2 Kings 22 (BOICB)

1 Afọ asatọ ka Josaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Iri afọ atọ na otu ka ọ chịrị na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jedida, nwa Adaya onye Bozkat. 2 O mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid kpamkpam, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 3 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị ya, eze Josaya, zigara ode akwụkwọ bụ Shefan nwa Azalaya, onye bụkwa nwa nwa Meshulam, ka ọ gaa nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Ọ sịrị ya, 4 “Gakwuru Hilkaya onyeisi nchụaja, sị ya, gụkọta ego nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, bụ nke ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị mmadụ. 5 Gwa ha ka ha nyefee ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ ahụ. Ka ndị ikom a kwụọ ndị ọrụ na-arụzi ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ụgwọ ọrụ, 6 ya bụ, inye ya ndị ọkpọ ǹtu, ndị na-ewu ụlọ, na ndị na-edo nkume ụlọ. Ha jirikwa ego ahụ zụta osisi na nkume a wara awa, maka i ji dozie ụlọnsọ ahụ. 7 Ọ dịghị mkpa ka ha gụzie otu ha si mefuo ego nke e nyefere ha nʼaka, nʼihi na ọrụ ha egosila na ha kwesiri ntụkwasị obi.” 8 Hilkaya onyeisi nchụaja, sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ.” O nyere ya Shefan, onye nke gụkwara ya. 9 Mgbe ahụ, Shefan, bụ ode akwụkwọ, bịakwutere eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nʼaka ndị ọrụ na nʼaka ndị nlekọta nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.” 10 Mgbe ahụ, Shefan bụ ode akwụkwọ, gwara eze sị, “O nwere akwụkwọ Hilkaya, onye nchụaja nyere m.” Shefan gụpụtara ihe dị nʼakwụkwọ a nʼihu eze. 11 Mgbe eze nụrụ okwu niile dị nʼime Akwụkwọ Iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya. 12 O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha, 13 “Gaanụ jụta ONYENWE ANYỊ ase, nʼisi m na nʼisi ndị m, na Juda niile, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a nke a chọtara. Nʼihi na ọnụma ONYENWE ANYỊ dị ukwuu bụ nke na-ere ọkụ megide anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ erubeghị isi nʼokwu nke akwụkwọ iwu a, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime ya banyere anyị.” 14 Hilkaya onye nchụaja, Ahikam, Akboa, Shefan na Asaya, jekwuuru Hulda, bụ onye amụma nwanyị. Onye bụ nwunye Shalum, nwa Tikva, nwa Hahas, ọ bụ onye na-elekọta uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ. 15 Ọ sịrị ha, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nke Izrel kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị, 16 ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, dịka ihe niile e dere nʼime akwụkwọ nke eze Juda gụrụ, si dị. 17 Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na arụsị niile nke aka ha mepụtara. Iwe m ga-adị ọkụ megide ebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’ 18 Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ ONYENWE ANYỊ sị ya, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ. 19 Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe m kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, na ha ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, na ihe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi na i dọwara uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m, mụ onwe m anụkwala, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 20 Ya mere, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a.’ ”Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.

In Other Versions

2 Kings 22 in the ANGEFD

2 Kings 22 in the ANTPNG2D

2 Kings 22 in the AS21

2 Kings 22 in the BAGH

2 Kings 22 in the BBPNG

2 Kings 22 in the BBT1E

2 Kings 22 in the BDS

2 Kings 22 in the BEV

2 Kings 22 in the BHAD

2 Kings 22 in the BIB

2 Kings 22 in the BLPT

2 Kings 22 in the BNT

2 Kings 22 in the BNTABOOT

2 Kings 22 in the BNTLV

2 Kings 22 in the BOATCB

2 Kings 22 in the BOATCB2

2 Kings 22 in the BOBCV

2 Kings 22 in the BOCNT

2 Kings 22 in the BOECS

2 Kings 22 in the BOGWICC

2 Kings 22 in the BOHCB

2 Kings 22 in the BOHCV

2 Kings 22 in the BOHLNT

2 Kings 22 in the BOHNTLTAL

2 Kings 22 in the BOILNTAP

2 Kings 22 in the BOITCV

2 Kings 22 in the BOKCV

2 Kings 22 in the BOKCV2

2 Kings 22 in the BOKHWOG

2 Kings 22 in the BOKSSV

2 Kings 22 in the BOLCB

2 Kings 22 in the BOLCB2

2 Kings 22 in the BOMCV

2 Kings 22 in the BONAV

2 Kings 22 in the BONCB

2 Kings 22 in the BONLT

2 Kings 22 in the BONUT2

2 Kings 22 in the BOPLNT

2 Kings 22 in the BOSCB

2 Kings 22 in the BOSNC

2 Kings 22 in the BOTLNT

2 Kings 22 in the BOVCB

2 Kings 22 in the BOYCB

2 Kings 22 in the BPBB

2 Kings 22 in the BPH

2 Kings 22 in the BSB

2 Kings 22 in the CCB

2 Kings 22 in the CUV

2 Kings 22 in the CUVS

2 Kings 22 in the DBT

2 Kings 22 in the DGDNT

2 Kings 22 in the DHNT

2 Kings 22 in the DNT

2 Kings 22 in the ELBE

2 Kings 22 in the EMTV

2 Kings 22 in the ESV

2 Kings 22 in the FBV

2 Kings 22 in the FEB

2 Kings 22 in the GGMNT

2 Kings 22 in the GNT

2 Kings 22 in the HARY

2 Kings 22 in the HNT

2 Kings 22 in the IRVA

2 Kings 22 in the IRVB

2 Kings 22 in the IRVG

2 Kings 22 in the IRVH

2 Kings 22 in the IRVK

2 Kings 22 in the IRVM

2 Kings 22 in the IRVM2

2 Kings 22 in the IRVO

2 Kings 22 in the IRVP

2 Kings 22 in the IRVT

2 Kings 22 in the IRVT2

2 Kings 22 in the IRVU

2 Kings 22 in the ISVN

2 Kings 22 in the JSNT

2 Kings 22 in the KAPI

2 Kings 22 in the KBT1ETNIK

2 Kings 22 in the KBV

2 Kings 22 in the KJV

2 Kings 22 in the KNFD

2 Kings 22 in the LBA

2 Kings 22 in the LBLA

2 Kings 22 in the LNT

2 Kings 22 in the LSV

2 Kings 22 in the MAAL

2 Kings 22 in the MBV

2 Kings 22 in the MBV2

2 Kings 22 in the MHNT

2 Kings 22 in the MKNFD

2 Kings 22 in the MNG

2 Kings 22 in the MNT

2 Kings 22 in the MNT2

2 Kings 22 in the MRS1T

2 Kings 22 in the NAA

2 Kings 22 in the NASB

2 Kings 22 in the NBLA

2 Kings 22 in the NBS

2 Kings 22 in the NBVTP

2 Kings 22 in the NET2

2 Kings 22 in the NIV11

2 Kings 22 in the NNT

2 Kings 22 in the NNT2

2 Kings 22 in the NNT3

2 Kings 22 in the PDDPT

2 Kings 22 in the PFNT

2 Kings 22 in the RMNT

2 Kings 22 in the SBIAS

2 Kings 22 in the SBIBS

2 Kings 22 in the SBIBS2

2 Kings 22 in the SBICS

2 Kings 22 in the SBIDS

2 Kings 22 in the SBIGS

2 Kings 22 in the SBIHS

2 Kings 22 in the SBIIS

2 Kings 22 in the SBIIS2

2 Kings 22 in the SBIIS3

2 Kings 22 in the SBIKS

2 Kings 22 in the SBIKS2

2 Kings 22 in the SBIMS

2 Kings 22 in the SBIOS

2 Kings 22 in the SBIPS

2 Kings 22 in the SBISS

2 Kings 22 in the SBITS

2 Kings 22 in the SBITS2

2 Kings 22 in the SBITS3

2 Kings 22 in the SBITS4

2 Kings 22 in the SBIUS

2 Kings 22 in the SBIVS

2 Kings 22 in the SBT

2 Kings 22 in the SBT1E

2 Kings 22 in the SCHL

2 Kings 22 in the SNT

2 Kings 22 in the SUSU

2 Kings 22 in the SUSU2

2 Kings 22 in the SYNO

2 Kings 22 in the TBIAOTANT

2 Kings 22 in the TBT1E

2 Kings 22 in the TBT1E2

2 Kings 22 in the TFTIP

2 Kings 22 in the TFTU

2 Kings 22 in the TGNTATF3T

2 Kings 22 in the THAI

2 Kings 22 in the TNFD

2 Kings 22 in the TNT

2 Kings 22 in the TNTIK

2 Kings 22 in the TNTIL

2 Kings 22 in the TNTIN

2 Kings 22 in the TNTIP

2 Kings 22 in the TNTIZ

2 Kings 22 in the TOMA

2 Kings 22 in the TTENT

2 Kings 22 in the UBG

2 Kings 22 in the UGV

2 Kings 22 in the UGV2

2 Kings 22 in the UGV3

2 Kings 22 in the VBL

2 Kings 22 in the VDCC

2 Kings 22 in the YALU

2 Kings 22 in the YAPE

2 Kings 22 in the YBVTP

2 Kings 22 in the ZBP