2 Chronicles 26 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii. 2 Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. 3 Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem. 4 O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ. 5 Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ ONYENWE ANYỊ, Chineke nyere ya ọganihu. 6 O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia. 7 Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim. 8 Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu. 9 O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike. 10 O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu. 11 Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha. 12 Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600. 13 Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya. 14 Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ. 15 O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike. 16 Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja. 17 Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja ONYENWE ANYỊ iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ. 18 Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka ONYENWE ANYỊ Chineke gị.” 19 Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu. 20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ tiri ya ihe otiti. 21 Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ. 22 Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ. 23 Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Chronicles 26 in the ANGEFD

2 Chronicles 26 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 26 in the AS21

2 Chronicles 26 in the BAGH

2 Chronicles 26 in the BBPNG

2 Chronicles 26 in the BBT1E

2 Chronicles 26 in the BDS

2 Chronicles 26 in the BEV

2 Chronicles 26 in the BHAD

2 Chronicles 26 in the BIB

2 Chronicles 26 in the BLPT

2 Chronicles 26 in the BNT

2 Chronicles 26 in the BNTABOOT

2 Chronicles 26 in the BNTLV

2 Chronicles 26 in the BOATCB

2 Chronicles 26 in the BOATCB2

2 Chronicles 26 in the BOBCV

2 Chronicles 26 in the BOCNT

2 Chronicles 26 in the BOECS

2 Chronicles 26 in the BOGWICC

2 Chronicles 26 in the BOHCB

2 Chronicles 26 in the BOHCV

2 Chronicles 26 in the BOHLNT

2 Chronicles 26 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 26 in the BOILNTAP

2 Chronicles 26 in the BOITCV

2 Chronicles 26 in the BOKCV

2 Chronicles 26 in the BOKCV2

2 Chronicles 26 in the BOKHWOG

2 Chronicles 26 in the BOKSSV

2 Chronicles 26 in the BOLCB

2 Chronicles 26 in the BOLCB2

2 Chronicles 26 in the BOMCV

2 Chronicles 26 in the BONAV

2 Chronicles 26 in the BONCB

2 Chronicles 26 in the BONLT

2 Chronicles 26 in the BONUT2

2 Chronicles 26 in the BOPLNT

2 Chronicles 26 in the BOSCB

2 Chronicles 26 in the BOSNC

2 Chronicles 26 in the BOTLNT

2 Chronicles 26 in the BOVCB

2 Chronicles 26 in the BOYCB

2 Chronicles 26 in the BPBB

2 Chronicles 26 in the BPH

2 Chronicles 26 in the BSB

2 Chronicles 26 in the CCB

2 Chronicles 26 in the CUV

2 Chronicles 26 in the CUVS

2 Chronicles 26 in the DBT

2 Chronicles 26 in the DGDNT

2 Chronicles 26 in the DHNT

2 Chronicles 26 in the DNT

2 Chronicles 26 in the ELBE

2 Chronicles 26 in the EMTV

2 Chronicles 26 in the ESV

2 Chronicles 26 in the FBV

2 Chronicles 26 in the FEB

2 Chronicles 26 in the GGMNT

2 Chronicles 26 in the GNT

2 Chronicles 26 in the HARY

2 Chronicles 26 in the HNT

2 Chronicles 26 in the IRVA

2 Chronicles 26 in the IRVB

2 Chronicles 26 in the IRVG

2 Chronicles 26 in the IRVH

2 Chronicles 26 in the IRVK

2 Chronicles 26 in the IRVM

2 Chronicles 26 in the IRVM2

2 Chronicles 26 in the IRVO

2 Chronicles 26 in the IRVP

2 Chronicles 26 in the IRVT

2 Chronicles 26 in the IRVT2

2 Chronicles 26 in the IRVU

2 Chronicles 26 in the ISVN

2 Chronicles 26 in the JSNT

2 Chronicles 26 in the KAPI

2 Chronicles 26 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 26 in the KBV

2 Chronicles 26 in the KJV

2 Chronicles 26 in the KNFD

2 Chronicles 26 in the LBA

2 Chronicles 26 in the LBLA

2 Chronicles 26 in the LNT

2 Chronicles 26 in the LSV

2 Chronicles 26 in the MAAL

2 Chronicles 26 in the MBV

2 Chronicles 26 in the MBV2

2 Chronicles 26 in the MHNT

2 Chronicles 26 in the MKNFD

2 Chronicles 26 in the MNG

2 Chronicles 26 in the MNT

2 Chronicles 26 in the MNT2

2 Chronicles 26 in the MRS1T

2 Chronicles 26 in the NAA

2 Chronicles 26 in the NASB

2 Chronicles 26 in the NBLA

2 Chronicles 26 in the NBS

2 Chronicles 26 in the NBVTP

2 Chronicles 26 in the NET2

2 Chronicles 26 in the NIV11

2 Chronicles 26 in the NNT

2 Chronicles 26 in the NNT2

2 Chronicles 26 in the NNT3

2 Chronicles 26 in the PDDPT

2 Chronicles 26 in the PFNT

2 Chronicles 26 in the RMNT

2 Chronicles 26 in the SBIAS

2 Chronicles 26 in the SBIBS

2 Chronicles 26 in the SBIBS2

2 Chronicles 26 in the SBICS

2 Chronicles 26 in the SBIDS

2 Chronicles 26 in the SBIGS

2 Chronicles 26 in the SBIHS

2 Chronicles 26 in the SBIIS

2 Chronicles 26 in the SBIIS2

2 Chronicles 26 in the SBIIS3

2 Chronicles 26 in the SBIKS

2 Chronicles 26 in the SBIKS2

2 Chronicles 26 in the SBIMS

2 Chronicles 26 in the SBIOS

2 Chronicles 26 in the SBIPS

2 Chronicles 26 in the SBISS

2 Chronicles 26 in the SBITS

2 Chronicles 26 in the SBITS2

2 Chronicles 26 in the SBITS3

2 Chronicles 26 in the SBITS4

2 Chronicles 26 in the SBIUS

2 Chronicles 26 in the SBIVS

2 Chronicles 26 in the SBT

2 Chronicles 26 in the SBT1E

2 Chronicles 26 in the SCHL

2 Chronicles 26 in the SNT

2 Chronicles 26 in the SUSU

2 Chronicles 26 in the SUSU2

2 Chronicles 26 in the SYNO

2 Chronicles 26 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 26 in the TBT1E

2 Chronicles 26 in the TBT1E2

2 Chronicles 26 in the TFTIP

2 Chronicles 26 in the TFTU

2 Chronicles 26 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 26 in the THAI

2 Chronicles 26 in the TNFD

2 Chronicles 26 in the TNT

2 Chronicles 26 in the TNTIK

2 Chronicles 26 in the TNTIL

2 Chronicles 26 in the TNTIN

2 Chronicles 26 in the TNTIP

2 Chronicles 26 in the TNTIZ

2 Chronicles 26 in the TOMA

2 Chronicles 26 in the TTENT

2 Chronicles 26 in the UBG

2 Chronicles 26 in the UGV

2 Chronicles 26 in the UGV2

2 Chronicles 26 in the UGV3

2 Chronicles 26 in the VBL

2 Chronicles 26 in the VDCC

2 Chronicles 26 in the YALU

2 Chronicles 26 in the YAPE

2 Chronicles 26 in the YBVTP

2 Chronicles 26 in the ZBP