2 Samuel 22 (BOICB)

1 Devid buuru ONYENWE ANYỊ okwu niile nke abụ a mgbe ONYENWE ANYỊ napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. 2 Ọ sịrị:“ONYENWE ANYỊ bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. 3 Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m.Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m,site nʼaka ndị na-eme ihe ike. 4 “Akpọkuru m ONYENWE ANYỊ; onye e kwesiri inye otuto.Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 5 Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. 6 Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 7 “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYỊ,akpọkuru m Chineke m.Akwa m ruru ya ntị.O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 8 Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,ntọala eluigwe makwara jijiji,ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 9 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta.Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 10 O kewara mbara eluigwe, rịdata;oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 11 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,O feliri elu nʼelu nku nke ifufe. 12 O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. 13 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ. 14 ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe bigbọọ.Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. 15 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. 16 E kpughere ala ala nke oke osimiri.Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,site nʼịba mba nke ONYENWE ANYỊ,na nkuume si nʼimi ya pụta. 17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya,jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. 18 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. 19 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.Ma ONYENWE ANYỊ bụrụ m ihe ndabere. 20 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. 21 “ONYENWE ANYỊ mesoro m dịka ezi omume m si dị,Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. 22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke ONYENWE ANYỊ;ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. 23 Iwu ya niile dị nʼihu m,esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m. 24 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,edebekwara m onwe m pụọ na mmehie. 25 ONYENWE ANYỊ kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya. 26 “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. 27 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. 28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala. 29 Ọ bụ gị, ONYENWE ANYỊ, bụ oriọna m, ONYENWE ANYỊ na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 30 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 31 “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;okwu ọnụ ONYENWE ANYỊ bụ ihe a nụchara anụcha.Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 32 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYỊ?Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke? 33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike,na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 34 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne eleỌ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. 35 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. 36 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu. 37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ. 38 “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi. 39 Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ. 40 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. 41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.Ebibiekwala m ha niile. 42 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.Ha kpọkuru ONYENWE ANYỊ, ma ọ zaghị ha. 43 Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ. 44 “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba.Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. 45 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m. 46 Obi na-ada ha mba.Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta. 47 “ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m. 48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m. 49 Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.I mere ka m dị elu karịa ndị iro m.Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. 50 Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.Aga m abụku aha gị abụ otuto. 51 “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere.Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”

In Other Versions

2 Samuel 22 in the ANGEFD

2 Samuel 22 in the ANTPNG2D

2 Samuel 22 in the AS21

2 Samuel 22 in the BAGH

2 Samuel 22 in the BBPNG

2 Samuel 22 in the BBT1E

2 Samuel 22 in the BDS

2 Samuel 22 in the BEV

2 Samuel 22 in the BHAD

2 Samuel 22 in the BIB

2 Samuel 22 in the BLPT

2 Samuel 22 in the BNT

2 Samuel 22 in the BNTABOOT

2 Samuel 22 in the BNTLV

2 Samuel 22 in the BOATCB

2 Samuel 22 in the BOATCB2

2 Samuel 22 in the BOBCV

2 Samuel 22 in the BOCNT

2 Samuel 22 in the BOECS

2 Samuel 22 in the BOGWICC

2 Samuel 22 in the BOHCB

2 Samuel 22 in the BOHCV

2 Samuel 22 in the BOHLNT

2 Samuel 22 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 22 in the BOILNTAP

2 Samuel 22 in the BOITCV

2 Samuel 22 in the BOKCV

2 Samuel 22 in the BOKCV2

2 Samuel 22 in the BOKHWOG

2 Samuel 22 in the BOKSSV

2 Samuel 22 in the BOLCB

2 Samuel 22 in the BOLCB2

2 Samuel 22 in the BOMCV

2 Samuel 22 in the BONAV

2 Samuel 22 in the BONCB

2 Samuel 22 in the BONLT

2 Samuel 22 in the BONUT2

2 Samuel 22 in the BOPLNT

2 Samuel 22 in the BOSCB

2 Samuel 22 in the BOSNC

2 Samuel 22 in the BOTLNT

2 Samuel 22 in the BOVCB

2 Samuel 22 in the BOYCB

2 Samuel 22 in the BPBB

2 Samuel 22 in the BPH

2 Samuel 22 in the BSB

2 Samuel 22 in the CCB

2 Samuel 22 in the CUV

2 Samuel 22 in the CUVS

2 Samuel 22 in the DBT

2 Samuel 22 in the DGDNT

2 Samuel 22 in the DHNT

2 Samuel 22 in the DNT

2 Samuel 22 in the ELBE

2 Samuel 22 in the EMTV

2 Samuel 22 in the ESV

2 Samuel 22 in the FBV

2 Samuel 22 in the FEB

2 Samuel 22 in the GGMNT

2 Samuel 22 in the GNT

2 Samuel 22 in the HARY

2 Samuel 22 in the HNT

2 Samuel 22 in the IRVA

2 Samuel 22 in the IRVB

2 Samuel 22 in the IRVG

2 Samuel 22 in the IRVH

2 Samuel 22 in the IRVK

2 Samuel 22 in the IRVM

2 Samuel 22 in the IRVM2

2 Samuel 22 in the IRVO

2 Samuel 22 in the IRVP

2 Samuel 22 in the IRVT

2 Samuel 22 in the IRVT2

2 Samuel 22 in the IRVU

2 Samuel 22 in the ISVN

2 Samuel 22 in the JSNT

2 Samuel 22 in the KAPI

2 Samuel 22 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 22 in the KBV

2 Samuel 22 in the KJV

2 Samuel 22 in the KNFD

2 Samuel 22 in the LBA

2 Samuel 22 in the LBLA

2 Samuel 22 in the LNT

2 Samuel 22 in the LSV

2 Samuel 22 in the MAAL

2 Samuel 22 in the MBV

2 Samuel 22 in the MBV2

2 Samuel 22 in the MHNT

2 Samuel 22 in the MKNFD

2 Samuel 22 in the MNG

2 Samuel 22 in the MNT

2 Samuel 22 in the MNT2

2 Samuel 22 in the MRS1T

2 Samuel 22 in the NAA

2 Samuel 22 in the NASB

2 Samuel 22 in the NBLA

2 Samuel 22 in the NBS

2 Samuel 22 in the NBVTP

2 Samuel 22 in the NET2

2 Samuel 22 in the NIV11

2 Samuel 22 in the NNT

2 Samuel 22 in the NNT2

2 Samuel 22 in the NNT3

2 Samuel 22 in the PDDPT

2 Samuel 22 in the PFNT

2 Samuel 22 in the RMNT

2 Samuel 22 in the SBIAS

2 Samuel 22 in the SBIBS

2 Samuel 22 in the SBIBS2

2 Samuel 22 in the SBICS

2 Samuel 22 in the SBIDS

2 Samuel 22 in the SBIGS

2 Samuel 22 in the SBIHS

2 Samuel 22 in the SBIIS

2 Samuel 22 in the SBIIS2

2 Samuel 22 in the SBIIS3

2 Samuel 22 in the SBIKS

2 Samuel 22 in the SBIKS2

2 Samuel 22 in the SBIMS

2 Samuel 22 in the SBIOS

2 Samuel 22 in the SBIPS

2 Samuel 22 in the SBISS

2 Samuel 22 in the SBITS

2 Samuel 22 in the SBITS2

2 Samuel 22 in the SBITS3

2 Samuel 22 in the SBITS4

2 Samuel 22 in the SBIUS

2 Samuel 22 in the SBIVS

2 Samuel 22 in the SBT

2 Samuel 22 in the SBT1E

2 Samuel 22 in the SCHL

2 Samuel 22 in the SNT

2 Samuel 22 in the SUSU

2 Samuel 22 in the SUSU2

2 Samuel 22 in the SYNO

2 Samuel 22 in the TBIAOTANT

2 Samuel 22 in the TBT1E

2 Samuel 22 in the TBT1E2

2 Samuel 22 in the TFTIP

2 Samuel 22 in the TFTU

2 Samuel 22 in the TGNTATF3T

2 Samuel 22 in the THAI

2 Samuel 22 in the TNFD

2 Samuel 22 in the TNT

2 Samuel 22 in the TNTIK

2 Samuel 22 in the TNTIL

2 Samuel 22 in the TNTIN

2 Samuel 22 in the TNTIP

2 Samuel 22 in the TNTIZ

2 Samuel 22 in the TOMA

2 Samuel 22 in the TTENT

2 Samuel 22 in the UBG

2 Samuel 22 in the UGV

2 Samuel 22 in the UGV2

2 Samuel 22 in the UGV3

2 Samuel 22 in the VBL

2 Samuel 22 in the VDCC

2 Samuel 22 in the YALU

2 Samuel 22 in the YAPE

2 Samuel 22 in the YBVTP

2 Samuel 22 in the ZBP