2 Chronicles 36 (BOICB)

1 Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz, nwa nwoke Josaya mee ya eze na Jerusalem, nʼọnọdụ nna ya. 2 Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. 3 Eze Ijipt chụdara ya site nʼọchịchị na Jerusalem, kwagide ndị Juda ka ha tụọra ya ụtụ narị talenti ọlaọcha na otu talenti ọlaedo. 4 Eze Ijipt mere Eliakịm, otu nwanne Jehoahaz, eze ndị Juda na Jerusalem. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma Neko duuru Jehoahaz nwanne nwoke Eliakịm gaa Ijipt. 5 Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke ya. 6 Nebukadneza eze Babilọn busoro ya agha, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nʼihi i duru ya gaa Babilọn. 7 Nebukadneza bukọkwaara efere na iko ọlaedo dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, buru ha gaa buba ha nʼụlọeze ya dị na Babilọn. 8 Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim, na banyere ihe arụ niile o mere, na ihe niile a chọpụtara megide ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 9 Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị naanị ọnwa atọ na abalị iri na Jerusalem. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. 10 Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem. 11 Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. 12 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke ya, o wedaghị onwe ya ala nara ndụmọdụ Jeremaya bụ onye amụma, onye na-ekwu okwu nke ONYENWE ANYỊ. 13 Ọzọkwa, o nupuru isi megide eze Nebukadneza, onye mere ka ọ ṅụọ iyi nʼaha Chineke. Ọ ghọrọ onye isiike, onye mechiri obi ya, jụ ichigharịkwute ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel. 14 Nʼime ka ihe dị njọ karịa, mmadụ niile, tinyere ndị ndu nʼetiti ndị nchụaja, nọgidere bụrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, site nʼịgbaso omenaala rụrụ arụ nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha merụrụ ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, nke o doro nsọ nʼime Jerusalem. 15 ONYENWE ANYỊ, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị. 16 Ma ha kwara ndị amụma Chineke ndị a emo, lelịa okwu Chineke ha wetara anya, chịa amụma ha buru ọchị, tutu ruo mgbe ha kpasuru ọnụma ONYENWE ANYỊ megide ndị ya, ruo mgbe ihe ọbụla na-adịghịkwa nke pụrụ igbochi ngosipụta oke ọnụma a. 17 Ya mere, o welitara eze Kaldịa imegide ha, bụ onye ji mma agha gbuchapụ ụmụ okorobịa ha nʼụlọ ebe nsọ ha. O nweghịkwa ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa, maọbụ ụmụ agbọghọ dị, ndị okenye maọbụ ndị nrịa nrịa. Chineke weere ha niile nyefee ha nʼaka Nebukadneza. 18 O sitere nʼụlọnsọ ukwu Chineke kpokọrọ ihe niile dị nʼime ya, ma ihe ukwu ma ihe nta, tinyere akụ niile dị nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, na nʼụlọeze, na nʼụlọ ndịisi ozi eze buru ha gaa Babilọn. 19 Ha sunyere ụlọnsọ Chineke ọkụ, kwatukwa mgbidi Jerusalem. Ha sunyere ụlọeze niile ọkụ, mebikwaa ihe niile ndị bara uru dị nʼime ya. 20 Ha buuru ndị fọdụrụ, bụ ndị niile gbanarịrị mma agha, gaa Babilọn, ha ghọrọ ya, ghọkwara ụmụ ya ndị nọchiri anya ya, ndị ohu, tutu ruo mgbe ehiwere alaeze Peshịa. 21 Ala ahụ nwere ụbọchị izuike niile kwesiri ya nʼebe o zuruoke, nʼoge niile nke ịtọgbọ nʼefu ya, o zuru ike, ruo mgbe iri afọ asaa ahụ zuru, nʼimezu okwu ONYENWE ANYỊ kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma. 22 Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu ONYENWE ANYỊ nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, ONYENWE ANYỊ kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, 23 “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru:“ ‘ONYENWE ANYỊ, Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa. O nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga, ka ONYENWE ANYỊ Chineke ha nọnyekwara ha.’ ”

In Other Versions

2 Chronicles 36 in the ANGEFD

2 Chronicles 36 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 36 in the AS21

2 Chronicles 36 in the BAGH

2 Chronicles 36 in the BBPNG

2 Chronicles 36 in the BBT1E

2 Chronicles 36 in the BDS

2 Chronicles 36 in the BEV

2 Chronicles 36 in the BHAD

2 Chronicles 36 in the BIB

2 Chronicles 36 in the BLPT

2 Chronicles 36 in the BNT

2 Chronicles 36 in the BNTABOOT

2 Chronicles 36 in the BNTLV

2 Chronicles 36 in the BOATCB

2 Chronicles 36 in the BOATCB2

2 Chronicles 36 in the BOBCV

2 Chronicles 36 in the BOCNT

2 Chronicles 36 in the BOECS

2 Chronicles 36 in the BOGWICC

2 Chronicles 36 in the BOHCB

2 Chronicles 36 in the BOHCV

2 Chronicles 36 in the BOHLNT

2 Chronicles 36 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 36 in the BOILNTAP

2 Chronicles 36 in the BOITCV

2 Chronicles 36 in the BOKCV

2 Chronicles 36 in the BOKCV2

2 Chronicles 36 in the BOKHWOG

2 Chronicles 36 in the BOKSSV

2 Chronicles 36 in the BOLCB

2 Chronicles 36 in the BOLCB2

2 Chronicles 36 in the BOMCV

2 Chronicles 36 in the BONAV

2 Chronicles 36 in the BONCB

2 Chronicles 36 in the BONLT

2 Chronicles 36 in the BONUT2

2 Chronicles 36 in the BOPLNT

2 Chronicles 36 in the BOSCB

2 Chronicles 36 in the BOSNC

2 Chronicles 36 in the BOTLNT

2 Chronicles 36 in the BOVCB

2 Chronicles 36 in the BOYCB

2 Chronicles 36 in the BPBB

2 Chronicles 36 in the BPH

2 Chronicles 36 in the BSB

2 Chronicles 36 in the CCB

2 Chronicles 36 in the CUV

2 Chronicles 36 in the CUVS

2 Chronicles 36 in the DBT

2 Chronicles 36 in the DGDNT

2 Chronicles 36 in the DHNT

2 Chronicles 36 in the DNT

2 Chronicles 36 in the ELBE

2 Chronicles 36 in the EMTV

2 Chronicles 36 in the ESV

2 Chronicles 36 in the FBV

2 Chronicles 36 in the FEB

2 Chronicles 36 in the GGMNT

2 Chronicles 36 in the GNT

2 Chronicles 36 in the HARY

2 Chronicles 36 in the HNT

2 Chronicles 36 in the IRVA

2 Chronicles 36 in the IRVB

2 Chronicles 36 in the IRVG

2 Chronicles 36 in the IRVH

2 Chronicles 36 in the IRVK

2 Chronicles 36 in the IRVM

2 Chronicles 36 in the IRVM2

2 Chronicles 36 in the IRVO

2 Chronicles 36 in the IRVP

2 Chronicles 36 in the IRVT

2 Chronicles 36 in the IRVT2

2 Chronicles 36 in the IRVU

2 Chronicles 36 in the ISVN

2 Chronicles 36 in the JSNT

2 Chronicles 36 in the KAPI

2 Chronicles 36 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 36 in the KBV

2 Chronicles 36 in the KJV

2 Chronicles 36 in the KNFD

2 Chronicles 36 in the LBA

2 Chronicles 36 in the LBLA

2 Chronicles 36 in the LNT

2 Chronicles 36 in the LSV

2 Chronicles 36 in the MAAL

2 Chronicles 36 in the MBV

2 Chronicles 36 in the MBV2

2 Chronicles 36 in the MHNT

2 Chronicles 36 in the MKNFD

2 Chronicles 36 in the MNG

2 Chronicles 36 in the MNT

2 Chronicles 36 in the MNT2

2 Chronicles 36 in the MRS1T

2 Chronicles 36 in the NAA

2 Chronicles 36 in the NASB

2 Chronicles 36 in the NBLA

2 Chronicles 36 in the NBS

2 Chronicles 36 in the NBVTP

2 Chronicles 36 in the NET2

2 Chronicles 36 in the NIV11

2 Chronicles 36 in the NNT

2 Chronicles 36 in the NNT2

2 Chronicles 36 in the NNT3

2 Chronicles 36 in the PDDPT

2 Chronicles 36 in the PFNT

2 Chronicles 36 in the RMNT

2 Chronicles 36 in the SBIAS

2 Chronicles 36 in the SBIBS

2 Chronicles 36 in the SBIBS2

2 Chronicles 36 in the SBICS

2 Chronicles 36 in the SBIDS

2 Chronicles 36 in the SBIGS

2 Chronicles 36 in the SBIHS

2 Chronicles 36 in the SBIIS

2 Chronicles 36 in the SBIIS2

2 Chronicles 36 in the SBIIS3

2 Chronicles 36 in the SBIKS

2 Chronicles 36 in the SBIKS2

2 Chronicles 36 in the SBIMS

2 Chronicles 36 in the SBIOS

2 Chronicles 36 in the SBIPS

2 Chronicles 36 in the SBISS

2 Chronicles 36 in the SBITS

2 Chronicles 36 in the SBITS2

2 Chronicles 36 in the SBITS3

2 Chronicles 36 in the SBITS4

2 Chronicles 36 in the SBIUS

2 Chronicles 36 in the SBIVS

2 Chronicles 36 in the SBT

2 Chronicles 36 in the SBT1E

2 Chronicles 36 in the SCHL

2 Chronicles 36 in the SNT

2 Chronicles 36 in the SUSU

2 Chronicles 36 in the SUSU2

2 Chronicles 36 in the SYNO

2 Chronicles 36 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 36 in the TBT1E

2 Chronicles 36 in the TBT1E2

2 Chronicles 36 in the TFTIP

2 Chronicles 36 in the TFTU

2 Chronicles 36 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 36 in the THAI

2 Chronicles 36 in the TNFD

2 Chronicles 36 in the TNT

2 Chronicles 36 in the TNTIK

2 Chronicles 36 in the TNTIL

2 Chronicles 36 in the TNTIN

2 Chronicles 36 in the TNTIP

2 Chronicles 36 in the TNTIZ

2 Chronicles 36 in the TOMA

2 Chronicles 36 in the TTENT

2 Chronicles 36 in the UBG

2 Chronicles 36 in the UGV

2 Chronicles 36 in the UGV2

2 Chronicles 36 in the UGV3

2 Chronicles 36 in the VBL

2 Chronicles 36 in the VDCC

2 Chronicles 36 in the YALU

2 Chronicles 36 in the YAPE

2 Chronicles 36 in the YBVTP

2 Chronicles 36 in the ZBP