i rie, ka i nweta ike ị ga-eji laghachi.” 23 Ma Sọl jụrụ iri nri ọbụla.Ma ndị ikom ya na ha so malitere ịrịọ ya tutu ruo mgbe o kwenyere bilie, nọdụ ala nʼelu ihe ndina. 24 Nwanyị ahụ mere ngwangwa gbuo nwa ehi gbara abụba o nwere nʼụlọ ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha nke etinyeghị ihe na-eko achịcha nʼime ya, 25 O doziri nri nʼihu Sọl na ndị ikom ya. Ha rikwara ya. Ha biliri laa nʼabalị ahụ.

In Other Versions

1 Samuel 28 in the ANGEFD

1 Samuel 28 in the ANTPNG2D

1 Samuel 28 in the AS21

1 Samuel 28 in the BAGH

1 Samuel 28 in the BBPNG

1 Samuel 28 in the BBT1E

1 Samuel 28 in the BDS

1 Samuel 28 in the BEV

1 Samuel 28 in the BHAD

1 Samuel 28 in the BIB

1 Samuel 28 in the BLPT

1 Samuel 28 in the BNT

1 Samuel 28 in the BNTABOOT

1 Samuel 28 in the BNTLV

1 Samuel 28 in the BOATCB

1 Samuel 28 in the BOATCB2

1 Samuel 28 in the BOBCV

1 Samuel 28 in the BOCNT

1 Samuel 28 in the BOECS

1 Samuel 28 in the BOGWICC

1 Samuel 28 in the BOHCB

1 Samuel 28 in the BOHCV

1 Samuel 28 in the BOHLNT

1 Samuel 28 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 28 in the BOILNTAP

1 Samuel 28 in the BOITCV

1 Samuel 28 in the BOKCV

1 Samuel 28 in the BOKCV2

1 Samuel 28 in the BOKHWOG

1 Samuel 28 in the BOKSSV

1 Samuel 28 in the BOLCB

1 Samuel 28 in the BOLCB2

1 Samuel 28 in the BOMCV

1 Samuel 28 in the BONAV

1 Samuel 28 in the BONCB

1 Samuel 28 in the BONLT

1 Samuel 28 in the BONUT2

1 Samuel 28 in the BOPLNT

1 Samuel 28 in the BOSCB

1 Samuel 28 in the BOSNC

1 Samuel 28 in the BOTLNT

1 Samuel 28 in the BOVCB

1 Samuel 28 in the BOYCB

1 Samuel 28 in the BPBB

1 Samuel 28 in the BPH

1 Samuel 28 in the BSB

1 Samuel 28 in the CCB

1 Samuel 28 in the CUV

1 Samuel 28 in the CUVS

1 Samuel 28 in the DBT

1 Samuel 28 in the DGDNT

1 Samuel 28 in the DHNT

1 Samuel 28 in the DNT

1 Samuel 28 in the ELBE

1 Samuel 28 in the EMTV

1 Samuel 28 in the ESV

1 Samuel 28 in the FBV

1 Samuel 28 in the FEB

1 Samuel 28 in the GGMNT

1 Samuel 28 in the GNT

1 Samuel 28 in the HARY

1 Samuel 28 in the HNT

1 Samuel 28 in the IRVA

1 Samuel 28 in the IRVB

1 Samuel 28 in the IRVG

1 Samuel 28 in the IRVH

1 Samuel 28 in the IRVK

1 Samuel 28 in the IRVM

1 Samuel 28 in the IRVM2

1 Samuel 28 in the IRVO

1 Samuel 28 in the IRVP

1 Samuel 28 in the IRVT

1 Samuel 28 in the IRVT2

1 Samuel 28 in the IRVU

1 Samuel 28 in the ISVN

1 Samuel 28 in the JSNT

1 Samuel 28 in the KAPI

1 Samuel 28 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 28 in the KBV

1 Samuel 28 in the KJV

1 Samuel 28 in the KNFD

1 Samuel 28 in the LBA

1 Samuel 28 in the LBLA

1 Samuel 28 in the LNT

1 Samuel 28 in the LSV

1 Samuel 28 in the MAAL

1 Samuel 28 in the MBV

1 Samuel 28 in the MBV2

1 Samuel 28 in the MHNT

1 Samuel 28 in the MKNFD

1 Samuel 28 in the MNG

1 Samuel 28 in the MNT

1 Samuel 28 in the MNT2

1 Samuel 28 in the MRS1T

1 Samuel 28 in the NAA

1 Samuel 28 in the NASB

1 Samuel 28 in the NBLA

1 Samuel 28 in the NBS

1 Samuel 28 in the NBVTP

1 Samuel 28 in the NET2

1 Samuel 28 in the NIV11

1 Samuel 28 in the NNT

1 Samuel 28 in the NNT2

1 Samuel 28 in the NNT3

1 Samuel 28 in the PDDPT

1 Samuel 28 in the PFNT

1 Samuel 28 in the RMNT

1 Samuel 28 in the SBIAS

1 Samuel 28 in the SBIBS

1 Samuel 28 in the SBIBS2

1 Samuel 28 in the SBICS

1 Samuel 28 in the SBIDS

1 Samuel 28 in the SBIGS

1 Samuel 28 in the SBIHS

1 Samuel 28 in the SBIIS

1 Samuel 28 in the SBIIS2

1 Samuel 28 in the SBIIS3

1 Samuel 28 in the SBIKS

1 Samuel 28 in the SBIKS2

1 Samuel 28 in the SBIMS

1 Samuel 28 in the SBIOS

1 Samuel 28 in the SBIPS

1 Samuel 28 in the SBISS

1 Samuel 28 in the SBITS

1 Samuel 28 in the SBITS2

1 Samuel 28 in the SBITS3

1 Samuel 28 in the SBITS4

1 Samuel 28 in the SBIUS

1 Samuel 28 in the SBIVS

1 Samuel 28 in the SBT

1 Samuel 28 in the SBT1E

1 Samuel 28 in the SCHL

1 Samuel 28 in the SNT

1 Samuel 28 in the SUSU

1 Samuel 28 in the SUSU2

1 Samuel 28 in the SYNO

1 Samuel 28 in the TBIAOTANT

1 Samuel 28 in the TBT1E

1 Samuel 28 in the TBT1E2

1 Samuel 28 in the TFTIP

1 Samuel 28 in the TFTU

1 Samuel 28 in the TGNTATF3T

1 Samuel 28 in the THAI

1 Samuel 28 in the TNFD

1 Samuel 28 in the TNT

1 Samuel 28 in the TNTIK

1 Samuel 28 in the TNTIL

1 Samuel 28 in the TNTIN

1 Samuel 28 in the TNTIP

1 Samuel 28 in the TNTIZ

1 Samuel 28 in the TOMA

1 Samuel 28 in the TTENT

1 Samuel 28 in the UBG

1 Samuel 28 in the UGV

1 Samuel 28 in the UGV2

1 Samuel 28 in the UGV3

1 Samuel 28 in the VBL

1 Samuel 28 in the VDCC

1 Samuel 28 in the YALU

1 Samuel 28 in the YAPE

1 Samuel 28 in the YBVTP

1 Samuel 28 in the ZBP