2 Samuel 10 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2 Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya.Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn, 3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?” 4 Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha. 5 Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.” 6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob. 7 Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha. 8 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. 9 Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram. 10 O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha. 11 Joab sịrị, “Ọ bụrụ na ndị agha Aram akarịa m ike, pụta bịa nyere m aka; ma ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn akarịa gị ike, aga m apụta bịa napụta gị. 12 Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị, na obodo niile nke Chineke anyị. Ka ONYENWE ANYỊ meekwa ihe dị mma nʼanya ya.” 13 Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ. 14 Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab sitere nʼịlụso ndị Amọn agha lọghachi, bịa na Jerusalem. 15 Mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha; ha lara, chịkọtaa onwe ha ọnụ. 16 Hadadeza mere ka a kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ha gara Hilam, ha na ọchịagha ndị agha Hadadeza, a na-akpọ Shobak, onye na-edu ha. 17 Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, gafee Jọdan, jeruo Hilam. Ndị Aram doro usoro agha ha izute Devid, lụsokwaa ya agha. 18 Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ. 19 Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha.Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.

In Other Versions

2 Samuel 10 in the ANGEFD

2 Samuel 10 in the ANTPNG2D

2 Samuel 10 in the AS21

2 Samuel 10 in the BAGH

2 Samuel 10 in the BBPNG

2 Samuel 10 in the BBT1E

2 Samuel 10 in the BDS

2 Samuel 10 in the BEV

2 Samuel 10 in the BHAD

2 Samuel 10 in the BIB

2 Samuel 10 in the BLPT

2 Samuel 10 in the BNT

2 Samuel 10 in the BNTABOOT

2 Samuel 10 in the BNTLV

2 Samuel 10 in the BOATCB

2 Samuel 10 in the BOATCB2

2 Samuel 10 in the BOBCV

2 Samuel 10 in the BOCNT

2 Samuel 10 in the BOECS

2 Samuel 10 in the BOGWICC

2 Samuel 10 in the BOHCB

2 Samuel 10 in the BOHCV

2 Samuel 10 in the BOHLNT

2 Samuel 10 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 10 in the BOILNTAP

2 Samuel 10 in the BOITCV

2 Samuel 10 in the BOKCV

2 Samuel 10 in the BOKCV2

2 Samuel 10 in the BOKHWOG

2 Samuel 10 in the BOKSSV

2 Samuel 10 in the BOLCB

2 Samuel 10 in the BOLCB2

2 Samuel 10 in the BOMCV

2 Samuel 10 in the BONAV

2 Samuel 10 in the BONCB

2 Samuel 10 in the BONLT

2 Samuel 10 in the BONUT2

2 Samuel 10 in the BOPLNT

2 Samuel 10 in the BOSCB

2 Samuel 10 in the BOSNC

2 Samuel 10 in the BOTLNT

2 Samuel 10 in the BOVCB

2 Samuel 10 in the BOYCB

2 Samuel 10 in the BPBB

2 Samuel 10 in the BPH

2 Samuel 10 in the BSB

2 Samuel 10 in the CCB

2 Samuel 10 in the CUV

2 Samuel 10 in the CUVS

2 Samuel 10 in the DBT

2 Samuel 10 in the DGDNT

2 Samuel 10 in the DHNT

2 Samuel 10 in the DNT

2 Samuel 10 in the ELBE

2 Samuel 10 in the EMTV

2 Samuel 10 in the ESV

2 Samuel 10 in the FBV

2 Samuel 10 in the FEB

2 Samuel 10 in the GGMNT

2 Samuel 10 in the GNT

2 Samuel 10 in the HARY

2 Samuel 10 in the HNT

2 Samuel 10 in the IRVA

2 Samuel 10 in the IRVB

2 Samuel 10 in the IRVG

2 Samuel 10 in the IRVH

2 Samuel 10 in the IRVK

2 Samuel 10 in the IRVM

2 Samuel 10 in the IRVM2

2 Samuel 10 in the IRVO

2 Samuel 10 in the IRVP

2 Samuel 10 in the IRVT

2 Samuel 10 in the IRVT2

2 Samuel 10 in the IRVU

2 Samuel 10 in the ISVN

2 Samuel 10 in the JSNT

2 Samuel 10 in the KAPI

2 Samuel 10 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 10 in the KBV

2 Samuel 10 in the KJV

2 Samuel 10 in the KNFD

2 Samuel 10 in the LBA

2 Samuel 10 in the LBLA

2 Samuel 10 in the LNT

2 Samuel 10 in the LSV

2 Samuel 10 in the MAAL

2 Samuel 10 in the MBV

2 Samuel 10 in the MBV2

2 Samuel 10 in the MHNT

2 Samuel 10 in the MKNFD

2 Samuel 10 in the MNG

2 Samuel 10 in the MNT

2 Samuel 10 in the MNT2

2 Samuel 10 in the MRS1T

2 Samuel 10 in the NAA

2 Samuel 10 in the NASB

2 Samuel 10 in the NBLA

2 Samuel 10 in the NBS

2 Samuel 10 in the NBVTP

2 Samuel 10 in the NET2

2 Samuel 10 in the NIV11

2 Samuel 10 in the NNT

2 Samuel 10 in the NNT2

2 Samuel 10 in the NNT3

2 Samuel 10 in the PDDPT

2 Samuel 10 in the PFNT

2 Samuel 10 in the RMNT

2 Samuel 10 in the SBIAS

2 Samuel 10 in the SBIBS

2 Samuel 10 in the SBIBS2

2 Samuel 10 in the SBICS

2 Samuel 10 in the SBIDS

2 Samuel 10 in the SBIGS

2 Samuel 10 in the SBIHS

2 Samuel 10 in the SBIIS

2 Samuel 10 in the SBIIS2

2 Samuel 10 in the SBIIS3

2 Samuel 10 in the SBIKS

2 Samuel 10 in the SBIKS2

2 Samuel 10 in the SBIMS

2 Samuel 10 in the SBIOS

2 Samuel 10 in the SBIPS

2 Samuel 10 in the SBISS

2 Samuel 10 in the SBITS

2 Samuel 10 in the SBITS2

2 Samuel 10 in the SBITS3

2 Samuel 10 in the SBITS4

2 Samuel 10 in the SBIUS

2 Samuel 10 in the SBIVS

2 Samuel 10 in the SBT

2 Samuel 10 in the SBT1E

2 Samuel 10 in the SCHL

2 Samuel 10 in the SNT

2 Samuel 10 in the SUSU

2 Samuel 10 in the SUSU2

2 Samuel 10 in the SYNO

2 Samuel 10 in the TBIAOTANT

2 Samuel 10 in the TBT1E

2 Samuel 10 in the TBT1E2

2 Samuel 10 in the TFTIP

2 Samuel 10 in the TFTU

2 Samuel 10 in the TGNTATF3T

2 Samuel 10 in the THAI

2 Samuel 10 in the TNFD

2 Samuel 10 in the TNT

2 Samuel 10 in the TNTIK

2 Samuel 10 in the TNTIL

2 Samuel 10 in the TNTIN

2 Samuel 10 in the TNTIP

2 Samuel 10 in the TNTIZ

2 Samuel 10 in the TOMA

2 Samuel 10 in the TTENT

2 Samuel 10 in the UBG

2 Samuel 10 in the UGV

2 Samuel 10 in the UGV2

2 Samuel 10 in the UGV3

2 Samuel 10 in the VBL

2 Samuel 10 in the VDCC

2 Samuel 10 in the YALU

2 Samuel 10 in the YAPE

2 Samuel 10 in the YBVTP

2 Samuel 10 in the ZBP