2 Samuel 19 (BOICB)

1 Ọ dịghị anya ozi ruru Joab ntị sị, “Lee, eze na-akwa akwa, na-eru ụjụ nʼihi Absalọm.” 2 Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ. 3 Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha. 4 Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!” 5 Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ. 6 Ị hụrụ ndị iro gị nʼanya, ma na-akpọ ndị hụrụ gị nʼanya asị. I meela ya ka ọ pụta ìhè taa na o nweghị ihe ndị ọchịagha gị na ndị agha gị bụ nʼanya gị. Ahụrụ m na ọ gaara abụ ihe ziri ezi nʼanya gị ma a sịkwarị na Absalọm dị ndụ taa, ma anyị niile anwụọ. 7 Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha ONYENWE ANYỊ na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.” 8 Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya.Ma nʼoge a, ndị Izrel niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya. 9 Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.” 10 Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị? 11 Eze Devid zigaara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye Juda sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala Izrel niile eruola eze ntị nʼebe o bi? 12 Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’ 13 Gwakwanụ Amasa sị ya, ‘Ọ bụ na ị bụghị ọkpụkpụ m na anụ ahụ m? Ka Chineke mesoo m mmeso otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na ị bụghị ọchịagha m malite taa nʼọnọdụ Joab.’ ” 14 Amasa mere ka obi ndị okenye Juda rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.” 15 Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan.Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan. 16 Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid. 17 Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ. 18 Ha gabigara mmiri nʼebe ọ dị nta ịkwọfe ndị ụlọeze nʼụgbọ mmiri, na ime ihe ọbụla dị mma nʼanya ya.Mgbe Shimei nwa Gera gafere Jọdan, ọ dara nʼala nʼihu eze, 19 sị ya, “Ka Onyenwe m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ Jerusalem pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya, 20 nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ Josef, ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.” 21 Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ bụ eze.” 22 Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?” 23 Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.” 24 Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo. 25 Mgbe o si Jerusalem pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?” 26 Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m Ziba ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m. 27 O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi Chineke, nʼihi ya mee m ihe masịrị gị. 28 Nʼagbanyeghị na ụlọ nna m niile dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe onyenwe m bụ eze nọ, ma i nyere ohu gị ọnọdụ nʼetiti ndị na-eri nri nʼelu tebul gị. Gịnị bụ ikike ọzọ m nwere iji rịọọ eze arịrịọ?” 29 Eze sịrị ya, “Nʼihi gịnị ka ị ka na-ekwuru okwu? Enyela m gị na Ziba iwu ka unu kee ala ahụ nʼetiti onwe unu.” 30 Mefiboshet sịrị eze, “Ka o were ihe niile ebe onyenwe m bụ eze lọghachiri nʼụlọ ya nʼudo.” 31 Bazilai onye Gilead sikwa na Rogelim bịa iso eze kwọfee osimiri Jọdan, na izilaga ya site nʼebe ahụ. 32 Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na Mahanaim, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. 33 Eze gwara Bazilai sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na Jerusalem. Aga m elekọtakwa gị.” 34 Ma Bazilai zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa Jerusalem? 35 Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze? 36 Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọdan, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche. 37 Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.” 38 Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.” 39 Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya. 40 Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga. 41 Ọ dịghị anya, ndị ikom Izrel niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom Juda, jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọdan?” 42 Ma ndị ikom Juda zara ndị ikom Izrel, “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?” 43 Ma ndị ikom Izrel zara sị, “Anyị dị ebo iri nʼIzrel, nʼihi ya, anyị nwere oke iri nʼime Devid karịa unu. Gịnị mere unu ji lelịa anyị anya? Chetakwanụ na ọ bụ anyị bu ụzọ kwuo okwu maka nlọta ya ịbụ eze anyị ọzọ.”Ma ndị ikom Juda ejighị olu ọma nye ndị Izrel ọsịsa.

In Other Versions

2 Samuel 19 in the ANGEFD

2 Samuel 19 in the ANTPNG2D

2 Samuel 19 in the AS21

2 Samuel 19 in the BAGH

2 Samuel 19 in the BBPNG

2 Samuel 19 in the BBT1E

2 Samuel 19 in the BDS

2 Samuel 19 in the BEV

2 Samuel 19 in the BHAD

2 Samuel 19 in the BIB

2 Samuel 19 in the BLPT

2 Samuel 19 in the BNT

2 Samuel 19 in the BNTABOOT

2 Samuel 19 in the BNTLV

2 Samuel 19 in the BOATCB

2 Samuel 19 in the BOATCB2

2 Samuel 19 in the BOBCV

2 Samuel 19 in the BOCNT

2 Samuel 19 in the BOECS

2 Samuel 19 in the BOGWICC

2 Samuel 19 in the BOHCB

2 Samuel 19 in the BOHCV

2 Samuel 19 in the BOHLNT

2 Samuel 19 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 19 in the BOILNTAP

2 Samuel 19 in the BOITCV

2 Samuel 19 in the BOKCV

2 Samuel 19 in the BOKCV2

2 Samuel 19 in the BOKHWOG

2 Samuel 19 in the BOKSSV

2 Samuel 19 in the BOLCB

2 Samuel 19 in the BOLCB2

2 Samuel 19 in the BOMCV

2 Samuel 19 in the BONAV

2 Samuel 19 in the BONCB

2 Samuel 19 in the BONLT

2 Samuel 19 in the BONUT2

2 Samuel 19 in the BOPLNT

2 Samuel 19 in the BOSCB

2 Samuel 19 in the BOSNC

2 Samuel 19 in the BOTLNT

2 Samuel 19 in the BOVCB

2 Samuel 19 in the BOYCB

2 Samuel 19 in the BPBB

2 Samuel 19 in the BPH

2 Samuel 19 in the BSB

2 Samuel 19 in the CCB

2 Samuel 19 in the CUV

2 Samuel 19 in the CUVS

2 Samuel 19 in the DBT

2 Samuel 19 in the DGDNT

2 Samuel 19 in the DHNT

2 Samuel 19 in the DNT

2 Samuel 19 in the ELBE

2 Samuel 19 in the EMTV

2 Samuel 19 in the ESV

2 Samuel 19 in the FBV

2 Samuel 19 in the FEB

2 Samuel 19 in the GGMNT

2 Samuel 19 in the GNT

2 Samuel 19 in the HARY

2 Samuel 19 in the HNT

2 Samuel 19 in the IRVA

2 Samuel 19 in the IRVB

2 Samuel 19 in the IRVG

2 Samuel 19 in the IRVH

2 Samuel 19 in the IRVK

2 Samuel 19 in the IRVM

2 Samuel 19 in the IRVM2

2 Samuel 19 in the IRVO

2 Samuel 19 in the IRVP

2 Samuel 19 in the IRVT

2 Samuel 19 in the IRVT2

2 Samuel 19 in the IRVU

2 Samuel 19 in the ISVN

2 Samuel 19 in the JSNT

2 Samuel 19 in the KAPI

2 Samuel 19 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 19 in the KBV

2 Samuel 19 in the KJV

2 Samuel 19 in the KNFD

2 Samuel 19 in the LBA

2 Samuel 19 in the LBLA

2 Samuel 19 in the LNT

2 Samuel 19 in the LSV

2 Samuel 19 in the MAAL

2 Samuel 19 in the MBV

2 Samuel 19 in the MBV2

2 Samuel 19 in the MHNT

2 Samuel 19 in the MKNFD

2 Samuel 19 in the MNG

2 Samuel 19 in the MNT

2 Samuel 19 in the MNT2

2 Samuel 19 in the MRS1T

2 Samuel 19 in the NAA

2 Samuel 19 in the NASB

2 Samuel 19 in the NBLA

2 Samuel 19 in the NBS

2 Samuel 19 in the NBVTP

2 Samuel 19 in the NET2

2 Samuel 19 in the NIV11

2 Samuel 19 in the NNT

2 Samuel 19 in the NNT2

2 Samuel 19 in the NNT3

2 Samuel 19 in the PDDPT

2 Samuel 19 in the PFNT

2 Samuel 19 in the RMNT

2 Samuel 19 in the SBIAS

2 Samuel 19 in the SBIBS

2 Samuel 19 in the SBIBS2

2 Samuel 19 in the SBICS

2 Samuel 19 in the SBIDS

2 Samuel 19 in the SBIGS

2 Samuel 19 in the SBIHS

2 Samuel 19 in the SBIIS

2 Samuel 19 in the SBIIS2

2 Samuel 19 in the SBIIS3

2 Samuel 19 in the SBIKS

2 Samuel 19 in the SBIKS2

2 Samuel 19 in the SBIMS

2 Samuel 19 in the SBIOS

2 Samuel 19 in the SBIPS

2 Samuel 19 in the SBISS

2 Samuel 19 in the SBITS

2 Samuel 19 in the SBITS2

2 Samuel 19 in the SBITS3

2 Samuel 19 in the SBITS4

2 Samuel 19 in the SBIUS

2 Samuel 19 in the SBIVS

2 Samuel 19 in the SBT

2 Samuel 19 in the SBT1E

2 Samuel 19 in the SCHL

2 Samuel 19 in the SNT

2 Samuel 19 in the SUSU

2 Samuel 19 in the SUSU2

2 Samuel 19 in the SYNO

2 Samuel 19 in the TBIAOTANT

2 Samuel 19 in the TBT1E

2 Samuel 19 in the TBT1E2

2 Samuel 19 in the TFTIP

2 Samuel 19 in the TFTU

2 Samuel 19 in the TGNTATF3T

2 Samuel 19 in the THAI

2 Samuel 19 in the TNFD

2 Samuel 19 in the TNT

2 Samuel 19 in the TNTIK

2 Samuel 19 in the TNTIL

2 Samuel 19 in the TNTIN

2 Samuel 19 in the TNTIP

2 Samuel 19 in the TNTIZ

2 Samuel 19 in the TOMA

2 Samuel 19 in the TTENT

2 Samuel 19 in the UBG

2 Samuel 19 in the UGV

2 Samuel 19 in the UGV2

2 Samuel 19 in the UGV3

2 Samuel 19 in the VBL

2 Samuel 19 in the VDCC

2 Samuel 19 in the YALU

2 Samuel 19 in the YAPE

2 Samuel 19 in the YBVTP

2 Samuel 19 in the ZBP