2 Kings 19 (BOICB)

1 Mgbe eze Hezekaya, nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 2 O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz. 3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya. 4 Ma eleghị anya ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.” 5 Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya, 6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m. 7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ” 8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha. 9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị, 10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’ 11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị? 12 Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden, ndị nọ na Tel Asa? 13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?” 14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, gbasaa ya nʼihu ONYENWE ANYỊ. 15 Hezekaya kpere ekpere nye ONYENWE ANYỊ, sị, “O, ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa. 16 Tọọ ntị gị nʼala, o ONYENWE ANYỊ ma nụrụ; meghee anya gị abụọ ONYENWE ANYỊ, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ. 17 “Nʼeziokwu, ONYENWE ANYỊ, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu. 18 Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa. 19 Ugbu a, ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị ONYENWE ANYỊ, naanị, bụ Chineke.” 20 Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa. 21 Nke a bụ okwu nke ONYENWE ANYỊ kwuru megide ya:“ ‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọnna-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị.Nwaada Jerusalemna-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ 22 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa?Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gịwelie olu okwu gị na anya gị elu megide?Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel? 23 I sitere nʼaka ndị ozi gịkparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,ị sịkwara,“Eji m ọtụtụ ụgbọala mrigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,na osisi junipa ya niile kachasị mma.Ejeruola m na nsọtụ niile ya,bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 24 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ.Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji meeka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.” 25 “ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị?Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya;ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,ghọọ mkpokọta nkume. 26 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwerebụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubina ome na-epupụta epupụtanakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọnke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 27 “ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụmarakwa ọpụpụ gị na mbata gịmarakwa oke iwe gị megide m. 28 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,aga m etinye nko m nʼimi gịwerekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gịmee ka ị laghachisite nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’ 29 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya:“Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta.Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi;kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 30 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Judaga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. 31 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta;otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a. 32 “Ya mere, nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru banyere eze Asịrịa, sị,“ ‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo amaọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a.Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya,maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. 33 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi;ọ gaghị abanye nʼobodo a.Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 34 Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa yanʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ” 35 Nʼabalị ahụ, mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile. 36 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive. 37 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Kings 19 in the ANGEFD

2 Kings 19 in the ANTPNG2D

2 Kings 19 in the AS21

2 Kings 19 in the BAGH

2 Kings 19 in the BBPNG

2 Kings 19 in the BBT1E

2 Kings 19 in the BDS

2 Kings 19 in the BEV

2 Kings 19 in the BHAD

2 Kings 19 in the BIB

2 Kings 19 in the BLPT

2 Kings 19 in the BNT

2 Kings 19 in the BNTABOOT

2 Kings 19 in the BNTLV

2 Kings 19 in the BOATCB

2 Kings 19 in the BOATCB2

2 Kings 19 in the BOBCV

2 Kings 19 in the BOCNT

2 Kings 19 in the BOECS

2 Kings 19 in the BOGWICC

2 Kings 19 in the BOHCB

2 Kings 19 in the BOHCV

2 Kings 19 in the BOHLNT

2 Kings 19 in the BOHNTLTAL

2 Kings 19 in the BOILNTAP

2 Kings 19 in the BOITCV

2 Kings 19 in the BOKCV

2 Kings 19 in the BOKCV2

2 Kings 19 in the BOKHWOG

2 Kings 19 in the BOKSSV

2 Kings 19 in the BOLCB

2 Kings 19 in the BOLCB2

2 Kings 19 in the BOMCV

2 Kings 19 in the BONAV

2 Kings 19 in the BONCB

2 Kings 19 in the BONLT

2 Kings 19 in the BONUT2

2 Kings 19 in the BOPLNT

2 Kings 19 in the BOSCB

2 Kings 19 in the BOSNC

2 Kings 19 in the BOTLNT

2 Kings 19 in the BOVCB

2 Kings 19 in the BOYCB

2 Kings 19 in the BPBB

2 Kings 19 in the BPH

2 Kings 19 in the BSB

2 Kings 19 in the CCB

2 Kings 19 in the CUV

2 Kings 19 in the CUVS

2 Kings 19 in the DBT

2 Kings 19 in the DGDNT

2 Kings 19 in the DHNT

2 Kings 19 in the DNT

2 Kings 19 in the ELBE

2 Kings 19 in the EMTV

2 Kings 19 in the ESV

2 Kings 19 in the FBV

2 Kings 19 in the FEB

2 Kings 19 in the GGMNT

2 Kings 19 in the GNT

2 Kings 19 in the HARY

2 Kings 19 in the HNT

2 Kings 19 in the IRVA

2 Kings 19 in the IRVB

2 Kings 19 in the IRVG

2 Kings 19 in the IRVH

2 Kings 19 in the IRVK

2 Kings 19 in the IRVM

2 Kings 19 in the IRVM2

2 Kings 19 in the IRVO

2 Kings 19 in the IRVP

2 Kings 19 in the IRVT

2 Kings 19 in the IRVT2

2 Kings 19 in the IRVU

2 Kings 19 in the ISVN

2 Kings 19 in the JSNT

2 Kings 19 in the KAPI

2 Kings 19 in the KBT1ETNIK

2 Kings 19 in the KBV

2 Kings 19 in the KJV

2 Kings 19 in the KNFD

2 Kings 19 in the LBA

2 Kings 19 in the LBLA

2 Kings 19 in the LNT

2 Kings 19 in the LSV

2 Kings 19 in the MAAL

2 Kings 19 in the MBV

2 Kings 19 in the MBV2

2 Kings 19 in the MHNT

2 Kings 19 in the MKNFD

2 Kings 19 in the MNG

2 Kings 19 in the MNT

2 Kings 19 in the MNT2

2 Kings 19 in the MRS1T

2 Kings 19 in the NAA

2 Kings 19 in the NASB

2 Kings 19 in the NBLA

2 Kings 19 in the NBS

2 Kings 19 in the NBVTP

2 Kings 19 in the NET2

2 Kings 19 in the NIV11

2 Kings 19 in the NNT

2 Kings 19 in the NNT2

2 Kings 19 in the NNT3

2 Kings 19 in the PDDPT

2 Kings 19 in the PFNT

2 Kings 19 in the RMNT

2 Kings 19 in the SBIAS

2 Kings 19 in the SBIBS

2 Kings 19 in the SBIBS2

2 Kings 19 in the SBICS

2 Kings 19 in the SBIDS

2 Kings 19 in the SBIGS

2 Kings 19 in the SBIHS

2 Kings 19 in the SBIIS

2 Kings 19 in the SBIIS2

2 Kings 19 in the SBIIS3

2 Kings 19 in the SBIKS

2 Kings 19 in the SBIKS2

2 Kings 19 in the SBIMS

2 Kings 19 in the SBIOS

2 Kings 19 in the SBIPS

2 Kings 19 in the SBISS

2 Kings 19 in the SBITS

2 Kings 19 in the SBITS2

2 Kings 19 in the SBITS3

2 Kings 19 in the SBITS4

2 Kings 19 in the SBIUS

2 Kings 19 in the SBIVS

2 Kings 19 in the SBT

2 Kings 19 in the SBT1E

2 Kings 19 in the SCHL

2 Kings 19 in the SNT

2 Kings 19 in the SUSU

2 Kings 19 in the SUSU2

2 Kings 19 in the SYNO

2 Kings 19 in the TBIAOTANT

2 Kings 19 in the TBT1E

2 Kings 19 in the TBT1E2

2 Kings 19 in the TFTIP

2 Kings 19 in the TFTU

2 Kings 19 in the TGNTATF3T

2 Kings 19 in the THAI

2 Kings 19 in the TNFD

2 Kings 19 in the TNT

2 Kings 19 in the TNTIK

2 Kings 19 in the TNTIL

2 Kings 19 in the TNTIN

2 Kings 19 in the TNTIP

2 Kings 19 in the TNTIZ

2 Kings 19 in the TOMA

2 Kings 19 in the TTENT

2 Kings 19 in the UBG

2 Kings 19 in the UGV

2 Kings 19 in the UGV2

2 Kings 19 in the UGV3

2 Kings 19 in the VBL

2 Kings 19 in the VDCC

2 Kings 19 in the YALU

2 Kings 19 in the YAPE

2 Kings 19 in the YBVTP

2 Kings 19 in the ZBP