2 Kings 15 (BOICB)

1 Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Jeroboam nʼIzrel ka Azaraya nwa Amazaya bidoro ịchị dịka eze na Juda. 2 Ọ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịkwara na Jerusalem iri afọ ise na abụọ. Aha nne ya bụ Jekolaya, onye Jerusalem. 3 O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ. 4 Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. 5 ONYENWE ANYỊ tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ. 6 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 7 Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 8 Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii. 9 Dịka ndị nna ya bu ya ụzọ si mee, Zekaraya mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. O mekwara dịka Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie ịkpọ isiala nye chi ọzọ. 10 Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ. 11 Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha. 12 Ya mere, okwu ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.” 13 Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria. 14 Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya. 15 Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị. 16 Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime. 17 Nʼafọ iri atọ na itoolu nke Azaraya, eze Juda, Menahem nwa Gadi ghọrọ eze ọhụrụ ndị Izrel. Ọ chịrị afọ iri dịka eze na Sameria. 18 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. Nʼoge ọchịchị ya, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o mere ka Izrel mehie. 19 Mgbe ahụ, Pul eze Asịrịa busoro ala ahụ agha. Menahem nyere ya otu puku talenti ọlaọcha, ime ka Pul kwagide ọchịchị ya, na ime ka aka ya siekwa ike nʼalaeze Izrel. 20 Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ. 21 Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha? 22 Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 23 Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria. 24 Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie. 25 Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 26 Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha. 27 Nʼafọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda ka Peka nwa Remalaya ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ. 28 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya. 29 Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa. 30 Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya. 31 Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha? 32 Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya. 33 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jerusha, nwa Zadọk. 34 O mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka nna ya Ụzaya mere. 35 Kama, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu, ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ dị iche iche na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 36 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile nke oge ọchịchị Jotam na ihe o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 37 (Nʼụbọchị ndị ahụ, ONYENWE ANYỊ malitere izite Rezin eze ndị Aram na Peka nwa Remalaya, imegide ndị Juda.) 38 Jotam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ obodo nna ya. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Kings 15 in the ANGEFD

2 Kings 15 in the ANTPNG2D

2 Kings 15 in the AS21

2 Kings 15 in the BAGH

2 Kings 15 in the BBPNG

2 Kings 15 in the BBT1E

2 Kings 15 in the BDS

2 Kings 15 in the BEV

2 Kings 15 in the BHAD

2 Kings 15 in the BIB

2 Kings 15 in the BLPT

2 Kings 15 in the BNT

2 Kings 15 in the BNTABOOT

2 Kings 15 in the BNTLV

2 Kings 15 in the BOATCB

2 Kings 15 in the BOATCB2

2 Kings 15 in the BOBCV

2 Kings 15 in the BOCNT

2 Kings 15 in the BOECS

2 Kings 15 in the BOGWICC

2 Kings 15 in the BOHCB

2 Kings 15 in the BOHCV

2 Kings 15 in the BOHLNT

2 Kings 15 in the BOHNTLTAL

2 Kings 15 in the BOILNTAP

2 Kings 15 in the BOITCV

2 Kings 15 in the BOKCV

2 Kings 15 in the BOKCV2

2 Kings 15 in the BOKHWOG

2 Kings 15 in the BOKSSV

2 Kings 15 in the BOLCB

2 Kings 15 in the BOLCB2

2 Kings 15 in the BOMCV

2 Kings 15 in the BONAV

2 Kings 15 in the BONCB

2 Kings 15 in the BONLT

2 Kings 15 in the BONUT2

2 Kings 15 in the BOPLNT

2 Kings 15 in the BOSCB

2 Kings 15 in the BOSNC

2 Kings 15 in the BOTLNT

2 Kings 15 in the BOVCB

2 Kings 15 in the BOYCB

2 Kings 15 in the BPBB

2 Kings 15 in the BPH

2 Kings 15 in the BSB

2 Kings 15 in the CCB

2 Kings 15 in the CUV

2 Kings 15 in the CUVS

2 Kings 15 in the DBT

2 Kings 15 in the DGDNT

2 Kings 15 in the DHNT

2 Kings 15 in the DNT

2 Kings 15 in the ELBE

2 Kings 15 in the EMTV

2 Kings 15 in the ESV

2 Kings 15 in the FBV

2 Kings 15 in the FEB

2 Kings 15 in the GGMNT

2 Kings 15 in the GNT

2 Kings 15 in the HARY

2 Kings 15 in the HNT

2 Kings 15 in the IRVA

2 Kings 15 in the IRVB

2 Kings 15 in the IRVG

2 Kings 15 in the IRVH

2 Kings 15 in the IRVK

2 Kings 15 in the IRVM

2 Kings 15 in the IRVM2

2 Kings 15 in the IRVO

2 Kings 15 in the IRVP

2 Kings 15 in the IRVT

2 Kings 15 in the IRVT2

2 Kings 15 in the IRVU

2 Kings 15 in the ISVN

2 Kings 15 in the JSNT

2 Kings 15 in the KAPI

2 Kings 15 in the KBT1ETNIK

2 Kings 15 in the KBV

2 Kings 15 in the KJV

2 Kings 15 in the KNFD

2 Kings 15 in the LBA

2 Kings 15 in the LBLA

2 Kings 15 in the LNT

2 Kings 15 in the LSV

2 Kings 15 in the MAAL

2 Kings 15 in the MBV

2 Kings 15 in the MBV2

2 Kings 15 in the MHNT

2 Kings 15 in the MKNFD

2 Kings 15 in the MNG

2 Kings 15 in the MNT

2 Kings 15 in the MNT2

2 Kings 15 in the MRS1T

2 Kings 15 in the NAA

2 Kings 15 in the NASB

2 Kings 15 in the NBLA

2 Kings 15 in the NBS

2 Kings 15 in the NBVTP

2 Kings 15 in the NET2

2 Kings 15 in the NIV11

2 Kings 15 in the NNT

2 Kings 15 in the NNT2

2 Kings 15 in the NNT3

2 Kings 15 in the PDDPT

2 Kings 15 in the PFNT

2 Kings 15 in the RMNT

2 Kings 15 in the SBIAS

2 Kings 15 in the SBIBS

2 Kings 15 in the SBIBS2

2 Kings 15 in the SBICS

2 Kings 15 in the SBIDS

2 Kings 15 in the SBIGS

2 Kings 15 in the SBIHS

2 Kings 15 in the SBIIS

2 Kings 15 in the SBIIS2

2 Kings 15 in the SBIIS3

2 Kings 15 in the SBIKS

2 Kings 15 in the SBIKS2

2 Kings 15 in the SBIMS

2 Kings 15 in the SBIOS

2 Kings 15 in the SBIPS

2 Kings 15 in the SBISS

2 Kings 15 in the SBITS

2 Kings 15 in the SBITS2

2 Kings 15 in the SBITS3

2 Kings 15 in the SBITS4

2 Kings 15 in the SBIUS

2 Kings 15 in the SBIVS

2 Kings 15 in the SBT

2 Kings 15 in the SBT1E

2 Kings 15 in the SCHL

2 Kings 15 in the SNT

2 Kings 15 in the SUSU

2 Kings 15 in the SUSU2

2 Kings 15 in the SYNO

2 Kings 15 in the TBIAOTANT

2 Kings 15 in the TBT1E

2 Kings 15 in the TBT1E2

2 Kings 15 in the TFTIP

2 Kings 15 in the TFTU

2 Kings 15 in the TGNTATF3T

2 Kings 15 in the THAI

2 Kings 15 in the TNFD

2 Kings 15 in the TNT

2 Kings 15 in the TNTIK

2 Kings 15 in the TNTIL

2 Kings 15 in the TNTIN

2 Kings 15 in the TNTIP

2 Kings 15 in the TNTIZ

2 Kings 15 in the TOMA

2 Kings 15 in the TTENT

2 Kings 15 in the UBG

2 Kings 15 in the UGV

2 Kings 15 in the UGV2

2 Kings 15 in the UGV3

2 Kings 15 in the VBL

2 Kings 15 in the VDCC

2 Kings 15 in the YALU

2 Kings 15 in the YAPE

2 Kings 15 in the YBVTP

2 Kings 15 in the ZBP