2 Chronicles 31 (BOICB)

1 Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere. 2 Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito ONYENWE ANYỊ nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya. 3 Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu ONYENWE ANYỊ. 4 O nyekwara ndị bi na Jerusalem iwu ka ha na-ewebatara ndị nchụaja na ndị Livayị oke nke ruuru ha, ka ha nwee ike lebanye anya nke ọma nʼiwu ONYENWE ANYỊ. 5 Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere. 6 Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu 7 Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa. 8 Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro ONYENWE ANYỊ, gọziekwa ndị ya bụ Izrel. 9 Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara. 10 Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.” 11 Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ ahụ. Ha mekwara otu a. 12 Emesịa, ha jiri ikwesi ntụkwasị obi bubata onyinye ndị ahụ, na onyinye nke otu ụzọ nʼime ụzọ iri, na onyinye e doro nsọ, tifee ha nʼaka Konanaya, onye Livayị. Shimei nwanne ya nwoke bụ onye na-esote ya. 13 Jehiel, Azazaya, Nahat, Asahel, Jerimot, Jozabad, Eliel, Ismakaya, Mahat na Benaya, bụ ndị nlekọta ọrụ ndị nọ nʼokpuru Konanaya na Shimei nwanne ya. Ndị a niile bụ ndị eze Hezekaya na Azaraya onye nlekọta ụlọnsọ ukwu Chineke họpụtara. 14 Kore nwa Imna, onye Livayị, onye bụkwa onye na-elekọta ọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ, ka e tinyere ọrụ ilekọta onyinye afọ ofufu niile e wetaara Chineke. Ọ bụ ya nwekwa ọrụ ikesa onyinye ndị ahụ niile e bubataara ONYENWE ANYỊ ha na onyinye ndị ọzọ e doro nsọ. 15 Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka. 16 Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị. 17 Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị. 18 Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ. 19 A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị. 20 Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ya. 21 Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.

In Other Versions

2 Chronicles 31 in the ANGEFD

2 Chronicles 31 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 31 in the AS21

2 Chronicles 31 in the BAGH

2 Chronicles 31 in the BBPNG

2 Chronicles 31 in the BBT1E

2 Chronicles 31 in the BDS

2 Chronicles 31 in the BEV

2 Chronicles 31 in the BHAD

2 Chronicles 31 in the BIB

2 Chronicles 31 in the BLPT

2 Chronicles 31 in the BNT

2 Chronicles 31 in the BNTABOOT

2 Chronicles 31 in the BNTLV

2 Chronicles 31 in the BOATCB

2 Chronicles 31 in the BOATCB2

2 Chronicles 31 in the BOBCV

2 Chronicles 31 in the BOCNT

2 Chronicles 31 in the BOECS

2 Chronicles 31 in the BOGWICC

2 Chronicles 31 in the BOHCB

2 Chronicles 31 in the BOHCV

2 Chronicles 31 in the BOHLNT

2 Chronicles 31 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 31 in the BOILNTAP

2 Chronicles 31 in the BOITCV

2 Chronicles 31 in the BOKCV

2 Chronicles 31 in the BOKCV2

2 Chronicles 31 in the BOKHWOG

2 Chronicles 31 in the BOKSSV

2 Chronicles 31 in the BOLCB

2 Chronicles 31 in the BOLCB2

2 Chronicles 31 in the BOMCV

2 Chronicles 31 in the BONAV

2 Chronicles 31 in the BONCB

2 Chronicles 31 in the BONLT

2 Chronicles 31 in the BONUT2

2 Chronicles 31 in the BOPLNT

2 Chronicles 31 in the BOSCB

2 Chronicles 31 in the BOSNC

2 Chronicles 31 in the BOTLNT

2 Chronicles 31 in the BOVCB

2 Chronicles 31 in the BOYCB

2 Chronicles 31 in the BPBB

2 Chronicles 31 in the BPH

2 Chronicles 31 in the BSB

2 Chronicles 31 in the CCB

2 Chronicles 31 in the CUV

2 Chronicles 31 in the CUVS

2 Chronicles 31 in the DBT

2 Chronicles 31 in the DGDNT

2 Chronicles 31 in the DHNT

2 Chronicles 31 in the DNT

2 Chronicles 31 in the ELBE

2 Chronicles 31 in the EMTV

2 Chronicles 31 in the ESV

2 Chronicles 31 in the FBV

2 Chronicles 31 in the FEB

2 Chronicles 31 in the GGMNT

2 Chronicles 31 in the GNT

2 Chronicles 31 in the HARY

2 Chronicles 31 in the HNT

2 Chronicles 31 in the IRVA

2 Chronicles 31 in the IRVB

2 Chronicles 31 in the IRVG

2 Chronicles 31 in the IRVH

2 Chronicles 31 in the IRVK

2 Chronicles 31 in the IRVM

2 Chronicles 31 in the IRVM2

2 Chronicles 31 in the IRVO

2 Chronicles 31 in the IRVP

2 Chronicles 31 in the IRVT

2 Chronicles 31 in the IRVT2

2 Chronicles 31 in the IRVU

2 Chronicles 31 in the ISVN

2 Chronicles 31 in the JSNT

2 Chronicles 31 in the KAPI

2 Chronicles 31 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 31 in the KBV

2 Chronicles 31 in the KJV

2 Chronicles 31 in the KNFD

2 Chronicles 31 in the LBA

2 Chronicles 31 in the LBLA

2 Chronicles 31 in the LNT

2 Chronicles 31 in the LSV

2 Chronicles 31 in the MAAL

2 Chronicles 31 in the MBV

2 Chronicles 31 in the MBV2

2 Chronicles 31 in the MHNT

2 Chronicles 31 in the MKNFD

2 Chronicles 31 in the MNG

2 Chronicles 31 in the MNT

2 Chronicles 31 in the MNT2

2 Chronicles 31 in the MRS1T

2 Chronicles 31 in the NAA

2 Chronicles 31 in the NASB

2 Chronicles 31 in the NBLA

2 Chronicles 31 in the NBS

2 Chronicles 31 in the NBVTP

2 Chronicles 31 in the NET2

2 Chronicles 31 in the NIV11

2 Chronicles 31 in the NNT

2 Chronicles 31 in the NNT2

2 Chronicles 31 in the NNT3

2 Chronicles 31 in the PDDPT

2 Chronicles 31 in the PFNT

2 Chronicles 31 in the RMNT

2 Chronicles 31 in the SBIAS

2 Chronicles 31 in the SBIBS

2 Chronicles 31 in the SBIBS2

2 Chronicles 31 in the SBICS

2 Chronicles 31 in the SBIDS

2 Chronicles 31 in the SBIGS

2 Chronicles 31 in the SBIHS

2 Chronicles 31 in the SBIIS

2 Chronicles 31 in the SBIIS2

2 Chronicles 31 in the SBIIS3

2 Chronicles 31 in the SBIKS

2 Chronicles 31 in the SBIKS2

2 Chronicles 31 in the SBIMS

2 Chronicles 31 in the SBIOS

2 Chronicles 31 in the SBIPS

2 Chronicles 31 in the SBISS

2 Chronicles 31 in the SBITS

2 Chronicles 31 in the SBITS2

2 Chronicles 31 in the SBITS3

2 Chronicles 31 in the SBITS4

2 Chronicles 31 in the SBIUS

2 Chronicles 31 in the SBIVS

2 Chronicles 31 in the SBT

2 Chronicles 31 in the SBT1E

2 Chronicles 31 in the SCHL

2 Chronicles 31 in the SNT

2 Chronicles 31 in the SUSU

2 Chronicles 31 in the SUSU2

2 Chronicles 31 in the SYNO

2 Chronicles 31 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 31 in the TBT1E

2 Chronicles 31 in the TBT1E2

2 Chronicles 31 in the TFTIP

2 Chronicles 31 in the TFTU

2 Chronicles 31 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 31 in the THAI

2 Chronicles 31 in the TNFD

2 Chronicles 31 in the TNT

2 Chronicles 31 in the TNTIK

2 Chronicles 31 in the TNTIL

2 Chronicles 31 in the TNTIN

2 Chronicles 31 in the TNTIP

2 Chronicles 31 in the TNTIZ

2 Chronicles 31 in the TOMA

2 Chronicles 31 in the TTENT

2 Chronicles 31 in the UBG

2 Chronicles 31 in the UGV

2 Chronicles 31 in the UGV2

2 Chronicles 31 in the UGV3

2 Chronicles 31 in the VBL

2 Chronicles 31 in the VDCC

2 Chronicles 31 in the YALU

2 Chronicles 31 in the YAPE

2 Chronicles 31 in the YBVTP

2 Chronicles 31 in the ZBP