2 Corinthians 3 (BOICB)

1 Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme? 2 Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa. 3 Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ. 4 Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ. 5 Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke. 6 Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ. 7 Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga, 8 ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa? 9 Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya. 10 Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya. 11 Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya. 12 Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla. 13 Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe. 14 Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ. 15 Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha. 16 Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ. 17 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya. 18 Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.

In Other Versions

2 Corinthians 3 in the ANGEFD

2 Corinthians 3 in the ANTPNG2D

2 Corinthians 3 in the AS21

2 Corinthians 3 in the BAGH

2 Corinthians 3 in the BBPNG

2 Corinthians 3 in the BBT1E

2 Corinthians 3 in the BDS

2 Corinthians 3 in the BEV

2 Corinthians 3 in the BHAD

2 Corinthians 3 in the BIB

2 Corinthians 3 in the BLPT

2 Corinthians 3 in the BNT

2 Corinthians 3 in the BNTABOOT

2 Corinthians 3 in the BNTLV

2 Corinthians 3 in the BOATCB

2 Corinthians 3 in the BOATCB2

2 Corinthians 3 in the BOBCV

2 Corinthians 3 in the BOCNT

2 Corinthians 3 in the BOECS

2 Corinthians 3 in the BOGWICC

2 Corinthians 3 in the BOHCB

2 Corinthians 3 in the BOHCV

2 Corinthians 3 in the BOHLNT

2 Corinthians 3 in the BOHNTLTAL

2 Corinthians 3 in the BOILNTAP

2 Corinthians 3 in the BOITCV

2 Corinthians 3 in the BOKCV

2 Corinthians 3 in the BOKCV2

2 Corinthians 3 in the BOKHWOG

2 Corinthians 3 in the BOKSSV

2 Corinthians 3 in the BOLCB

2 Corinthians 3 in the BOLCB2

2 Corinthians 3 in the BOMCV

2 Corinthians 3 in the BONAV

2 Corinthians 3 in the BONCB

2 Corinthians 3 in the BONLT

2 Corinthians 3 in the BONUT2

2 Corinthians 3 in the BOPLNT

2 Corinthians 3 in the BOSCB

2 Corinthians 3 in the BOSNC

2 Corinthians 3 in the BOTLNT

2 Corinthians 3 in the BOVCB

2 Corinthians 3 in the BOYCB

2 Corinthians 3 in the BPBB

2 Corinthians 3 in the BPH

2 Corinthians 3 in the BSB

2 Corinthians 3 in the CCB

2 Corinthians 3 in the CUV

2 Corinthians 3 in the CUVS

2 Corinthians 3 in the DBT

2 Corinthians 3 in the DGDNT

2 Corinthians 3 in the DHNT

2 Corinthians 3 in the DNT

2 Corinthians 3 in the ELBE

2 Corinthians 3 in the EMTV

2 Corinthians 3 in the ESV

2 Corinthians 3 in the FBV

2 Corinthians 3 in the FEB

2 Corinthians 3 in the GGMNT

2 Corinthians 3 in the GNT

2 Corinthians 3 in the HARY

2 Corinthians 3 in the HNT

2 Corinthians 3 in the IRVA

2 Corinthians 3 in the IRVB

2 Corinthians 3 in the IRVG

2 Corinthians 3 in the IRVH

2 Corinthians 3 in the IRVK

2 Corinthians 3 in the IRVM

2 Corinthians 3 in the IRVM2

2 Corinthians 3 in the IRVO

2 Corinthians 3 in the IRVP

2 Corinthians 3 in the IRVT

2 Corinthians 3 in the IRVT2

2 Corinthians 3 in the IRVU

2 Corinthians 3 in the ISVN

2 Corinthians 3 in the JSNT

2 Corinthians 3 in the KAPI

2 Corinthians 3 in the KBT1ETNIK

2 Corinthians 3 in the KBV

2 Corinthians 3 in the KJV

2 Corinthians 3 in the KNFD

2 Corinthians 3 in the LBA

2 Corinthians 3 in the LBLA

2 Corinthians 3 in the LNT

2 Corinthians 3 in the LSV

2 Corinthians 3 in the MAAL

2 Corinthians 3 in the MBV

2 Corinthians 3 in the MBV2

2 Corinthians 3 in the MHNT

2 Corinthians 3 in the MKNFD

2 Corinthians 3 in the MNG

2 Corinthians 3 in the MNT

2 Corinthians 3 in the MNT2

2 Corinthians 3 in the MRS1T

2 Corinthians 3 in the NAA

2 Corinthians 3 in the NASB

2 Corinthians 3 in the NBLA

2 Corinthians 3 in the NBS

2 Corinthians 3 in the NBVTP

2 Corinthians 3 in the NET2

2 Corinthians 3 in the NIV11

2 Corinthians 3 in the NNT

2 Corinthians 3 in the NNT2

2 Corinthians 3 in the NNT3

2 Corinthians 3 in the PDDPT

2 Corinthians 3 in the PFNT

2 Corinthians 3 in the RMNT

2 Corinthians 3 in the SBIAS

2 Corinthians 3 in the SBIBS

2 Corinthians 3 in the SBIBS2

2 Corinthians 3 in the SBICS

2 Corinthians 3 in the SBIDS

2 Corinthians 3 in the SBIGS

2 Corinthians 3 in the SBIHS

2 Corinthians 3 in the SBIIS

2 Corinthians 3 in the SBIIS2

2 Corinthians 3 in the SBIIS3

2 Corinthians 3 in the SBIKS

2 Corinthians 3 in the SBIKS2

2 Corinthians 3 in the SBIMS

2 Corinthians 3 in the SBIOS

2 Corinthians 3 in the SBIPS

2 Corinthians 3 in the SBISS

2 Corinthians 3 in the SBITS

2 Corinthians 3 in the SBITS2

2 Corinthians 3 in the SBITS3

2 Corinthians 3 in the SBITS4

2 Corinthians 3 in the SBIUS

2 Corinthians 3 in the SBIVS

2 Corinthians 3 in the SBT

2 Corinthians 3 in the SBT1E

2 Corinthians 3 in the SCHL

2 Corinthians 3 in the SNT

2 Corinthians 3 in the SUSU

2 Corinthians 3 in the SUSU2

2 Corinthians 3 in the SYNO

2 Corinthians 3 in the TBIAOTANT

2 Corinthians 3 in the TBT1E

2 Corinthians 3 in the TBT1E2

2 Corinthians 3 in the TFTIP

2 Corinthians 3 in the TFTU

2 Corinthians 3 in the TGNTATF3T

2 Corinthians 3 in the THAI

2 Corinthians 3 in the TNFD

2 Corinthians 3 in the TNT

2 Corinthians 3 in the TNTIK

2 Corinthians 3 in the TNTIL

2 Corinthians 3 in the TNTIN

2 Corinthians 3 in the TNTIP

2 Corinthians 3 in the TNTIZ

2 Corinthians 3 in the TOMA

2 Corinthians 3 in the TTENT

2 Corinthians 3 in the UBG

2 Corinthians 3 in the UGV

2 Corinthians 3 in the UGV2

2 Corinthians 3 in the UGV3

2 Corinthians 3 in the VBL

2 Corinthians 3 in the VDCC

2 Corinthians 3 in the YALU

2 Corinthians 3 in the YAPE

2 Corinthians 3 in the YBVTP

2 Corinthians 3 in the ZBP